Igbo Readings for September 27, 2020, Ụka Nke Iri Abụọ na Isii N’oge Nkiti

Igbo Mass Readings for September 27, 2020, Ụka Nke Iri Abụọ na Isii N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Afọ nke Mbụ

Igbo Readings for September 27, 2020, Ụka Nke Iri Abụọ na Isii N’oge Nkiti
Igbo Mass Readings for Ụka Nke Iri Abụọ na Isii N’oge Nkiti- Afọ nke Mbụ

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ 18:25-28

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye Amụma Izikel

Isi Okwu: Ọ bụrụ na onye njọ ewepụ aka na njọ, n’ezie ọ ga-ebi.

Okwu Onyenweanyị ruru m nti sị m: “Ụnụ na-ekwu, ụzọ Onyenweanyị ezighi ezi.” Ụlọ Izrel, biko geenụ ntị: Ọ bụ ụzọ M bụ nke na-ezighi ezi?

Ọ bụ na ọ bụghị ụzọ ụnụ bụ nke na-ezighi ezi? Mgbe onye ezi omume siri n’ezi omume chigharịa, malite ime mmehie, ọnwụ gbuo ya, ọbụ n’ihi ajọ omume o metara ka o jiri nwụọ.

Ma onye ajọ omume si n’ajọ omume chigharịa, malite ime ezi omume, ọ ga-echedo ndụ ya.

N’ihina ọ tụleela n’obi ya, kpebiekwa ịhapụ mmehie  ya niile, ma malite ibi ndụ ziri ezi. Ndụ ga-abụ nke ya. Ọ gaghị anwụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA:       Ps. 24:4-9. Az.6

Azịza: Onyenweanyị, chetanụ ebere Gị

1.Onyenweanyị mee  ka m mata ụzọ Gị. Kụziere m okporo ụzọ Gị. Duziwe m n’ezi okwu Gị, na-agbazikwara m. Azịza

2.Onyenweanyị, cheta na obi ebere na obi ọma Gị na-adị sitere na mgbe ochie. E chetakwala njọ m mere na okorobịa n’adịghị ike m. Onyenweanyị cheta m n’obi ọma Gị, n’ihi na Ị dị mma. Azịza.

3. Onyenweanyị dị mma bụrụkwa onye ezi omume. Otu a ka O si egosi ndị njọ ụzọ. Ọ na-eduba onye umeala n’ezi omume, bịakwa na-akuziri ndị umeala ụzọ Ya. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ     2:1-11 ma ọ bụ  2:1-5

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara Ndị Filipịa

Isi Okwu: Echiche ụnụ ga-adị ka nke Kristi.

A sị ụnụ ji ndụ anyị di n’ime Kristi kpọrọ ihe! A sị ịhụnaya nwere ike ịkpalite ụnụ ka ụnụ mee ihe ọ bụla ma ọ bụ Mmụọ Nsọ ahụ anyị nwekọtara ọnụ!

A sị ọ bụ inwe obi ebere ma ọ bụ obi ọma ka ụnụ jiri kpọrọ ihe, jikọtanụ ọnụ n’inwe otu obi na ịnwe ịhụnanya.

Werenụ otu uche gbawa mbọ ịnweta otu ihe ahụ anyị na-achọ. Ihe a bụ sọ otu ihe ga-eme ka m jupụta n’añụrị.

Onye emekwala ka e too nanị ya. Onye aghọkwala aghụghọ. Kama onye ọ bụla ga na-achọ ihe ga-abara ibe ya uru.

Were ya, na nke onye nke ọzọ ka nke gị mkpa; ka a ghara ịnwe onye bụ ụzọ na-achọ nke onwe ya, nke onwe ya.

Kama ka onye ọ bụla chewe maka ọdịmma ndị ọzọ. Uche ụnụ kwesịrị ịdị ka nke Kristi Jesu. Onye dị ezie n’ụdị Chineke.

Ma O kwedosighị aka ike n’ịha n’otu nke Ya na Chineke. Kama, O mere onwe ka onye na-abụghị ihe ọ bụla, O werela ọnọdụ ohu.

Ọ bịa dị ka mmadụ. Ọ bụghị sọ na Ọ bịara dị ka mmadụ, kama O wedara onwe Ya n’ala, wee rubegide isi ruo n’ọnwụ – bụ ọnwụ nke obe.

Ma Chineke buliri Ya oke elu, bịakwa nye Ya aha kacha aha niile; ka o wee bụrụ na a kpọọ aha Jesu, ihe niile ga-egbu ikpere n’ala – ma ihe niile dị n’eluigwe, ma ihe niile dị n’elu ụwa, ma ihe niile dị n’okpuru ụwa.

A kpọọ aha Jesu, ire niile ga-ekwupụtakwa na Jesu Kristi bụ Onyenweanyị, maka otito na ebube nke Chineke Nna.

ALLELUỊA             Jọn 6, 63.68

Alleluịa, Alleluịa:

Onyenweanyị, okwu Gị bụ mmụọ na ndụ. Ọ bụ Gị ji ozi nke ndụ ebighị ebi.

Alleluịa.

Oziọma maka September 27, 2020 – Matiu 21:28-32

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Ndị ọnakọ-ụtụ na ụmụnwaanyị akwụna ga-ebu ụnụ ụzọ abanye n’alaeze Chineke.

Jesu jụrụ ndị isi nchụaja na ndị okenye sị: “Gịnị ka ụnụ chere? Otu nwoke nwere ụmụ abụọ.

O jekwuru nke diọkpara sị ya: ‘Nwa m, jee ọrụ n’ubi m taa.’ Ma ọ  zara sị: ‘Agaghị m eje.’ Ma o mesiri chegharịa, jee ọrụ n’ubi nna ya.

Nwoke ahụ jekwukwara nwa ya nke abụọ, ziekwa ya otu ozi ahụ. Nwa ya zara ya: ‘Nna m, aga m emerịrị ya.’

Ma o jeghị. N’ime ụmụ abụọ ndị a, olee nke mere ihe nna ya chọrọ?” Ha zara sị: “Ọ bụ nke mbụ.”

Jesu wee sị ha: “N’ịgwa ụnụ eziokwu, ndị ọnakọ-ụtụ na ụmụnwaanyị akwụna ga-ebu ụnụ ụzọ abanye n’Alaeze Chineke.

N’ihina mgbe Jọn Ome Mmirichukwu  jiri ịkwụba aka ọtọ bịakwute ụnụ, ụnụ ekweghị n’ihe o kwuru.

Ma ndị ọnakọ-ụtụ na ụmụnwaanyị akwụna kweere nay a. Ọ bụna mgbe ụnụ hụrụ nke a, ụnụ emesighi chegharịa, kwere na ya.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: September 26, 2020, Satọdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise

IHE ỌGỤGỤ ECHI:  September 28, 2020, Mọndee Izu Nke Iri Abụọ na Isii

Igbo Catholic Readings for September 27, 2020, Ụka Nke Iri Abụọ na Isii N’oge Na-Adanyeghi N’emume.

Sonyere anyị na Facebook na Catholic Igbo Lectionary

error: Alert: Content is protected !!