Igbo Readings for September 21, 2020, Ncheta Matiu Dị Asọ, Onye Apostụl

Igbo Mass Readings for September 21, 2020, Ncheta Matiu Dị Asọ, Onye Apostụl

Nke a bu Igbo Mass Readings maka September 21, 2020, Ncheta Matiu Dị Asọ, Onye Apostụl nke ndị Catholic Lectionary wetara ụnụ.

Bible Quotations for Igbo readings for September 21, Igbo Readings maka Emume Ncheta Matiu Dị Asọ, Onye Apostụl
Igbo Readings maka Emume Ncheta Matiu Dị Asọ, Onye Apostụl

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ             4:1-7, 11-13

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Efesus

Mụ onwe m bụ onye mkpọrọ nke Dinwenụ, na-arịọ ụnụ, ka ụnụ bie ndụ kwesiri ọkpụkpọ nke a kpọrọ ụnụ. Werekwanụ ịdị umeala niile, ịdị nwayọ na ndidi na-anaranụ ibe ụnụ n’ịhụnanya.

Nwekwaanụ obi ịnụ ọkụ iji kwado ịdịkọ n’otu nke Mmụọ Nsọ na-enye na njikọta nke udo. E nwere otu ahụ, otu Mmụọ, dika e siri kpọọ ụnụ n’otu nchekwube nke dịịrị ọkpụkpọ a kpọrọ ụnụ.

Otu Dinwenụ dị, otu okwukwe na otu mmirichukwu, otu Chineke na Nna nke anyị niile, onye kacha ihe niile, onye ihe niile sitere na ya na onye nọkwa n’ime ihe niile.

Ma e nyere onye ọbụla amara dịka oke onyinye nke Kristi si dị. Onyinye ya bụ na ụfọdụ ga-abụ ụmụazụ, ụfọdụ ndị amụma, ụfọdụ ndị nkwusa oziọma, ụfọdụ ndị ụkọchukwu na ndị nkuzi.

Nke a bụ maka ịkwadobe ndị nsọ maka ọrụ nke ije ozi, iji rụlite ahụ nke Kristi, ruo mgbe anyị niile ga-eru ịdịnootu nke okwukwe na ịmazu onye Nwa Chineke bụ, wee topụta mmadụ zuru oke n’ime Kristi.

ABỤỌMA NA AZỊZA                               Ps. 19:1-2, 3-4.

Azịza: Ozi ha na-eru nsọtụ ụwa niile.

  1. Eluigwe na-ekwupụta ebube Chineke,

Ihe niile dị na mbara Eluigwe na-ekwupụta ọrụ aka ya,

Ụbọchị niile na-ekwupụta ya,

Abalị ọbụla na-egosipụta amamihe nke Chineke. Azịza.

https://www.catholiclectionary.com/product/electric-incense-burner-in-nigeria/

2. Ha anaghị ekwu okwu nke ha na-eme ụzụ

Nke mmadụ ga-anụ,

Mana olu ha na-agazu ụwa niile.

Ozi ha na-eru nsọtụ ụwa niile. Azịza.

MBEKU

Alleluia, Alleluia,

Abụ m ìhe nke ụwa, onye ọbụla na-eso m agaghị aga n’ọchichịrị.

Alleluia.

Ozioma maka  September 21, 2020, Emume Ncheta Matiu Dị Asọ, Onye Apostụl    – Matiu 9:9-13

Ihe ọgụgụ e wetara na oziọma dị asọ nke Matiu dere:

Ka Jesu hapụrụ ebe ahụ, ọ hụrụ otu nwoke a na-akpọ Matiu, ka ọ nọ n’ụlọụtụ. Jesu sịrị ya, “Sobe m!” O wee  bilie sobe ya.

Ka Jesu nọ n’oriri n’ụlọ Matiu, ọtụtụ ndị ọnaụtụ na ndị omenjọ bịara soro ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụ na-eri nri. Mgbe ndị Farisii nọ ebe ahụ hụrụ nke a, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị: “Gini mere onye nkuzi ụnụ ji eso ndị ọnaụtụ nan di omenjọ eri nri?”

Mgbe Jesu nụrụ nke a, O kwuru sị, “Ọ bụghị ndị ahụ dị ike na-achọ dibịa, kama ọ bụ ndị ahụ adịghị. Gaanụ chọpụta ihe nke a pụtara, ihe na-amasị m bụ ebere, ọ bụghị aja. N’ihina abịaghị m ịkpọ ndị eziomume kama ndị omenjọ.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ:

IHE ỌGỤGỤ ECHI:     Tuezdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise N’oge Nkịtị

Sonyere anyị na Facebook na Catholic Igbo Lectionary

error: Alert: Content is protected !!