Igbo Readings for Immaculate Heart, June 20, 2020, Obi Maria Ebughi Njo

Igbo Readings for Immaculate Heart, June 20, 2020, Obi Maria Na Ebughi Njo

Nke a bu Igbo Mass Readings for Immaculate Heart, maka June 20, 2020, Obi Maria Ebughi Njo, nke ndi Catholic Lectionary wetara unu.

Image of Igbo Readings for  Immaculate Heart, June 20, 2020, Obi Maria Ebughi Njo
Igbo Readings for Immaculate Heart, June 20, 2020, Obi Maria Na Ebughi Njo

IHE OGUGU NKE MBU        61:9-11

Ihe Ogugu e wetara n’akwukwo onye Amuma Aizaya

A ga-amara agburu ha na mba niile, mara ndi si n’etiti ha puta n’ogbo mmadu niile.

Onye obula huru ha ga-ekwuputa na ha bu ndi nke Chineke a goziri agozi. Aga m enwe nnukwu onu n’ime Oseburuwa, mkpuru obi m ga-anuri na Chineke m,

n’ihina o yiwela m uwe nke nzoputa, were uwe eziomume kpucie m ahu, dika otu nwaokorobia na alu nwaanyi siri eji ihe olu di mma ejikwa onwe ya,

nakwa otu nwagbogho a na-alu alu siri eji ola e ji acho mma ejikwa onwe ya. 

Dika otu ala siri epuputa ahihia, dika otu ala ubi siri eme ihe a koro nay a ka o puputa,

otu ahu ka Oseburuwa Chineke ga-esi eme ka ikpe nkwumoto na otito puta ihe n’ihu mba niile.

ABUOMA NA AZIZA       1 Sam 2:1, 4-5, 6-7, 8.

Aziza: Mkpuru obi m na-eto Dinwenu m, Mmuo m na-anuri na Chukwu onye nzoputa m.

1. Obi m na-anuri onu nke ukwuu n’Oseburuwa

N’ihina o meela ka ike m di elu!

Ugbu a ka nwere onu igwa ndiiro m okwu,

N’ihina ana m anuri na nzoputa ya. Aziza

2. A nyajiela uta ndi bu dike,

Ma e yiwela ndi adighi ike ike, dika aji,

Ndi na-eriju afo na mbu ,  na ejezi  oru ngo maka ihe oriri

Ma ndi aguu na-agu na-eriju afo ugbu a

Nwaanyi aga amutala umu asaa

Ebe nwaanyi ahu mujuru ulo gbazi aka nwa. Aziza

3. Yahweh na-eweta onwu, na eweta ndu

O na ezida ndi mmadu n’ala mmuo, na-akpolitekwa ha.

Yahweh na-eme ka ufodu daa ogbenye,

Na-emekwa ka ufodu buru ogaranya.

Ufodu ka o na-ebuda ala,

Ufodu ka o na-ebulikwa elu. Aziza

4. O na-esi na ntu ekulite ndi ogbenye,

O na-esi na ebe ana ekpofu ahihia welite ndi no na mkpa,

Nye ha onodu n’etiti umu ndieze

Iji nye ha ugwu na nsopuru

N’ihina ntoala uwa niile bu nke Yahweh,

N’elu ha ka o kwuwara uwa. Aziza

MBEKU

Alleluia, Alleluia!

O sooro ha laghachi na Nazaret, na-erubekwara ha isi, nne ya dobere okwu ndi a niile n’obi ya.

Alleluia.

Ozioma maka June 20, 2020, Emume Obi Maria N’Ebughi Njo – Luk  2:41-51.

Ihe Ogugu nke a si n’Ozioma di aso nke Luk dere

Kwa afo nne na nna Jesu na-aga Jerusalem n’oge ngabiga. Mgbe Jesu    gbara afo iri na abuo, ya na nne na nna ya sooro gaa dika omenaala siri di;

oge e mechara emume ahu, ka ha na-alaghachi, nwata ahu bu Jesu noduru na Jerusalem. Nne na nna ya amataghi, Ha chere na o sonyere n’etiti ndimmadu.

Ha gara ije otu ubochi tupu ha bido choba ya na etiti ndi ikwu na ibe ha na ndi ha maara. Mgbe ha na-achotaghi ya, ha laghachiri azu na Jerusalem na-achoghari ya.

Mgbe ubochi ato gachara, ha huru ya n’ime ulonso Chineke, ka o no n’etiti ndi nkuzi na ege ha nti na ajukwa ha ajuju.

Nghota na oguguisi o ji aza ajuju turu ndi niile nuru okwu ya n’anya. Mgbe nne na nna ya huru ya, o turu ha n’anya. Nne ya wee si ya,

“Nwa m, gini mere I ji mee mu na nna gi otu a? Lee, mu na nna gin a-achoghari gi kamgbe.”

Ma o zara ha si, “Gini ka unu na-achoghariri m, o bu  na unu amaghi na aga m anoriri n’ulo nna m.”

Ha aghotaghi okwu o gwara ha. O soro ha laghachi na Nazaret, na-erubekwara ha isi, nne ya dobere okwu ndi a niile n’obi ya.

Igbo Readings for Immaculate Heart, June 20, 2020, Obi Maria Na Ebughi Njo

IHE OGUGU UNYAHU: June 19, 2020, Emume Obi Di Aso Nke Jesu

IHE OGUGU ECHI: June 22, 2020, Mondee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Igbo Readings for Immaculate Heart, June 20, 2020, Obi Maria Na Ebughi Njo

Sonyere Anyi na Facebook @ Catholic Lectionary

error: Alert: Content is protected !!