Igbo Readings for July 1, 2020, Wednezdee Izu Nke Iri Na Ato N’oge Nkiti

Igbo Mass Readings for July 1, 2020, Wednezdee, Izu Nke Iri Na Ato N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Nke a bu Igbo Mass Readings maka July 1, 2020,Wednezdee, Izu Nke Iri Na Ato N’oge Na-Adanyeghi N’emume, nke ndi Catholic Lectionary wetara unu.

Image of Wednezdee, Izu Nke Iri Na Ato N’oge Na-Adanyeghi N’emume II
Igbo Mass Readings for July 1, 2020, Wednezdee, Izu Nke Iri Na Ato N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU NKE MBU     5:14-15, 21-24.

Ihe Ogugu e wetara n’akwukwo Onye Amuma Emos

Choba ezi ihe kama ajo ihe, ka unu wee di ndu, ka Yahweh nke igwe ndiagha wee nonyere unu, ka unu siri kwuo.

Kpoonu njo asi ma hu iheoma n’anya, ma meenu ka ikpe nkwumoto buru ihe kwudisiriike n’onuuzo mbata; n’ihina o nwere ike burukwa na Yahweh Chineke ji ike niile ga-enwe amara n’ebe ndi ahu foduru n’ezinuulo Josef no.

Akporo m emume oriri na onunu unu asi ma jukwa ya. Ogbako na ofufe unu anaghikwa amasi m. O bu eziokwu na unu na-erunyere aja nsureoku unu na mkpuru oka unu,

ma agaghi m anabata ha, o buladi aja udo nke unu ji umuanu gbara abuba chuo, agaghi m elekwasa ha anya.

Ya bu, wezuganu ukwe unu ji eme uzu n’ebe m no, agaghikwa m ege nti n’egwu nke ubo akwara unu.

Kama kwerenu ka ikpe nkwumoto hudata ka mmiri, ka eziomume hukwaa ka iyi na-aso aso, mgbe niile.

ABUOMA NA AZIZA  Ps. 50:7, 8-9, 10-11, 12-13, 16-17.

Aziza: Aga m egosi nzoputa nke Chineke n’ebe ndi eziomume no.

  1. Geenu nti ndi nke m ana m ekwu okwu,

Izrel, ana m agba akaebe megide unu,

Mu Oseburuwa, Chineke unu. Aziza

2. O bughi n’ihi aja unu ka m ji wee na-abara unu mba,

Aja nsureoku unu no n’ihu m oge niile,

Agaghi m anabata oke ehi obula nke si n’ulo unu,

Mobu ewu obula nke si n’uloanu unu. Aziza

3. N’ihina umu anuohia niile bu nke m,

Tinyekwara puku kwuru puku ehi n’elu ugwu m niile,

A maara m umunnunu niile nke igwe,

O nweghi ihe bi n’ala na-abughi nke m. Aziza

4. O buru na aguu aguo m, agaghi m akoro unu,

N’ihina uwa na ihe niile di n’ime ya bu nke m,

Ana m eri anu oke ehi

Ka ana m anu obara ewu? Aziza

5. Kedu ikikere unu nwere iji na-agughari iwu m

Iji na-ekwuputa maka ogbugbandu m?

N’ihina unu juru inabata nkuzi m,

Ma leghara okwu m anya. Aziza.

MBEKU (Ps. 145:13)

Alleluia, Alleluia:

Onyenweanyi di ntukwasiobi n’okwu ya niile, omume ya niile juputara n’obi ebere.

Alleluia.

Ozioma maka July 1, 2020, Wednezdee, Izu Nke Iri Na Ato N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Matiu    8:28-34

Ihe Ogugu nke a si n’Ozioma di aso nke Matiu dere

Mgbe o rutere n’akuku nke ozo, n’obodo Gadara, mmadu abuo ndi ajo mmuo ji, si n’ebe a na-eliozu puta zutere ya.

Ha na-eyi oke egwu nke na o nweghi onye nwere ike igafe n’uzo ahu. Ozigbo ha tiri oke mkpu si, “Kedu  ihe jikoro anyi na gi, nwa nke Chineke?

I biara ebe a ita anyi ahuhu tupu oge eruo. Mgbe ahu, e nwere igwe ezi no nso ebe ahu na-ata nri. Ajo mmuo ndi ahu ario ya si:

O buru na I chupu anyi, ziga anyi n’ime igwe ezi ndi a”. Jesu gwara ha si, “Gabanu!” Ha wee puta, banye n’ime igwe ezi ahu.

Ozigbo, ezi ndi ahu weere oso si n’ugwu ahu gbadaa, wee wuba n’ime osimiri. Mmiri gbagburu ha niile.

Ndi na-azu ezi ahu gbara oso, gbaba n’ime obodo, ebe ha kooro ndi mmadu ihe merenu, na ihe mekwara ndi ahu ajo mmuo ji.

Ozigbo, ndi obodo ahu niile putara izute Jesu. Mgbe ha huru ya, ha rioro ya ka o si n’obodo ha puo.

IHE OGUGU UNYAHU: June 30, 2020, Tuezdee, Izu Nke Iri Na Ato N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU ECHI:   July 2, 2020, Toozdee, Izu Nke Iri Na Ato N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Igbo catholic Readings for July 1, 2020, Wednezdee, Izu Nke Iri Na Ato N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Sonyere Anyi na Facebook @ Catholic Lectionary

error: Alert: Content is protected !!