Igbo Readings for July 10, 2020, Fraidee Izu Nke Iri Na Ano N’oge Nkiti

Igbo Mass Readings for July 10, 2020, Fraidee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Nke a bu Igbo Mass Readings maka July 10, 2020, Fraidee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume, nke ndi Catholic Lectionary wetara unu.

Image of Igbo Mass Readings for July 10, 2020, Fraidee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume
Igbo Mass Readings for July 10, 2020, Fraidee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU NKE MBU     14:2-10

Ihe Ogugu e wetara n’akwukwo Onye Amuma Hosea

Izrel loghachikwutenu Yahweh Chineke unu, n’ihina o bu njo unu wetaara unu iso ngongo. Loghachinu azu n’ebe Yahweh no, ma gwa ya si,

“Gbaghaara anyi njo anyi niile, nabata ihe di mma, anyi ga-ejikwa onu anyi kwuputa otito gi. Asiria enweghi ike izoputa anyi, anyi agaghikwa agba inyinya ozo, mobu kpoo ihe aka anyi mere Chineke anyi.

Na gi ka ndi enweghi nne na nna na-enweta ebere.” Aga m agwo enweghi okwukwe ha. Aga m eji obi m niile hu ha n’anya, maka na iwe m esila n’ebe ha no puo.

Aga m adakwasi Izrel ka igirigi, o ga-achawapu dika okooko lili, gbasapukwa mgborogwu dika osisi Sida nke Lebanon.

O ga-epuputa ome ohuru, maa mma dika osisi oliv, o ga-enwe isioma dika osisi nke Lebanon. Ha ga-aloghachi azu biri nan do m, ha ga-abawanye dika oka a kuru n’ugbo.

Ha ga-achawaputa dika osisi vain, nwekwa isioma dika mmanya nke Lebanon. Gini ozokwa ka Ifrem ga-eji umu arusi mee ebe o bu m na-aza ekpere ya, na-elekota ya anya?

Adi m ka osisi Saipres anaghi agbu akwukwo. O bu m na-enye ya mkpuru o na-amita. Ka onyemaihe ghota okwu ndi a.

Ka onyenwereuche ghota ihe ha putara, maka na uzo nke Yahweh ziri ezi, ndi eziomume na-aga na ha, mana ndi omenjo na-aso ngongo.

ABUOMA NA AZIZA    Ps. 51:1-2, 6-7, 10-11, 12, 15.

Aziza: Onu m ga-ekwuputa otito gi

  1. Meere m ebere O Chineke site n’ihunanya Gi,

Site na nnukwu obi ebere gi hichapu njo m niile,

Sachapu mmehie m niile

Wuchapu m na njo m. Aziza

2. Ma ebe I na-ahu eziokwu n’anya

Kuziere m ihe nzuzo amamihe

Were osisi Hissop wuchaa m ka m di ocha

Sachaa m ka m wee di ocha karia aku mmiriigwe. Aziza

3. Chineke, kenye obi di ocha n’ime m

Tinye n’ime m mmuo ohuru na nke siri ike,

Achupukwala m n’ihu gi,

Anapukwala m mmuonso gi. Aziza

4. Nyeghachikwa m anuri nke nzoputa gi,

Were ezi mmuo gi chedo m,

Onyenweanyi meghee egbugbere onu m,

Ka onu m wee kwuputa otito gi. Aziza

MBEKU (Jon 14:23)

Alleluia, Alleluia:

O buru na mmadu ahu ma n’anya, o ga-edobe okwu m, Nna m, ga-ahukwa ya n’anya. Anyi ga-abiakwute ya.

Alleluia.

Ozioma maka July 10, 2020, Fraidee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Matiu    10:16-23

Ihe Ogugu nke a si n’Ozioma di aso nke Matiu dere

Jesu gwara bdi na-eso uzo ya si, “Lee, ana m ezipu unu dika umuaturu n’etiti odum. Ya bu, chaanu akwu dika agwo, ma dinu umeani n’omume dika nduru.

Zerenu ndi mmadu, n’ihina ha ga-arara unu nye n’uloikpe, ha ga-apia unu ihe n’ulo nzuko ha di icheiche. Ha ga-akpugara unu ndi na-achi achi na ndieze n’ihi m.

Unu ga-eji ohere ahu gbaara m akaebe n’ihu ha na ndi mba ozo, mgbe ha raara unu nye, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu,

mobu banyere otu unu ga-esi kwuo ya, n’ihina a ga-akuziri unu ihe unu ga-ekwu n’oge ahu. Maka na o bughi unu ga-ekwu, kama mmuo nke Nna unu ga-esi n’ime unu kwuo okwu.

Nwanne ga-arara nwanne ya nye n’onwu, nna ga-ararakwa nwa ya nye n’onwu. Umu ga-ebili megide ndi muru ha, meek a e gbuo ha.

Mmadu niile ga-akpo unu asi n’ihi m, ma onye nogidesiri ike ruo n’isi njedebe ka a ga-azoputa. O buru na ha emegide unu n’otu obodo,

gbaganu osondu n’obodo ozo, n’ezie agwa m unu, unu agaghi agazuo obodo niile nke Izrel tupu Nwa nke mmadu abia.

Nwata akwukwo anaghi akari onye nkuzi ya, odibo akarighikwa nna ya ukwu, O kwesiri ekwesi ka nwata akwukwo dika onye nkuzi ya, ka odibo dika nna ya ukwu.

O buru na ha kporo nna nwe ulo Belzebul, udi aha gini ka ha ga-enye ndu ezinuulo ya?

IHE OGUGU UNYAHU: July 9, 2020, Toozdee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU ECHI:   July 11, 2020, Satoodee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Ncheta Benediti Di Aso – Abbot

Igbo Catholic Readings for July 10, 2020, Fraidee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Sonyere Anyi na Facebook @ Catholic Lectionary

error: Alert: Content is protected !!