Igbo Readings for July 11, 2020, Satoodee Izu Nke Iri Na Ano N’oge Nkiti

Igbo Mass Readings for July 11, 2020, Satoodee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Ncheta Benediti Di Aso – Abbot

Nke a bu Igbo Mass Readings maka July 11, 2020, Satoodee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Ncheta Benediti Di Aso – Abbot, nke ndi Catholic Lectionary wetara unu.

Quotations of Igbo Readings for  July 11, 2020, Satoodee Izu Nke Iri Na Ano N’oge Nkiti

IHE OGUGU NKE MBU    6:1-8

Ihe Ogugu e wetara n’akwukwo Onye Amuma Aizaya

N’afo nke eze Uziya nwuru, ahuru m Yahweh ka o nokwasara n’elu ocheeze nke di elu, ebube ya juputakwara ulonso ahu.

Ndi mmuooma guzoro n’elu ya, mmuooma obula nwere nku isii, abuo n’ime nku isii ndi a ka ha ji kpuchie ihu ha, werekwa abuo ozo kpuchie ukwu ha, ebe abuo ozo ka ha ji efe efe.

Ha na-asi, “Nso, nso ka Yahweh nke igwe ndiagha di; Ebube ya juputara n’elu uwa niile”.  Uda olu ha mere ntoala niile nke ulo nso ahu ma jijiji; anwuruoku juputakwara n’ulonso ahu.

M wee si, “Efuola m, leenu udi onodu ojoo m no n’ime ya! Maka na abu m onye egbugbereonu ya ruru aru ma norokwa n’etiti ndi egbugbereonu ha rukwaraaru.

Anya m ahula eze, Yahweh nke igwe ndiagha.” Mgbe ahu otu n’ime ndi mmuooma  ahu fekwutere m, o jikwa n’aka ya otu icheku oku nke o ji ihe guta n’ebe nchuaja.

O wee metu m icheku oku ahu n’onu si, “Lee, nke a emetula egbugbereonu gi; ya bu na e kpochapula ikpe omuma gi niile; a gbagharala gi njo gi niile.”

M wee nu olu nke Yahweh ka o na-asi, “O bu onye ka m ga-eziga, onye ga-ejere anyi ya bu ozi?” Ozigbo m zaa si, “Ano m ebe a, ziga m.”

ABUOMA NA AZIZA   Ps. 93:1, 1-2, 5.

Aziza: Onyenweanyi bu eze, O yi ebube ya dika uwe.

  1. Onyenweanyi bu eze, o yi ebube ya dika uwe,

Kere ike n’ukwu ka aji. Aziza

2. Mere ka uwa kwuru chim;

Nke a na-enweghi ike ikwaghari ya,

Ocheeze  gi di bido na mgbe ochie,

I diiri tupu e kee uwa. Aziza

3. Iwu gi niile kwusiri ike

Ebe obibi gi di nso, O Onyenweanyi,

Ruo mgbe ebighi ebi. Aziza

MBEKU (Ps. 130:5)

Alleluia, Alleluia:

Mkpuruobi m na-eche Onyenweanyi, na nkwa ya ka m nwere nchekwube.

Alleluia.

Ozioma maka July 11, 2020, Satoodee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Matiu   10:24-33

Ihe Ogugu nke a si n’Ozioma di aso nke Matiu dere

Jesus gwara ndi na-eso uzo ya si, “Nwata akwukwo anaghi akari onye nkuzi ya, odibo akarighikwa nna ya ukwu.

O kwesiri ekwesi na nwata akwukwo dika onye nkuzi ya, ka odibo dika nna ya ukwu. O buru na ha kporo nna nwe ulo Belzebul, udi aha gini ka ha ga-enye ndi ezinuulo ya?

Unu atula egwu ha, n’ihina o dighi ihe e kpuchiri nke a gaghi ekpughe, mobu nke e zoro ezo mmadu agaghi amata.

Ihe m gwara unu n’ochichiri, kwuputanu n’ihe. Ihe m takwunyere unu n anti, kwusaanu ya n’elu ulo. Unu atula egwu ndi na-egbu anu ahu, ma ha apughi igbu mkpuruobi.

Kama tuonu egwu onye ahu puru ime ka ahu na mkpuruobi laa n’iyi n’okummuo. O bu na anaghi ere nza abuo otu peni?

Mana otu n’ime ha agaghi ada n’ala ma o buru na o bughi uche Nna unu. ‘Otu o di, a guolari ntutuisi unu onu. Ya bu, unu atula egwu n’ihina unu di oke onu karia otutu nza.

Onye obula nke kwuputara n’ihu ndi mmadu, aga m ekwuputa ya n’ihu Nna m nke bi n’eluigwe, ma onye obula gonahuru m n’ihu ndi mmadu, aga m agonahu ya n’ihu Nna m nke bi n’eluigwe.

IHE OGUGU UNYAHU: July 10, 2020, Fraidee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU ECHI:     

Igbo Catholic Readings for July 11, 2020, Satoodee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Ncheta Benediti Di Aso – Abbot

Sonyere Anyi na Facebook @ Catholic Lectionary

Ñ ñ   ì      í    ñ 

Ị      Ọ     Ụ

ị     ọ      ụ

error: Alert: Content is protected !!