Igbo Readings for July 2, 2020, Toozdee Izu Nke Iri Na Ato N’oge Nkiti

Igbo Mass Readings for July 2, 2020, Toozdee, Izu Nke Iri Na Ato N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Nke a bu Igbo Mass Readings maka July 2, 2020, Toozdee, Izu Nke Iri Na Ato N’oge Na-Adanyeghi N’emume, nke ndi Catholic Lectionary wetara unu.

Image of Igbo Mass Readings for July 2, 2020, Toozdee, II
Igbo Mass Readings for July 2, 2020, Toozdee, Izu Nke Iri Na Ato N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU NKE MBU    7:10-17

Ihe Ogugu e wetara n’akwukwo Onye Amuma Emos

Mgbe ahu Amazaya onye ukochukwu nke Betel wee zigara Jeroboam eze ndi Izrel ozi si, “Amos agbaala gi mgba okpuru ka o megide gi n’etiti ulo Izrel, nke na ala apughi ibu okwu ya niile.

Nke a bu ihe Amos kwuru, ‘Jeroboam ga-anwu onwu site na mmaagha, ebe Izrel ga-agbapu oso ndu ma biri na mba ozo dika ohu.”

Ma Amazaya zara Amos si, “Biko gi onye na-ahu ohu, gaba, gbaa oso gbaga n’ala Juda, rie achicha ma bukwaa amumagi ebe ahu.

Abiakwala ebu amuma gi ozo n’ala Betel n’ihina o bu ebe nso nke eze, nakwa ulonso ala eze ahu.” Ma Amos zaghachiri Amazaya si ya,

“Abughi m onye amuma, nke m na-abu nwa onye amuma, kama, abu m onye ochiaturu nakwa onye na-ebechasi osisi sikamo.

Ma Yahweh kpoputara m n’ebe m na-achi aturu, gwa m si, “Gaa buoro ndi nke m Izrel amuma”. Ya bu gee nti ugbu a ka i nuru okwu nke Yahweh!

I si m, ebula amuma megide ulo Izrel nke i na-ekwu megide ulo Aizik! Ya bu, nke a ka Yahweh na-ekwu: Nwunye gi ga-abu akwuna n’obodo a,

ebe umu gin di nwoke nan di nwaanyi ga-anwu site na mmaagha a ga-esinyekwa ndiozo n’ala gi, gi onwe gi  ga-anwu n’ala ruru aru, ma a ga-adopuriri Izrel dika ohu gaa n’ala mba ozo”.

ABUOMA NA AZIZA   Ps. 19:8, 9, 10, 11.

Aziza: Ikpe nke Onyenweanyi bu eziokwu; ha niile kwukwa oto.

  1. Iwu nke Onyenweanyi zuru oke,

O na-enye mkpuruobi ndu ohuru,

Atumaatu nke Onyenweanyi kwesiri ntukwasiobi,

O na-enye ndi di umeala amamihe. Aziza

2. Iwu nke Onyenweanyi kwu oto,

O na-enye obi anuri,

Iwu nke Onyenweanyi putara ihe,

O bu ihe e ji ahu uzo. Aziza

3. Itu egwu Onyenweanyi bu ihe di mma,

O na-adi ebeebe,

Ikpe nke Onyenweanyi bu eziokwu,

Ha niile kwukwa oto. Aziza

4. O di mkpa karia olaedo,

O buladi olaedo kacha mma,

Okwu ya di uto karia mmanu anu,

O buladi mmanu anu a zara aza. Aziza

MBEKU (Col 3:16, 17)

Alleluia, Alleluia:

Na-enyenu Chukwu Nna ekele site na Dinwenu anyi Jesu Kristi. Ka okwu nke Kristi biri n’ime unu n’uju ya.

Alleluia.

Ozioma maka July 2, 2020, Toozdee, Izu Nke Iri Na Ato N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Matiu   9:1-8

Ihe Ogugu nke si n’Ozioma di aso nke Matiu dere.

Jesu banyere n’ugbo, gafee n’ofe osimiri, biaruo n’obodo ya. Mgbe ahu, ha butere ya otu nwoke akuku ahu ya nwuru anwu nke dina n’elu akwa, mgbe Jesu huru okwukwe ha,

 o gwara onye oria ahu si: “Nwa m, obi sie gi ike, a gbagharala gi njo gi niile!” Ufodu ndi odeakwukwo na-ekwukorita n’etiti onwe ha si, “Nwoke a ekwuola aru”.

Ma Jesu maara ihe ha na-eche n’obi ha wee si ha, “Gini mere unu ji eche ihe ojoo n’obi unu? Olee nke ka mfe, ikwu, ‘a gbagharala gi njo gi niile’ ka o bu I si: ‘bilie ma gabakwa ije?

Iji mee  ka unu mara na Nwa nke mmadu nwere ike igbaghara njo n’elu uwa, o gwara nwoke ahu akuku ahu ya nwuru anwu si,’Bilie, buru akwa gi laba’.

O biliri laba n’ulo ya. Mgbe igwe mmadu niile no ebe ahu huru nke a, egwu turu ha. Ha nyere Chineke otitio, onye nyere mmadu ike di otu a.

IHE OGUGU UNYAHU: July 1, 2020, Wednezdee, Izu Nke Iri Na Ato N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU ECHI:    July 3, 2020, Ncheta Thomas di Aso, Onye Apostul

Igbo catholic Readings for July 2, 2020, Toozdee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Sonyere Anyi na Facebook @ Catholic Lectionary

error: Alert: Content is protected !!