Igbo Readings for July 4, 2020, Satoodee Izu Nke Iri Na Ato N’oge Nkiti

Igbo Mass Readings for July 4, 2020, Satoodee, Izu Nke Iri Na Ato N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Nke a bu Igbo Mass Readings maka July 4, 2020, Satoodee, Izu Nke Iri Na Ato N’oge Na-Adanyeghi N’emume, nke ndi Catholic Lectionary wetara unu.

Image of Igbo Mass Readings for July 4, 2020, Satoodee, Izu Nke Iri Na Ato N’oge Na-Adanyeghi N’emume
Igbo Mass Readings for July 4, 2020, Satoodee, Izu Nke Iri Na Ato N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU NKE MBU      9:11-15

Ihe Ogugu e wetara n’akwukwo Onye Amuma Emos

N’ubochi ahu, aga m akwalite uloikwu Devid dara ada ma ruziekwa akuku ya niile dapiasiri adapiasi. Aga m aruzikwa ya ma mekwaa ka o di otu o di na mbu,

ka ha nwee ike nwere ndi foduru n”Edom ya na mba niile ndi a kporo aha m,” O bu Yahweh mer nke a na-ekwu. “Lee ubochi ndi ahu na-abia,”

O bu Yahweh na-ekwu, “mgbe onye na-ako ugbo ga-agafe onye na-ewere akuku ubi, mgbe onye na-azocha mkpuru vain ga-agafekwa onye na-aku mpkuru ya,

mgbe mmanya na-ato uto nke ukwuu ga-esi n’ugwu na-ataputa, sikwa n’ugwu nta niile na-asoputa. Aga m enyeghachikwa ndi nke Izrel iheoma ha ga-eji aruzikwa obodo ha ndi dakporo adakpo, ma birikwa na ha.

Ha ga-ako ugbo vain ma nuokwa mmanya sin a ya, ha ga-akokwa ugbo ma riekwa mkpuru sin a ya. Aga m akunyekwa ha, n’ala ha ka o ghara inwe onye ga-efopu ha ozo n’ala ahu m nyere ha,” o bu Yahweh Chineke unu na-ekwu.

ABUOMA NA AZIZA    Ps. 85:8, 10-11, 12-13.

Aziza: Onyenweanyi na-ekwu okwu udo maka ndi nke ya.

  1. Ana  m ege nti n’ihe Chineke, Onyenweanyi na-ekwu,

Ihe o na-ekwu bu udo,

Maka ndi nke ya, ndi di nso,

Ma o buru na ha alaghachighi azu na mmehie ha. Aziza

2. Ihunanya na okwukwe amakuola,

Eziomume na udo ebiela oma,

Irubeisi ga-esi na’ala pulite,

Eziomume ga-esi n’elu ledata anya. Aziza

3. Ee Onyenweanyi ga-enye anyi  oganiihu,

Ala anyi ga-amita mkpuru bawanye,

Eziomume ga-aga n’ihu ya,

Udo ga-eso nzo ukwu ya. Aziza

MBEKU (Ps. 119:34)

Alleluia, Alleluia:

Nye m nghota ka m wee mata iwu gi, wee nwee ike iji obi m niile dobe iwu gi.

Alleluia.

Ozioma maka July 4, 2020, Satoodee, Izu Nke Iri Na Ato N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Matiu   9:14-17

Ihe Ogugu nke si n’Ozioma di aso nke Matiu dere

E mechaa, umuazu Jon biakwutere ya juo ya si, “Gini mere anyi na ndi Farisii ji ebu onu ma umuazu gi anaghi ebu onu?

Jesu zara ha si, “Ndi biara oriri agbamakwuwko ha ga-ano n’uru mgbe ha na  nwoke na-agba akwukwo ka no? Oge na-abia mgbe a ga-anapu ha nwoke na-agba akwukwo, mgbe ahu, ha ga-ebube onu”.

 O nweghi onye ga-ewere iperipe akwa ohuru duchie akwa ochie, n’ihina o ga-esi n’akwa ahu dokapu, ndoka a ga-aka njo.

A naghikwa agbanye mmanya ohuru n’ime udu ochie. E mee otu a, udu ahu ga-agbawa, mmanya ahu awufuo, udu ahu alakwaa n’iyi.

Kama, a na-agbanye mmanya ohuru n’ime udu ohuru, n’uzo di otu a ka e si echekwa ha abuo.

IHE OGUGU UNYAHU:  July 3, 2020, Ncheta Thomas di Aso, Onye Apostul

IHE OGUGU ECHI:    July 5, 2020, Uka Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Igbo catholic Readings for July 4, 2020, Satoodee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Sonyere Anyi na Facebook @ Catholic Lectionary

2 thoughts on “Igbo Readings for July 4, 2020, Satoodee Izu Nke Iri Na Ato N’oge Nkiti”

Comments are closed.

error: Alert: Content is protected !!