Igbo Readings for July 5, 2020, Uka Nke Iri Na Ano N’oge Nkiti

Igbo Mass Readings for July 5, 2020, Uka Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Nke a bu Igbo Mass Readings maka July 5, 2020, Uka Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume, nke ndi Catholic Lectionary wetara unu.

Image of Igbo Mass Readings for July 5, 2020, Uka Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume
Igbo Mass Readings for July 5, 2020, Uka Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume- Afo nke Mbu

IHE OGUGU NKE MBU        9:9-10

Ihe Ogugu e wetara n’Akwukwo Onye Amuma Zekaraya

Isi Okwu: Lee, eze gi ji umeala na-abiakwute gi

Gi bu ada Zayon, were obi gi niile nuria nnukwu onu. Gi bu ada Jerusalem, tie mkpu onu. N’ihina lee, Eze gin a-abiakwute gi.

O bu Onye Nzoputa aka Ya kwu oto. O di nwayoo, biakwa na-agba inyinya ibu. O nokwasara n’elu nwa inyinya agha niile nke Jerusalem.

O ga-agbajikwa uta agha biakwa gwa mba niile okwu udo. Ogbo ochichi ya ga-esite n’oke osimiri ruo n’oke osimiri nke ozo biakwa site n’osimiri ruo na nsotu niile nke uwa.

ABUOMA NA AZIZA        Ps. 144:1-2, 8-11, 13-14, Az. 1

Aziza: Chineke m na eze m, aga m etogide aha Gi ruo mgbe ebighi ebi.

Ma o bu: Alleluia

  1. Chineke m na eze m, aga m eto Gi.

Aga  m agozi aha Gi ebighi ebi.

Aga m eto Gi kwa ubochi, kwa ubochi,

Aga m eto aha Gi ebighi ebi, ebighi ebi. Aziza

2. Onyenweanyi bu onye amara na onye ebere

O naghi ewe iwe oku.

Obi oma Ya ebuka.

O na-emere ihe niile O kere eke ebere. Aziza

3. Onyenweanyi, ka ihe dum I kere kelee Gi.

Ka ndi kwere na Gi too Gi.

Ha koo akuko ebube nke alaeze Gi.

Ha kwuo okwu banyere idi ike Gi. Aziza

4. Onyenweanyi kwesiri ntukwasi obi n’okwu Ya niile.

O dikwa aso n’oru aka Ya niile.

Onyenweanyi na-ebulite ndi niile na-ada ada.

O na-ekulite ndi niile huru ehuru. Aziza

IHE OGUGU NKE ABUO       8:9, 11-13.

Ihe Ogugu e wetara n’Akwukwoozi Pol di aso Degaara ndi Rom.

Isi Okwu: Unu ga-ebi ndu ka unu were Mmuo Nso kpagbuo mmehie nke anu ahu.

Ihe unu choro abughi ihe nke anu ahu, kama ihe nke mmuo, ebe o bun a Mmuo Chineke bi ebi n’ime unu. N’ezie, o buru na unu enweghi Mmuo nke Kristi, unu abughi ndi nke Ya.

O buru na Mmuo nke Onye ahu kulitere Jesu n’onwu bi ebi n’ime unu; o putara na Onye ahu kulitere Jesu n’onwu ga-esite na Mmuo Ya, were ndu nye ahu unu puru inwu anwu.

Umunna m, n’ihi ya, o nweghi mkpa o bula o di, irubere onwe anyi nke bu anu ahu isi, mobu ibi ndu nke anu ahu. O buru na unu biwe ndu di otu ahu, unu ga-ala n’iyi.

Ma o buru na unu were Mmuo Nso pigbuo mmeru nke ahu, unu ga-adikwa ndu.

MBEKU (Jon 14:5)

Alleluia, Alleluia:

Onyenweanyi kwuru si: “Abu m uzo, eziokwu na ndu. O nweghi onye o bula na-abiakwute Nna, e wepu ma o si n’aka M.

Alleluia.

Ozioma maka July 5, 2020, Uka Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Matiu   11:25-30

Ihe Ogugu nke a si n’Ozioma di aso nke Matiu dere

Isi Okwu: Adi M nwayoo dikwa umeala n’obi

N’oge ahu, Jesu kwuru si: “Nna!, Onyenwe eluigwe na uwa! Ana M ekele Gi, n’ihina ihe a I zonariri ndi oke mmuta na oke aghugho, ka I kpugherela umuntakiri na-amaghi ihe! Nna! E, o bu otu o si masi Gi, ka I si mee ya!

“Nna M weere ihe niile nyefee M n’aka. O nweghi onye ma onye Nwa bu, ma o bughi so Nna; otu o si buru, na o nweghi onye ma onye Nna bu, ma o bughi so Nwa, ma o bu onye o bula o soro Nwa igosi Ya.

“Biakwutenu M, unu niile bu ndi na-adogbu onwe unu n’oru, ndi e bokwara ibu di aro, aga M enye unu ezumike. Nyaranu ibu M n’ubu unu.

Mutakwanu ihe site n’aka M, maka na adi M nwayoo, dikwa umeala n’obi. Mmuo unu ga-achota ezumike. N’ezie, ibu M di mfe. Ibu M adighi aro.

IHE OGUGU UNYAHU: July 4, 2020, Satoodee Izu Nke Iri Na Ato N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU ECHI:    July 6, 2020, Mondee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Igbo Catholic Readings for July 5, 2020, Uka Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Sonyere Anyi na Facebook @ Catholic Lectionary

error: Alert: Content is protected !!