Igbo Readings for July 6, 2020, Mondee Izu Nke Iri Na Ano N’oge Nkiti

Igbo Mass Readings for July 6, 2020, Mondee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Nke a bu Igbo Mass Readings maka July 6, 2020, Mondee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume, nke ndi Catholic Lectionary wetara unu.

Image of Igbo Mass Readings for July 6, 2020, Mondee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume
Igbo Mass Readings for July 6, 2020, Mondee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU NKE MBU     2:16, 17-18, 21-22

Ihe Ogugu e weatara n’akwukwo Onye Amuma Hosea

“Ma lee, aga m arara ya, duba ya n’ime ozara ma were obi nwayo gwa ya okwu, o bu Yahweh na-ekwu. Ebe ahu, o ga-azakwa m dika o mere mgbe O bu agboghobia n’oge ahu o si n’ala Ijipt puta.

Ma n’ubochi ahu Yahweh na-ekwu, i ga-akpo m: “Di m.” i gaghi akpokwa m “Baal m.” Aga m ewere gi ka onye m ga-alu ebeebe;

n’eziomume na n’ikpe nkwumoto na nnukwu ihunanya na n’obi ebere, ebeebe. Aga m eji nkwudosiike were gi dika onye m ga-alu, mgbe ahu i ga-amatakwa Yahweh.

ABUOMA NA AZIZA      Ps. 145:2-3, 4-5, 6-7, 21-22.

Aziza: Onyenweanyi bu onye amara na onye obi ebere

  1. Ubochi niile, aga m eto gi,

Aga m eto aha gi ruo mgbe ebighiebi,

Onyenweanyi di ukwuu kwesikwa inye otito niile,

Ebube ya di omimi karikwara nghota. Aziza

2. Aga m na-eto akaoru gi site na ndudugandu ruo na ndudugandu,

Na-ekwuputakwa oru ebube gi.

Aga m ekwuputa otito na ebube gi,

Aga m atughari uche m n’oru ebube gi niile. Aziza

3. Ndi mmadu ga-ekwuputa maka ike gi di egwu,

Mu onwe m ga-ekwusiike banyere idi ukwuu nke gi,

Ha niile ga-anuri maka obioma gi

Werekwa onu na-ekwuputa eziomume gi. Aziza.

4. Onyenweanyi bu onye amara na onye obi ebere,

O naghi ewe iwe osooso, o juputara n’ihunanya

Onyenweanyi na-egosi mmadu niile obioma ya,

Ebere nke Onyenweanyi na-erute ihe niile o kere. Aziza

MBEKU (Ps. 119:88)

Alleluia, Alleluia:

Onyenweanyi zoputa m, ka m wee nwee ike idobe iwu gi.

Alleluia.

Ozioma maka July 6, 2020, Mondee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Matiu      9:18-26

Ihe Ogugu nke a si n’Ozioma di aso nke Matiu dere

Jesu ka na-agwa ha ihe ndi a mgbe otu onyeisi ochichi biara sekpuru n’ihu ya, rio ya si, “O dibeghi anya nwam nwaanyi nwuru, biko bia bikwasa ya aka, ka o dikwa ndu ozo”.  

Jesu biliri kporo ndi na-eso uzo ya sobe ya. Mgbe ha na-aga, otu nwaanyi riarala mbiobara  afo iri na abuo siri n’azu metu onu uwe Jesu aka, n’ihina o kwuru n’obi ya si,

“O buru na m metu onu uwe ya aka, ahu ga-adi m mma”. Mgbe Jesu tughariri hu nwaanyi ahu, O siri ya, “Obi sie gi ike nwa mnwaanyi,  okwukwe gi agwoola gi”.

Ozigbo ahu, ahu adi nwaanyi ahu mma. Mgbe Jesu biaruru n’ulo onye ochichi ahu, o huru ndi na-afu oja na igwe mmadu ndi na-atu uzu.  

Wee si ha, “Sinu ebe a puo, n’ihina nwagbogho a anwughi anwu, kamao na-arahu ura”. Ha chiri ya ochi. Mgbe a chupuchara igwe mmadu ahu n’ezi,

Jesu banyere n’ime ulo, jide nwagbogho ahu n’aka, o wee bilie. Akuko ihe a Jesu mere gazuru akuku ala ahu niile.

IHE OGUGU UNYAHU: July 5, 2020, Uka Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU ECHI:   July 7, 2020, Tuezdee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Igbo Catholic Readings for July 6, 2020, Mondee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Sonyere Anyi na Facebook @ Catholic Lectionary

error: Alert: Content is protected !!