Igbo Readings for July 7, 2020, Tuezdee Izu Nke Iri Na Ano N’oge Nkiti

Igbo Mass Readings for July 7, 2020, Tuezdee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Nke a bu Igbo Mass Readings maka July 7, 2020, Tuezdee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume, nke ndi Catholic Lectionary wetara unu.

Image of Igbo Mass Readings for July 7, 2020, Tuezdee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume
Igbo Mass Readings for July 7, 2020, Tuezdee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU NKE MBU          8:4-7, 11-13.

Ihe Ogugu e wetara n’akwukwo Onye Amuma Hosea

Ha eguzowela ndieze n’anataghi ike. Hoputakwa ndiisi n’emeghi ka m mara. Ha ejila olaocha na olaedo kpuoro onwe ha arusi maka mbibi ha.

Ajula marusi nwa ehi i kpuru, O Sameria! Iwe m na-enwu ka oku megide ha, kedu mgbe ha ga-adikwa ocha ozo n’Izrel?

O bu onye oruaka mere ya, o bughi Chukwu. A ga-akuricha arusi nwa ehi nke Sameria ahu. Ebe ha na-aku ifufe, ha ga-aghotakwa oke ifufe.

Osisi oka ha amitaghi mkpuru obula, ma  asi na ozo mitara ndi mba o ga-ata  ya. N’ihina Ifrem aruola otutu ebe nchuaja maka njo ya, ebe nchuaja ndi a aburula ya ebe a na-eme njo.

O buru na edeturu m iwu m nye ha ugboro puku kwuru puku, ha ga-ewere ya ka ihe sin a mba ozo bia. Ha huru ichu aja n’anya ha na-eji umumanumaanu achuru m aja ma riekwa ya,

mana Yahweh enweghi mmasi n’ebe aja ha di. Ugbu a, o ga-echeta mmehie ha ma taa ha ahuhu maka njo ha, ha ga-alaghachi azu n’Ijipt.

ABUOMA NA AZIZA     Ps. 115:3-4, 5-6, 7-8, 9-10.

Aziza: Ulo nke Izrel tukwasiriobi n’Onyenweanyi.

  1. Chineke anyi no n’eluigwe,

Na-eme ihe obula masiri ya

Arusi ha bu olaocha na olaedo,

Oru aka ndi mmadu. Aziza

2. Ha nwere onu ma ha anaghi ekwu okwu,

Nwee anya ma ha anaghi ahu uzo,

Ha nwere nti ma ha anaghi anu ihe,

Imi, ma ha anaghi anu isi ihe. Aziza

3. Ha nwere aka ma ha ejighi ya emetu ihe,

Ukwu ma ha ejighi ya aga ije,

Ndi niile mere ha na-adi ka ha,

Otu ahukwa ka ha ga-adi bun di niile tukwasiriobi na ha. Aziza

MBEKU (2 Thes 2:14)

Alleluia, Alleluia:

Site n’ozioma anyi, O kporo unu ka unu wee nweta otito nke Dinwenu anyi Jesu Kristi.

Alleluia.

Ozioma maka July 7, 2020, Tuezdee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Matiu  9:32-38

Ihe Ogugu nke si n’Ozioma di aso nke Matiu dere

Ufodu mmadu kpotaara Jesu otu onye dara ogbi, nke ajo mmuo ji. Mgbe o chupuru ajo mmuo ahu, onye ogbi ahu malitere kwube okwu.

Nke a turu igwe mmadu ahu n’anya, ha wee na-asi: “Anyi ahubeghi ihe di otu a n’ala Izrel mbu”. Ndi Farisii no ebe ahu kwuru si,

“O na-esi n’ike onyeisi ndi ajo mmuo achupu ajo mmuo”. Jesu na-agaghari n’obodo na n’ogbe ha niile, na-akuzi nkuzi n’ulo nzuko ha, na-ekwusa ozioma nke alaeze Chineke, na-agwokwa oria na nrianria ha niile.

Mgbe o huru otutu igwe mmadu ahu, ebere ha mere ya, n’ihina ha no na nsogbu. Ha enweghikwa onye enyemaka, ha dika aturu na-enweghi onye nche.

Jesu wee gwa ndi na-eso uzo ya si, “Owuwe ihe ubi bara uba, mana ndi oru di olemaole, Ya bu, rionu Dinwenu nke owuwe ihe ubi ka o ziga ndi oru n’ugbo ya.

IHE OGUGU UNYAHU: July 6, 2020, Mondee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU ECHI:    July 8, 2020, Wednezdee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Igbo Catholic Readings for July 7, 2020, Tuezdee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Sonyere Anyi na Facebook @ Catholic Lectionary

error: Alert: Content is protected !!