Igbo Readings for July 9, 2020, Toozdee Izu Nke Iri Na Ano N’oge Nkiti

Igbo Mass Readings for July 9, 2020, Toozdee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Nke a bu Igbo Mass Readings maka July 9, 2020, Toozdee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume, nke ndi Catholic Lectionary wetara unu.

Image of Igbo Mass Readings for July 9, 2020, Toozdee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume
Igbo Mass Readings for July 9, 2020, Toozdee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU NKE MBU    11:1, 3-4, 8-9.

Ihe Ogugu e wetara n’akwukwo Onye Amuma Hosea

Mgbe Izrel bu nwata ahuru m ya n’anya, esikwa m n’Ijipt kpoputa nwa m. Ma o bu mu onwe m kuziri Ifrem otu e si aga ije; ekuuru m ha n’aka m, ma ha amaghi na o bu m gworo ha, na-elekota ha anya.

Ejiri m ihunanya wee duo ha. Ebupuru m ha ibu aro ha bu, hulata ala nye ha nri n’onu. Kedu ka m ga-esi hapu gi  O Ifrem?

Kedu ka m ga-esi gbahapu gi O Izrel? Kedu ka m ga-esi mee gi ka Adam; mobu kpaso gi agwa ka Zaboim? Obi agaghi ekwe m ime ya n’ihina ebere na ihunanya m siri ike n’ebe i no.

Agaghi m ata unu ahuhu n’oke iwe m, agaghi m emebi Izrel ozo. N’ihina abu m Chineke, abughi m mmadu, onye di nso no n’etiti unu, agaghi m abia imebi gi ozo.

ABUOMA NA AZIZA     Ps. 80:2, 3, 25-16.

Aziza: Onyenweanyi meek a ihu gi chakwasa anyi, ka anyi wee nweta nzoputa

  1. Gee nti onye nche nke Izrel,

Gi onye na-edu Josef dika igwe aturu!

Gi onye no n’ebe kachasi,

Ihe niile elu, chawaputa ihe gi. Aziza

2. Chineke nke igwe ndiagha,

Si n’eluigwe ledata any aka I hu osisi vain a,

Bia chekwaba mkpuru vain I ji aka gi kuo,

Ka aka gi chekwaba nwoke ahu I hooro, onye ahu I nyere ike. Aziza

MBEKU (Luk 8:15)

Alleluia, Alleluia:

Anuri ga-adiri ndi nuru okwu Chineke, were ikwesi ntukwasiobi na obi dimma jidesie ya ike, werekwa ndidi miputa mkpuru.

Alleluia.

Ozioma maka July 9, 2020, Toozdee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Matiu    10:7-15

Ihe Ogugu nke a si n’Ozioma di aso nke Matiu dere

Jesus gwara ndi na-eso uzo ya si, “Ka unu na-aga, na-ekwunu si, “Alaeze eluigwe adila nso. Gwoonu ndi oria kpolitenu ndi nwuru anwu, meenu ndi ekpenta ka ha di ocha, chupukwanu ajo mmuo.

Unu natara n’efu, nyekwanu n’efu. Unu etinyela olaedo, mobu olaocha, mobu ego obula n’akpa unu. Unu ejila akpa obula maka nje m unu, mobu uwe abuo, mobu akpukpukwu, mobu mkpo;

n’ihina onye oru tosiri ugwo oru ya. Mgbe unu banyere obodo mobu ogbe obula, choputanu ezi mmadu bi na ya, noronu n’ulo ya ruo mgbe unu ga-ahapu ebe ahu.

Mgbe unu na-aba n’ulo obula, kelenu ndi bi na ya si, ‘Udo diri unu’ O buru na ndi bi n’ulo ahu tosiri etosi, ka udo unu diri ha, ma o buru na ha etosighi etosi, ka udo unu laghachiri unu.

Ozokwa, o buru na ezinuulo obula juru inabata unu mobu gee nti n’okwu unu, tichapunu aja di n’obuukwu unu mgbe unu na-ahapu ulo ahu mobu obodo ahu.

N’ezie agwa m unu, Chineke ga-emere ndu bi na Sodom na Gomora ebere n’ubochi ikpe karia ndi obodo ahu.

IHE OGUGU UNYAHU: July 8, 2020, Wednezdee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume 

IHE OGUGU ECHI:   July 10, 2020, Fraidee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Igbo Catholic Readings for July 9, 2020, Toozdee, Izu Nke Iri Na Ano N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Sonyere Anyi na Facebook @ Catholic Lectionary

error: Alert: Content is protected !!