Igbo Readings for June 17, 2020, Wednezdee

Igbo Readings for June 17, 2020, Wednezdee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Nke a bu Igbo Catholic Readings maka Wednezdee, June 17, 2020, nke ndi Catholic Lectionary wetara unu.

Image of Igbo Readings for  June 17, 2020, Wednezdee
Igbo Readings for June 17, 2020, Wednezdee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU NKE MBU     2:1, 6-14

Ihe Ogugu e wetara n’Akwukwo nke Abuo nke Ndieze

Ka Oseburuwa choro iji oke ifufe kporo Elaija la n’igwe, Elaija na Elaisha si Gilgal na-abia. Oge ahu, Elaija gwara ya, “Biko chere ebe a n’ihina Yahweh zigara m Jodan.”

O zaa ya si, “ Ka Chineke di ndu, ka gi onwe gi dikwa ndu, agaghi m ahapu gi.” Ha abuo wee gaba. Umu ndiamuma iri ise sokwara ha gaba ma kwusi n’ebe teturu anya, ka ha abuo guzoro n’akuku Jodan.

Mgbe ahu, Elaija apiakoo uwe nwuda ya, pia ya n’elu mmiri ahu, o kewara uzo abuo, ha abuo wee gafere n’ala okporo. Mgbe ha gafechara, Elaija agwa Elaisha si, “Rio ihe obula m ga-emere gi tupu a kpopu m ebe  i no.”

Elaisha rioro ya si, “Meek a m keta oke mmuo gi mmaji abuo.” O zaa ya si, “I rioro ihe siri ike, ma ka o sila di, i hu m mgbe a na-akpopu m ebe i no, o ga-adi otu i siri rio, mana o buru na I hughi m oge a na-akpopu m, o gaghi adi otu ahu.”

Ka ha abuo na-akparita uka, na mberede, ugboinyinya oku na-adokpu biara kewaa ha abuo. Elaija wee soro oke ifufe laa n’igwe.

Oge ahu, Elaisha huru ya wee tie mkpu si, “Nna m, Nna m, Dike ndi Izrel ji aga mba!” ma o hukwaghi ya ozo.

O weere uwe mwuda Elaija ahu dapunahuru ya laghachi bia guzoro n’akuku osimiri Jodan.

O weere uwe ahu pia n’elu mmiri ahu tie mkpu si, “O lee ebe Yahweh, chineke nke Elaija ahu no?” Ozigbo o piara uwe ahu na mmiri, o kewara uzo abuo, Elaisha wee gafee.

ABUOMA NA AZIZA    Ps. 31:20, 21, 24

Aziza: Nweenu obi siri ike, unu niile bun di chekwubere n’Oseburuwa

1. Lee ka idimma gi siri di ukwuu, O Oseburuwa

Nke I dobeere ndi niile na-aturu gi egwu,

Na-enye ndi niile gbabara na gi

Ka uwa niile wee jiri anya ha hu. Aziza

2. N’ihu gi ka i na-ezobe ha

Ka atumaatu ndi ajoomume ghara imetu ha,

Na ndo nke gi ka i na-ezobe ha

Ka onu ojoo ghara imetu ha. Aziza

3. Unu ndi kwusiri ike, hunu Oseburuwa n’anya

Chineke na-echekwaba ndi kwere nay a,

Mana O na-akwu ndi ngala ugwo ka oru ha si di. Aziza.

MBEKU (Ps. 19:9):

Alleluia, Alleluia:

Iwu nke Onyenweanyi na-enye obi anuri, o bu ihe e ji ahu uzo.

Alleluia.

Ozioma maka June 17, 2020, Wednezdee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Matiu 6:1-6

Ihe Ogugu Nke a si n’Ozioma di aso nke Matiu dere

Jesu gwara ndi na-eso uzo ya si, “Kpacharanu anya ime eziomume, naani ka ndi madu wee hu unu, n’ihina unu mee otu a, Nna unu nke bi n’eligwe agaghi akwu unu ugwo oru.

Ya mere mgbe obula unu na-enye onyinye, unu afula opi dika ndi ihuabuo si eme n’ulo nzuko ha, na n’okporo uzo niile, ka ndi mmadu wee too ha.

N’ezie, agwa m unu, ha anatala ugwo oru ha. Mgbe obula i na-enye onyinye ebere, ekwela ka akaekpe gi mata ihe akanri gin a-eme; ka o wee buru ihe i nyere na nzuzo, Nna unu nke na-ahu na nzuzo ga-akwughachi unu ugwo.

“Mgbe obula unu na-ekpe ekpere, unu emekwala ka ndi ihuabuo, n’ihina o na-amasi ha ikwuru ma na-ekpekwa ekpere n’ime ulo nzuko na n’akuku okporo uzo niile, ka ndi mmadu wee hu ha.

N’ezie agawa m unu, ha anatala ugwo oru ha.

Ma mgbe obula unu na-ekpe ekpere, banyenu n’ime ulo unu, mechie uzo, kpeere Nna unu nke no na nzuzo Nna unu nke na-ahu na nzuzo ga-akwughachi unu ugwo.

IHE OGUGU UNYAHU: June 16, 2020, Tuezdee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU NKE ECHI: June 18, 2020, Toozdee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Igbo Readings for June 17, 2020, Wednezdee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Sonyere Anyi na Facebook @ Catholic Lectionary

error: Alert: Content is protected !!