Igbo Readings for June 18, 2020, Toozdee

Igbo Readings for June 18, 2020, Toozdee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Nke a bu Igbo Catholic Readings maka Toozdee, June 18, 2020, nke ndi Catholic Lectionary wetara unu.

Image of Igbo Readings for  June 18, 2020, Toozdee
Igbo Readings for June 18, 2020, Toozdee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU NKE MBU       48:1-14

Ihe Ogugu e wetara n’Akwukwo Sirak

Oge ahu ka onye amuma Elaija ji bilite ka oku na-enwu enwu. Okwu ya na-achawaputa ka ire oku. O weteere ha ugani.

N’obiinuoku ya, o belatara onuogu ha. Site n’okwu nke Chineke, o mechiri eluigwe mmiri kwusi izo.

Ugboro ato kwa ka o si n’elu kpodata oku. Elaija, i di ebube n’oru itunanya gi, onye tosiri inya isi dika I puru ime?

I sila n’ala mmuo kulite onye nwuru anwu; i dotuola ndieze tinye ha na mbibi si n’elu akwa dotukwaa ndi a maara aha ha.

I nuru mba na Sinai nkwa ikpe nke ibo obo na Horeb; gi onye tere ndieze ude ka ha buru ndi na-abo obo, tekwaa ndimmadu ude ka ha nochie anya gi.

Gi bukwa onye oke ikuku nke oku bugoro n’elu; gi onye di nkwadebe n’oge a kara dika akwukwo nso siri kwu, ime ka iwe Chineke dajuo tupu oke amuma ebido.

Hugharia obi ndi bu nna n’ebe umu ha no, ma dozie ebe Jekob niile di ka ha di na mbu.

Ngozi na-adiri ndi ahu ga-ahu gi, ya na ndi nke ahu ji ihunanya daa n’ura nke onwu, maka na anyi onwe anyi ga-enwekwa ndu.

Mgbe oke ikuku kpuchiri Elaija, Elaisha wee juputa na mmuo nke Elaija. N’ubochi niilenke ndu ya, o nweghi onye ochichi o mara jijiji n’ihu ya, nke o na-enwe onye fonyere ya n’akpa.

O nweghi oru taara ya akpu, o buladi n’onwu, ozu ya mara amuma. Ka o siri ruo oruebube nan du ya, otu a ka oru ya siri di itunanya n’onwu ya.

ABUOMA NA AZIZA      Ps. 97:1-2, 3-4, 5-6

Aziza: Nurianu n’Onyenweanyi unu bun di eziomume

1. Onyenweanyi bu eze! Ka uwa nuriba;

Nurianu ala niile mmiri gbara gburugburu

Urukpu na Ochichiri gbara ya okirikiri

O jiri eziomume na ikpe nkwumoto were too ntoala ocheeze ya. Aziza

2. Oku na-aga n’ihu ya;

Na-erepiasi ndiiro ya no n’akuku ya niile

Amuma ya na-enye uwa niile ihe

Uwa huru nke a maa jijiji. Aziza

3. Ugwu niile gbazere dika mmanu

N’ihu Onyenweanyi nke uwa niile

Eluigwe na-ekwuputa eziomume ya

Mba niile na-ahukwa otito ya. Aziza

4. Ihere mee unu ndi na-esekpuru onyinyo

Ndi ji arusi ha anya isi

Chi niile sekpuoronu Onyenweanyi. Aziza

MBEKU (1 Sam 3:9; Jon 6:69)

Alleluia, Alleluia:

Kwuwe onyenwe m, nwodibo gi na-ege nti. O bu ginwa ji okwu nke ndu ebeebe.

Alleluia.

Ozioma maka June 18, 2020, Toozdee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Matiu 6:7-15

Ihe Ogugu nke a si n’Ozioma di aso nke Matiu dere

Jesu gwara ndi na-eso uzo ya si, “Mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ekwukwala otutu okwu na-abaghi uru, dika ndi mba ozo si eme, n’ihina ha na-eche na site n’otutu okwu, Chineke ga-anu ekpere ha.

Unu emekwala ka ha, n’ihina Nna unu maara mkpa unu tupu unu ario ya. Ya bu, na-ekpenu ekpere otu a: ‘Nna anyi no n’eligwe ka otito diri aha Gi, ka ochichi Gi bia, ka e mee uche Gi n’uwa, dika e si eme ya n’eligwe.

Nye anyi taata nri nke ubochi anyi, gbaghara anyi mmeghie anyi dika anyi si gbaghara ndi meghiere anyi. Ekwela ka anyi kwenye na nranye ma zoputa anyi n’ajo ihe.

N’ihina o buru na unu agbaghara ndi mmadu mmeghie ha, Nna unu nke bi n’eligwe ga-aagbagharakwa unu; mana o buru na unu agbagharaghi ibe unu mmeghie ha mere unu, Nna unu agaghi agbaghara unu mmeghie unu.

IHE OGUGU UNYAHU: June 17, 2020, Wednezdee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU NKE ECHI: June 19, 2020, Emume Obi Di Aso Nke Jesu

June 19, 2020, Fraidee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Igbo Mass Readings for June 18, 2020, Toozdee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Sonyere Anyi na Facebook @ Catholic Lectionary

error: Alert: Content is protected !!