Igbo Readings for June 19, 2020, Fraidee

Igbo Readings for June 19, 2020, Fraidee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Nke a bu Igbo Catholic Readings maka Fraidee, June 19, 2020, nke ndi Catholic Lectionary wetara unu.

Image of Igbo Readings for  June 19, 2020, Fraidee
Igbo Readings for June 19, 2020, Fraidee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU NKE MBU       11:1-4, 9-18, 20

Ihe Ogugu e wetara n’Akwukwo nke Abuo nke Ndieze

Mgbe nne Ahazaya bu Atalia huru na nwa ya nwoke anwuola, o biliri jide umu eze niile gbuchapu.

Kama Jehosheba bu adaeze Joram bukwa nwanne nwaanyi Ahazaya duuru Joash bu nwa Ahazaya wee si n’ime umu eze ndi a ga-egbu egbu zopu ya na onye na-eku ya.

O zonahuru ya Atalia n’ime ulo ebe akwa na-adi nke a mere na e gbughi ya. O zoro ya afo isii n’ime nke Yahweh.

Atalia wee buru eze obodo ahu. Ma n’ime afo nke asaa, Jehoiada ziri ozi, kpoo ndi isi agha na-elekota uloeze nan di isi agha na-eche Atalia nche.

O kpobatara ha n’ime ulo nke Yahweh, o gosi ha nwa eze. Ndiisi usuu agha ahu mere dika Jehoiada bu ukochukwu siri nye ha n’iwu,

onye obula duuru ndi o na-achi ndi ga-aru oru na ndi anoghi n’oru n’ubochi ezumike (sabat) wee biakwuta Jehoiada onye Ukochukwu.

Onye Ukochukwu ahu nyere ndiisi usuu agha ahu ube na uta nke Devid ndi nke di n’ulo nke Yahweh. Ndi nche ji ngwaagha gbaa ulo ahu gburugburu bido na mgbago ruo n’odida ulo ahu ma n’ebe a na-achu aja.

Mgbe ahu o kpotara nwaeze, kpube ya okpueze, nyekwa ya akwukwo ogbugbandu, ha abia mee ya eze, tee ya ude; wee kuo aka ha ma si, “Eze i ga-adi ndu ruo ebighi ebi.”

Ma mgbe Atalia nuru mkpotu ndi nche na nke ndi mmadu, o biakwutere ha n’ime ulo nke Yahweh.

Ma lee, mgbe o lere anya eze guzoro n’akuku ide, dika omenaala siri di, ya na ndiisi na ndi ogbuopi ya guzo ya n’akuku. Oha obodo niile na-anuri na-egbukwa opi.

Atalia dowara uwe ya tie mkpu si, “Nnupuisi! Nnupuisi!” Jehoiada onye ukochukwu nyere ndiisi usuu agha iwu si, “kpopunu ya ebe a, gbuokwanu onye obula ga-eso ya. Unu egbula ya n’ulonso nke Yahweh.”  

Ha duuru ya ruo n’uzo ahu inyinya si abata n’uloeze ebe ha no gbuo ya. Jehoiada wee mee ka ndi obodo, eze ha na Yahweh gbaa ndu, ka ha buru ndi nke Yahweh.

N’aka nke ozo, o mekwara ogbugbandu n’etiti eze nan di obodo. Ndi obodo niile wee banye n’ime ulo Baal, kuto ya.

Ha kupiasikwara onyonyoo ya na ekwuaja ya kpamkpam, wee gbuo Matan bu ukochukwu Baal n’ihu ebe nchuaja ya.

Onye ukochukwu ahu wee hoputa ma zipukwa ndi nche ga na-eche ulo nke Yahweh.

ABUOMA NA AZIZA     Ps.132:11, 12, 13-14, 17-18

Aziza: Onyenweanyi ahorola Zayon ka o buru ebe obibi ya.

1. Onyenweanyi nuoro Devid iyi,

O gaghi echeghari nay a,

Otu n’ime umu gi

Ka m ga-akwuba n’ocheeze gi. Aziza

2. O buru na umu gi edobe iwu niile nke m nyere ha,

Na atumaatu niile m ga-akuziri ha,

Umu ha ga-anokwa n’ocheeze gi ebeebe. Aziza

3. N’ihina Onyenweanyi  ahorola Zayon,

O horola ya ka o buru ebe obibi.

Ebe a ka m ga-ano ebeebe,

Ebe a bu ebe obibi m hooro. Aziza

4. N’ebe a aga m akpolite otu eze n’agburu Devid,

Aga m eme ka oku nke onye m tere ude na-achawaputa ebeebe,

Aga m eji ihere kpuchie ndiiro ya ihu,

Mana ochichi ya ga na-aga n’ihu. Aziza.

MBEKU (Ps. 119:135):

Alleluia, Alleluia:

Mee ka ihu gi chakwasi nwodibo gi, ma kuziere m ime uche gi.

Alleluia.

Ozioma maka June 19, 2020, Fraidee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Matiu 6:19-23

Ihe Ogugu nke a si n’Ozioma di aso nke Matiu dere

Jesu gwara ndi na-eso uzo ya si, “Unu akpakorola onwe unu aku n’elu uwa, ebe o ga-agba nchara mobu akika ataa ya, ebe ndi ohi na-etiwa ma zuo ihe niile.

Kama kwadoronu onwe unu aka n’eluigwe, ebe o na-agaghi agba nchara, ebe akika na-agaghi ata ya, ebe ndi ohi na-agaghi etiwa ma zuo.

N’ihina ebe aku gi di, ebe ahu ka obi gig a-adikwa. Anya bu mmuoku nke ahu.” Ya bu, o buru na anya gi zuru oke, ahu gi niile ga-ejuputa n’ihe.

Ma o buru na anya gi di njo, ahu gi niile ga-ejuputa n’ochichiiri, lee ka ochichiiri ahu si buo oke ibu!

IHE OGUGU UNYAHU: June 18, 2020, Toozdee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU NKE ECHI: June 20, 2020, Satodee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Igbo Readings for June 19, 2020, Fraidee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Sonyere Anyi na Facebook @ Catholic Lectionary

error: Alert: Content is protected !!