Igbo Readings for June 20, 2020, Satodee

Igbo Mass Readings for June 20, 2020, Satodee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Nke a bu Igbo Mass Readings maka Satodee, June 20, 2020, nke ndi Catholic Lectionary wetara unu.

Image of Igbo Readings for  June 20, 2020, Satodee
Igbo Mass Readings for June 20, 2020, Satodee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU NKE MBU 24:17-25

Ihe Ogugu e wetara n’Akwukwo nke Abuo nke Chronicles (Ihe E Mere)

Ka Jehoiada nwusiri, ndiisi Juda biara inye eze nsopuru, eze tughariri inara ndumodu ha. Ndi Juda gbahapuru ulonso nke Yahweh Chineke nke nnanna ha were fewe arusi ha ihe a piri api.

Maka njo ha nke a, iwe Chineke dakwasara Juda na Jerusalem. O ziteere ha ndiamuma ikpoghachi ha azu n’ebe Yahweh no, mana ha egeghi okwu ha nti.

Mmuo nke Chineke dakwasara Zekaraya nwa Jehoiada onye Ukochukwu. O kwuputara n’ihu igwe mmadu si, “Chineke kwuru nke a, ‘O bu maka gini ka unu ji emebi iwu nke Yahweh, ugbu a o gbahapula unu.’”

Ha gbara izu were okwute tugbuo ya n’ogige ulonso dika eze siri nye n’iwu.

Eze Joash chezoro iheoma niile nke Jehoiada nna Zekaraya gosiri ya were gbuo nwa Jehoiada onye nke tiri mkpu mgbe o na-anwu si, “Yahweh na-ahu, o ga-aborokwa!

Mgbe out afo gasiri, ndiagha Aram lusoro Joash ogu, ruo Juda na Jerusalem, gbuchaa ndiisi ochichi ha. Ha wegaara eze ha na Damaskos ihe niile ha lutara n’agha.

O bu eziokwu na ndiagha ndi Aram adighi otutu mana Yahweh mere ka ha meria ndi Izrel, n’agbanyeghi na ha nwere otutu ndiagha n’ihina ha gbahapuru Chineke nnannaha.

Ndi Aram meruru Joash nnukwu ahu. Ha hapuru ya o di ndu onwu ka mma laghachi; ndiisi ochichi ya gbara izu ibi obo onwu nwa Jehoiada onye Ukochukwu, were gbuo ya n’elu akwa ya.

Ha liri ya n’obodo Devid n’ili ozu abughi nke ndieze.

ABUOMA NA AZIZA   Ps. 89:3-4, 28-29, 30-31, 32-33.

Aziza: Aga m ahu onye m hooro n’anya ebeebe

1. Mu na onye m hooro agbaala ndu,

Anuorola m Devid nwodibo m iyi,

Aga m eme ka ochichi gi di ebeebe,

Digide ruo na ndudugandu niile. Aziza

2. Aga m ahu ya n’anya ebeebe,

Ogbugbandu mu na ya ga-adi okpu,

Ochichi ya ga-adi ebeebe,

Ocheeze ya ga-adigide dika eluigwe. Aziza

3. O buru na umu ya enupu isi n’iwu m,

Gharakwa iso uzo m niile

O buru na ha enupuru m isi

Ma ghara idobe iwu m. Aziza

4. Aga m ata ha ahuhu maka ihi njo ha niile

Ma mesiekwa ha ike maka mmeghie ha

Mobu ghara imejuputa nkwa m. Aziza

MBEKU (Jemis 1:18):

Alleluia, Alleluia:

Onyenweanyi jiri okwu nke eziokwu ahu mee ka anyi puta iche. Meekwa ka anyi buru ndi mpkuru mbu nke ihe o kere eke.

Alleluia.

Ozioma maka June 20, 2020, Satoodee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume  – Matiu 6:24-34

Ihe Ogugu nke si n’Ozioma di nso nke Matiu dere

Jesu gwara ndi na-eso uzo ya si,”O nweghi onye puru igbara nnaukwu abuo odibo; n’ihina o ga-akpo out asi hu nke ozo n’anya, mobu o ga-asopuru out lelia nke ozo.

Unu apughi ibu odibo Chineke na aku nke uwa. “Ana m agwa unu eziokwu, unu echegbula onwe unu banyere ndu unu, ihe unu ga-eri, mobu ihe unu ga-anu, mobu banyere ahu unu; ihe unu ga-eyi n’ahu?

O bu na ndu akarighi ihe oriri, ka o bu na ahu akarighi ihe a na-eyi n’ahu. Leenu, umu nnunu nke igwe, ha anaghi ako ugbo, ha anaghikwa ewe ihe ubi nke ha na-akpokoba ihe n’oba, ma Nna unu nke eluigwe na-azu ha.

O bu na unu abaghi uru karia ha? Kedu onye n’ime puru itukwasi ihe na ndu ya site n’ichegbu onwe ya?

Gini mere unu ji echegbu onwe unu banyere uwe unu ga-eyi n’ahu? Leenu okooko di n’ubi ka ha si eto; ha anaghi aru oru, nke ha na-ekwe akwa.

Ma agwa m unu, obuladi Solomon, na ekeike eze ya niile, amarughi mma ka otu n’ime okooko ndi a.

O buru na Chineke si otu a choo ahihia di n’ubi mma, nke di ndu taa, echi a tunye ya n’oku, o bu na o gaghi eyikwasi unu uwe karia, unu ndi obere okwukwe?

Ya bu, unu echegbula onwe unu si, “Gini ka anyi ga-eri? Mobu gini ka anyi ga-anu? Mobu gini ka anyi ga-eyi n’ahu.

N’ihina ndi mba ozo na-acho ihe ndi a niile, ma Nna unu nke bi n’eluigwe maara na ihe ndi a di unu mkpa.

Ma burunu uzo choba alaeze Chineke na eziomume ya, ihe ndi a niile ga-abukwa nke unu.

Ya bu, unu echegbula onwe unu banyere ihe echi ga-eweta, n’ihina echi ga-echere onwe ya banyere mkpa nke diiri ya.

Nsogbu ubochi ezuola maka ubochi ahu.

IHE OGUGU UNYAHU: June 19, 2020, Emume Obi Di Aso Nke Jesu

June 19, 2020, Fraidee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU ECHI: Uka Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Igbo Mass Readings for June 20, 2020, Satodee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Sonyere Anyi na Facebook @ Catholic Lectionary

error: Alert: Content is protected !!