Igbo Readings for June 21, 2020, Uka Nke Iri Na Abuo N’oge Nkiti

Igbo Mass Readings for June 21, 2020, Uka Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Nke a bu Igbo Mass Readings maka June 21, 2020, Uka Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume, nke ndi Catholic Lectionary wetara unu.

Image of Igbo Readings for June 21, 2020, Uka Nke Iri Na Abuo N’oge Nkiti
Igbo Mass Readings for June 21, 2020, Uka Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU NKE MBU 20:10-13

Ihe Ogugu e wetara n’akwukwo onye Amuma Jeremaya

Isi Okwu: O naputara obi ndi no na mkpa n’aka ndi ajo mmadu

Jeremaya kwurz si: ” N’ezie, anula m izu ojoo nke otutu mmadu na-agba megide m si: ‘Egwu dikwa n’ebe niile!

Gbagide ya ama! K’anyi gbagide ya ama! Ndi niile mu na ha di na mma na-eche mgbe o bula m ga-azohie ukwu daa.

E leghi anya, onya ga-ama ya, anyi enweta ya, booro onwe anyi obo ihe o mere anyi.’

Ma Onyenweanyi nonyere m, dika oke dikeogu. Ndi na-ebuso m agha ga-asu ngongo.

Ha agaghi emeri. Ihere ga-eju ha anya n’odida ha, wee butere ha oke ogba gharii di ebighi ebi, nke a na-agahi echefu echefu.

Onyenweanyi nke igwe ndi agha, o bu Gi na-enyocha ndi ezi omume;

Gi bu onye ahu na-enyocha uche na obi mmadu, kwee ka m jiri anya m hu obo I ga-abogwara ha, maka na o bu Gi ka m kpesara olu m.

Kweere Onyenweanyi ukwe. Too Onyenweanyi maka na Onyenweanyi agbaputala ndu umu ogbenye n’aka ike nke ndi ajo omume.

ABUOMA NA AZIZA Ps. 68:8-10, 14, 17, 33-35 Az. 14

Aziza: Onyenweanyi, were nnukwu ihunanya Gi za m oku.

1. N’ihi Gi ka m ji ana nkocha. Ihere ekpuchiela m ihu. Aghoola m onye a tupuru n’iwu n’ebe umunne m no. Biakwa ghoo onye obia n’etiti umunne m, ndi otu nne muru mu na ha. Maka na obi inu oku maka Gi erepiala m. Nkocha ndi na-ekwuto Gi na-ala m n’isi. Aziza

2. Onyenwe m, ana m ario Gi; Chineke m, ana m ario amara Gi. Na nnukwu obi oma Gi, nyere m aka ugboro ugboro, za m oku. Onyenwe m za m oku n’ihi na obi oma Gi ebuka. Na nnukwu ebere Gi, tugharia chee m ihu. Aziza

3. Unubu umu ogbenye, leenu anya, ka obi too unu uto. Unu bu ndi na-acho Chineke, ka obi unu juputa n’anuri. Maka na Onyenweanyi na-anu olu umu ogbenye. Anya Ya anaghi apu apu na ndi nke Ya eji n’agbu. Ka eluigwe na ala too Ya. Ka osimiri na ihe niile na-emetu unara n’ime ya too Onyenweanyi. Aziza.

IHE OGUGU NKE ABUO 5:12-15

Ihe Ogugu e wetara n’akwukwo Pol di aso degaara ndi Rom

Isi Okwu: Amara e nyere kariri odida a dara

Dika njo si n’aka otu nwoke wee bata n’uwa; onwu sokwara njo bata. Otu ahu ka onwu si rute mmadu niile, maka na onye o bula emeela njo.

Njo anoolari n’uwa ogologo oge tupu e nye iwu. Ma ebe o bu na iwu adighi, o nweghi onye e nwere ike ibo ebubo na o mere njo nke ‘imebi iwu’.

Ma onwu chiri mmadu niile, bido n’Adam ruo na Mosis; o buladi na njo ha abughi imebi iwu, dika nke Adam.

Adam bu onye e ji ama atu nke Onye Ahu gaje ibia. Ma amara e nyere jiri ihe buru ibu karia odida a dara.

O buru na o were anya, na mmadu dum sitere n’odida otu nwoke nwuo; o kara wee anya na amara Chineke,

nke sitere n’aka otu nwoke ahu bu Jesu Kristi, biara rute mmadu niile, dika onyinye zuru oke, e nyere na nkiti.

ALLELUIA

Alleluia, Alleluia!

Onye o bula huru M n’anya ga- edebe okwu M. Nna m ga-ahu ya n’anya. Anyi ga-abiakwute ya.

Alleluia.

Ozioma maka June 21, 2020, Uka Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Matiu 20:26-33

Ihe Ogugu nke a si n’Ozioma di aso nke Matiu dere

Isi Okwu: Ujo mmadu atula unu

Jesu gwara umuazu Ya si: “Unu atula ujo mmadu! N’ihi na ihe o bula e kpuchiri ekpuchi ugbu a ga-abu ihe e kpughere ekpughe.

Nke o bula e zoro ezo, ga-abu ihe a agbara n’anwu. Ihe m gwara unu n’ochichiri, kwuonu ya n’ehihie ocha.

Ihe m takwunyere unu na nti, kwusaanu ya n’elu ulo.

Unu atula egwu ndi ahu na-egbu ahu, ma ha enweghi ike igbu mkpuru obi. Kama tuonu egwu Onye ahu nwere ike ime ka ahu na mkpuru obi laa n’iyii n’oku ala mmuo.

Ihe a na-ere umu nza abuo o bughi naani otu kobo? Ma nke o bula n’ime ha e nweghi ike ida n’ala, ma o buru na Nna unu amaghi.

Ma otu o di, o guola agiri isi unu bu n’isi onu. Ya mere, unu atula egwu o bula. N’ihi na unu di oke onu ahia karia otutu umu nnunu.

“Ya mere, onye o bula nke ga ekwuputa M n’ihu ndi mmadu, aga M ekwuputa ya n’ihu Nna M no n’eluigwe.

Ma onye o bula nke ga-agonari M n’ihu ndi mmadu, aga M agonari ya n’ihu Nna M no n’eluigwe.

IHE OGUGU UNYAHU:  June 20, 2020, Emume Obi Maria N’Ebughi Njo

June, 20, 2020, Satoodee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU ECHI:   June 22, 2020, Mondee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Igbo Catholic Readings for June 21, 2020, Uka Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Sonyere Anyi na Facebook @ Catholic Lectionary

error: Alert: Content is protected !!