Igbo Readings for June 22, 2020, Mondee

Igbo Mass Readings for June 22, 2020, Mondee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Nke a bu Igbo Mass Readings maka Mondee, June 22, 2020, nke ndi Catholic Lectionary wetara unu.

Image of Igbo Readings for  June 22, 2020, Mondee
Igbo Mass Readings for June 22, 2020, Mondee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU NKE MBU    17:5-8, 13-15, 18

Ihe Ogugu e wetara n’Akwukwo nke Abuo nke Ndieze

Mgbe ahu, eze Asiria lusoro obodo ahu niile agha. Mgbe o rutere Sameria, ya na ndiagha ya gbakwara ya gburugburu chebido ya, na-ebuso ha agha ruo afo ato.

N’afo nke itoolu nke ochichi Hoshia, eze Asiria meriri Sameria, kpuga umu Izrel n’Asiria, nye ufodu ebe obibi na Hala, ufodu n’ikpere mmiri Habo bu osimiri Gozan, ndiozo, n’obodo ndi Medes.

Nke a mere n’ihina ndi Izrel emehiela Yahweh, Chineke ha, onye siri n’Ijipt kpoputa ha site n’aka Fero bu eze Ijipt. Ha febere chi ndiozo.

Ha sooro omenaala obodo ndiozo, bu ndi Chineke chupuru n’ihi umu Izrel na omenaala ndieze Izrel webatara.

N’agbanyeghi omume ndi a, Yahweh sikwara n’onu ndiamuma, ndi ohuuzo, doo ha aka na nti si,

“Sinu n’omume ojoo unu puta ma dobe iwu na okwa ndi a site n’igbaso  usoro iwu niile nke m nyere  nna nna unu ndi m si n’onu ndiamuma  ndiodibo m kwuputara ha.”

Ma na ha achoghi ige nti.  Ha kpochiri nti, gbaa isi akwara dika nna nna ha ndi enweghi okwukwe na Yahweh Chineke ha.

Ha ledara iwu ya na ogbugbandu ya na nna nna ha mere anya wee nupu isi na ndumodu na okwa ndi o maara ha.

Ha gbasoro chi ndiozo bu ihe efu, si otu a burukwa ihe efu n’onwe ha, site n’inomi obodo ndi gbara ha gburugburu n’agbanyeghi na Yahweh doro ha aka na nti ka  ha kwusi ihe ha na-eme.

Maka ihi ya, Yahweh weere umu Izrel nnukwu iwe, chupu ha n’ebe o no. Sooso agburu Jud aka o hapuru.

ABUOMA NA AZIZA     Ps. 60:3, 4-5, 12-13

Aziza: Onyenweanyi, zaa anyi oku ma were aka nri Gi zoputa anyi.

1. Chineke i jula anyi, I tikpoola ebe nchedo anyi,

I na-eweso anyi iwe, laghachikwute anyi! Aziza

2. I meela ka ala maa jijiji tiwaa abuo,

Ma ugbu a mechikwaa oghere ndi a o ka na-agbakwasi,

I hapula ndi nke gi ka ha taa ahuhu,

Mee ka anyi nuo mmanya na-egbu anyi egbu. Aziza

3. Chineke, I jula anyi n’ezie?

I nakwaghi eso ndiagha anyi eje agha.

Nyere anyi aka n’oge ogbaaghara

Enyemaka mmadu abughi ihe obula. Aziza

MBEKU (Ps. 130:5):

Alleluia, Alleluia:

Ana m eche Onyenweanyi, mkpuru obi m na-ebe ya, na nkwa ya ka m nwere nchekwube .

Alleluia.

Ozioma maka June 22, 2020, Mondee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Matiu   7:1-5

Ihe Ogugu nke a si n’Ozioma di aso nke Matiu dere

Jesu gwara ndi na-eso uzo ya si, “Ekpela mmadu ibe gi ikpe ka a ghara ikpe gi ikpe.

N’ihina otu I siri kpee mmadu ibe gi ikpe ka a ga-esi kpee gi ikpe. Ihe I jiri tunyere onye ozo ka a ga-eji tunyere gi.

Gini mere i jiri hu mpekele ihe di n’anya nwanne gi, ma i hughi ogwe osisi di n’anya gi onwe gi?

Mobu kedu ka i ga-esi agwa nwanne gi si, “ Ka m wepu gi mpekele ihe di gi n’anya ebe gi onwe gi bu ogwu osisi n’anya nke gi?

Onye ihuabuo, buru uzo wepu ogwe osisi di gi n’anya, ka i wee hu uzo nke oma iwepu mpekele ihe di n’anya nwanne gi.

IHE OGUGU UNYAHU: Uka Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU ECHI:   June 23, 2020, Tuezdee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Igbo Mass Readings for June 22, 2020, Mondee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Sonyere Anyi na Facebook @ Catholic Lectionary

error: Alert: Content is protected !!