Igbo Readings for June 23, 2020, Tuezdee

Igbo Mass Readings for June 23, 2020, Tuezdee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Nke a bu Igbo Mass Readings maka Tuezdee, June 23, 2020, nke ndi Catholic Lectionary wetara unu.

Image of Igbo Readings for  June 23, 2020, Tuezdee
Igbo Mass Readings for June 23, 2020, Tuezdee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU NKE MBU     19:9-11, 14-21, 31-35, 36

Ihe Ogugu e wetara n”akwukwo nke Abuo nke Ndieze

N’otu oge ahukwa eze Asiria nuru akuko na Tihaka, eze Etiopia du ndiagha ya abia ibuso ya agha, o zigara ndiozi ka ha jekwuru Hezekaya si,

“Ihe a ka unu ga-agwa Hezekaya eze juda si ya, ‘Ekwela ka Chineke gi, onye i  tukwasara obi na ya duhie gi, site n’ime ka i nwee, nchekwube na agaghi m emeri Jerusalem.

Lee, i nula ihe ndieze Asiria merela mba niile mebichaa ha kpamkpam, o bu gi ka a ga-azoputa?’”

Hezekaya naara akwukwoozi site n’aka ndiozi ya, guo ya, o gbagokwara n’ime ulo Oseburuwa gbasakwa ya n’ihu Oseburuwa.

Hezekaya kpere ekpere n’ihu Chineke si, “Biko Yahweh Chukwu nke Izrel, onye no n’etiti ndi muoma, i bu Chineke naani gi, nke ala eze niile nke uwa, gi mere eluigwe na uwa.

Yahweh, gee nti nuru, meghee anya gi ka i hu, nuru okwu nke Senakerib zitere iji kparia Chineke di ndu.

O Yahweh, n’eziokwu ndieze Asiria emebichaala otutu obodo n’aka ha.

Ha suru chi niile oku, n’ihina ha abughi chi, kama oru aka mmadu, osisi na nkume. Ya mere e ji mebie ha.

Ugbu a biko Yahweh Chineke anyi, ana m ario gi, si n’aka ya zoputa anyi, ka obodo niile nke uwa mara na so gi bu Yahweh na Chineke.”

Aizaya nwa Emoz wee zigara Hezekaya ozi si, “Yahweh Chineke nke Izrel kwuru si, ‘Anula m aririo gi banyere Senakerib, eze Asiria.’

Nke a bu okwu nke Yahweh kwurula gbasara ya: Ada Zayon, agbogho amaghi nwoke eleliala gi anya ma chinye gi ihere; ada Jerusalem efufeela isi, n’azu gi.

Ndi ahu foduru afodu ga-esi Jerusalem na elu ugwu Zayon puta. Yahweh ga-emeriri nke a site na mmasi ya.

Ihe a ka Yahweh kwuru banyere eze Asiria: ‘O gaghi abata n’ime obodo a mobu gbabata aku nay a.

O gaghi eji ota ya bata n’ime ya, nke o na-aruru onwe ya nkwasa o ga-eji megide ya.

Site n’uzo o siri bi aka o ga-esi laghachi, o gaghi abata n’ime obodo a, zoputa ya maka ihi m n’ihi nwodibo m, Devid.

N’abali ubochi ahu mmuooma  nke Yahweh gara gbuo nari puku mmadu na puku iri asato na ise n’uloagha ndi Asiria.

Senakerib eze Asiria wee laghachi, ga biri na Ninive.

ABUOMA NA AZIZA   Ps. 48:1-2, 2-3, 9-10

Aziza: Chineke na-eme ka obodo ya guzosie ike ebeebe ebeebe.

1. Onyenweanyi di ukwuu bia kwesikwa inye otito

N’obodo Chineke anyi

N’ugwu ya di nso, ihe mara mma n’idi elu

Na ihe-obi-uto nke uwa niile. Aziza

2. Ugwu Zayon isi anuri nke uwa niile

Ebe obibi nke nnukwu eze ahu

Chineke n’onwe ya egosila na ya

Bu ebe mgbaba n’etiti obodo ahu. Aziza.

3. Chineke, anyi no n’ime Ulonso gi

Na-achighari ihunanya gi n’obi anyi

Uwa niile na-ekwuputa aha gin a otito gi,

O Chineke aka nri gi juputara n’ikpe nkwumoto. Aziza

MBEKU:

Alleluia, Alleluia:

“Mu onwe m bu uzo, eziokwu na ndu. O dighi onye ga-abiakwute Nna ma o bughi site na m.

Alleluia.

Ozioma maka June 23, 2020, Tuezdee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Matiu 7:6, 12-14

Ihe Ogugu nke a si n’Ozioma di aso nke Matiu dere

Jesu gwara ndi na-eso uzo ya si, “Unu enyela nkita ihe di nso, nke unu na-akpuru ezi ulari oke onu unu, ka ha ghara izoto ha ma tugharia buso unu agha.

Ya bu, meerenu ndi ozo ihe obula unu na-acho ka ha meere unu; nke a bu isi nkuzi iwu Mosis nan di amuma.

“Sinu n’onuuzo di warawara banye, n’ihina uzo nke mbibi sara mbara ma dikwa obosara, ma otutu ka ha di bu ndi na-abanye n’ime ya.

Ma warawara na mkpagide ka uzo ahu di, nke na-eduba nan du, olemaole bu ndi na-achota ya.

IHE OGUGU UNYAHU: Mondee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU ECHI:    June 24, 2020, Emume Omumu Jon Omemmirichukwu

Igbo Catholic Readings for June 23, 2020, Tuezdee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Sonyere Anyi na Facebook @ Catholic Lectionary

error: Alert: Content is protected !!