Igbo Readings for June 25, 2020, Toozdee

Igbo Mass Readings for June 25, 2020, Toozdee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Nke a bu Igbo Mass Readings maka Toozdee, June 25, 2020, nke ndi Catholic Lectionary wetara unu.

Image of Igbo Readings for  June 25, 2020, Toozdee
Igbo Mass Readings for June 25, 2020, Toozdee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU NKE MBU    24:8-17

Ihe Ogugu e wetara n’akwukwo nke abuo nke Ndieze

Jehoyakin gbara afo iri na asato oge o bidoro buru eze, ma o chiri na Jerusalem onwa ato. Aha nne ya bu Nehushta, ada Elnatan, nke si Jerusalem.

O mere ihe ojoo n’ihu nke Yahweh dika nna ya. N’oge ahu, ndiagha Nebukadneza, eze Babilon biara gbaa obodo ahu gburugburu, ka ha buso ha agha.

Ma Nebukadneza n’onwe ya banyere n’obodo ahu oge ndiagha ya na-agba ya gburugburu. Jehoyakin eze  Juda nyefere onwe ya, nne ya, umuodibo ya, umu ya, na ndiisi oru ya n’aka eze Babilon.

Nebukadneza tinyere Jehoyakin n’ulo mkporo n’ime afo asato nke ochichi ya. Dika Oseburuwa si kwuo, Nebukadneza bukooro aku niile di n’ulo Yahweh nke di n’ulo onyeeze, nke Solomon eze Izrel mere maka ulo Yahweh.

Nebukadneza chikooro Jerusalem, umu eze niile, ndiagha, na ndi oru dum na ndiagha ma ndi oru nwere agba onu ogu ha putara puku iri.

O chikokwara ndi oru aka na ndi oru okpuuzu no n’obodo ahu. O nweghi ndi foduru n’obodo beluso ndi ogbenye onu ntu.

Nebukadneza wee kporo Jehoyakin kpochie na bailon. O bukwaara nne eze, ndi nwunye ya, ndi oru ya nan di na-achi obodo wee si Jerusalem gaa Babilon.

Eze Babilon bulatakwara na Babilon ndiagha ahu niile di puku asaa, ndi mmuo ha siri ike maka agha, ya na otu puku  bu ndi oru aka na ndi okpu uzu. Nebukadneza mere Matanaya , nwanne nna Jehoyakin eze n’onodu ya, gugharia ya Zedekaya.

ABUOMA NA AZIZA    Ps. 79:1-2, 3-5, 8, 9.

Aziza: Maka otito nke aha gi, Onyenweanyi, zoputa anyi.

  1. Chineke, ndi amaghi gi abala ndi nke gi ogu,

Ha emeruola ulo gi di nso,

Ha etikpoola Jerusalem,

Ha ewerela ozu umuodibo gi,

Nye umu nnunu ka o buru nri ha,

Ahu ndi nke di nso ka e nyere umuanuohia. Aziza

2. Ha kwafuru obara ha dika mmiri na Jerusalem niile,

E nwezighi obuladi otu onye ga-eli ozu ha,

Anyi aburula ihe ndi agbataobi anyi ji akpa ochi,

Mba niile gbara anyi gburugburu na-akparizi anyi,

Kedu mgbe iwe gig a-akwusi O Onyenweanyi?

Iwe gi di oku o ga-adi ebeebe? Aziza.

3. Atala anyi ahuhu njo nnanna anyi ha mere;

Kama ka obioma gi biakwute anyi osooso,

N’ihina ha ewotuola anyi ala nke ukwuu, Aziza

4. Nyere anyi aka, O chineke onye nzoputa anyi,

Maka otito nke aha gi,

Zoputa anyi ma gbaghara anyi njo anyi,

N’ihi aha gi! Aziza

MBEKU (1 Pita 1:25)

Alleluia, Alleluia:

Okwu nke Onyenweanyi ga-aadigide ruo mgbe ebighiebi.” Okwu a bukwa ozioma ahu nke a gbasaara unu.

Alleluia.

Ozioma maka June 25, 2020, Toodee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Matiu  7:21-29

Ihe Ogugu nke a si n’Ozima di aso nke Matiu dere

Jesu gwara ndi na-eso uzo ya si, “O bughi onye nke na-akpo m ‘Dinwenu, Dinwenu ga-aba n’alaeze eluigwe, kama o bu onye na-eme uche nke Nna m bi n’igwe.

N’ubochi ahu, otutu ga-asi m, ‘Onyenweanyi, Onyenweanyi, O bu na anyi ebughi amuma n’aha gi, chupu ajo mmuo n’aha gi, ma rukwa otutu oru ebube n’aha gi?

Mgbe ahu, aga m agwa ha si, ‘Amaghi m ndi unu bu, sinu ebe m no puo, unu ndi ajo mmadu’ “Onye obula nke na-anu okwu m ndi a, na-emekwa ha, dika nwoke maara ihe,

nke ruru ulo ya n’elu okwute, mmiri wee zoo, ide mmiri tojuo, ifufe bukwara ya ma o daghi n’ihina a toro ntoala ya n’elu okwute.

Onye obula nke na-anu okwu ndi a, ma o naghi eme ha, dika onye nzuzu nke ruru ulo ya n’elu aja, mmiri zoro, ide mmiri tojuo, ifufe bukwara ya, o wee daa.

Odida nke ulo ahu buru ibu nke ukwuu.” Mgbe Jesu kuzichara ihe ndi a, nkuzi ya turu igwe mmadu ahu n’anya, n’ihina o naghi akuziri ha dika ndi odeakwukwo ha, kama dika onye nwezuru ike niile.

IHE OGUGU UNYAHU: June 24, 2020, Emume Omumu Jon Omemmirichukwu

IHE OGUGU ECHI:     June 26, 2020, Fraidee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Igbo Catholic Readings for June 25, 2020, Toozdee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Sonyere Anyi na Facebook @ Catholic Lectionary

error: Alert: Content is protected !!