Igbo Readings for June 26, 2020, Fraidee

Igbo Mass Readings for June 26, 2020, Fraidee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Nke a bu Igbo Mass Readings maka Fraidee, June 26, 2020, nke ndi Catholic Lectionary wetara unu.

Image of Igbo Mass Readings for June 26, 2020, Fraidee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume
Igbo Mass Readings for June 26, 2020, Fraidee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU NKE MBU    25:1-12

Ihe Ogugu e wetara n’akwukwo nke abuo nke Ndieze

N’afo nke itoolu n’ime ochichi Zedekaya, mgbe onwa nke iri gbara mkpuru ubochi iri, Nebukadbeza eze Babilon na ndiagha ya niile busoro Jerusalem agha.

O no na mputa obodo were ndiagha ya gbaa ya gburugburu, were ruo n’afo nke iri na otu n’ime ochichi Zedekaya.

Mgbe onwa nke ano gbara mkpuru ubochi itoolu, unwu dara n’obodo a nke mere na o nweghikwa nri nke ndi mmadu ga-eri.

N’etiti abali ubochi ahu, Zedekaya na ndiagha ya tipuru mgbidi obodo ahu, bido igba oso. Ha si onuuzo di n’etiti mgbidi abuo di nso n’ubi eze;

ha gbaara gaba uzo Araba n’agbanyeghi na ndi Kaldia gbara obodo ahu gburugburu. Ma ndiagha Kaldia chuwara eze ahu, wee gafee ya n’obosara ala Jeriko.

Ndiagha ya wee gbasasia. Ha wee jide eze kpugara ya eze Babilon na Ribla onye nke mara ya ikpe. Ha gbuchara umu Zedekaya n’ihu ya.

Ha ghupuru ya anya, were tuo ya iga n’aka kpuga ya Babilon.

Na mkpuru ubochi asaa nke onwa ise n’ime afo nke iri na itoolu nke ochichi Nebukadneza, eze Babilon, Nebuzaradan, onyeisi ochiagha ndi na-eche nche biaara na Jerusalem.

O tinyere oku n’ulonso Yahweh, ulo onyeeze na ulo niile di na Jerusalem. Ndiagha Kaldia niile no n’okpuru ochiagha a were kutuo mgbidi niile gbara Jerusalem gburugburu.

Nebuzaradan onye ochiagha were bukoro ndi niile foro n’obodo na ndi mmadu niile na  ndi gbakwurula eze Babilon, buga ha dum na Babilon.

Mana ochiagha a hapuru ndi uwa na-atu n’onu ka ha na-aru oru n’ugbo.

ABUOMA NA AZIZA      Ps.137:1-2, 3, 4-5, 6.

Aziza: Ka ire m tapara n’onu m, O buru na echefuo m gi.

  1. N’akuku mmiri nke Babilon,

Ka anyi noduru ala bee akwa,

Mgbe anyi chetara Zayon.

Anyi kobere ubo akwara anyi,

N’elu osisi di n’akuku mmiri ahu. Aziza

2. Ebe ahu ka ndi dotara anyi n’agha,

Rioro n’aka anyi okwu-abu anyi,

Ndi lutara ihe anyi n’agha,

Gwara anyi ka anyi kweere ha,

Ufodu ukwe nke Zayon iji mee ha obi uto. Aziza

3. Mana olee out anyi ga-esi ekwe ukwe nke Onyenweanyi,

N’obodo ndi ogo mmuo?

O buru na-echefuo m gi O Jerusalem,

Ka aka nri m kponwuo! Aziza

4. Ka ire m tapara n’onu m,

Ma o buru na m echefuo gi,

O buru na anaghi m ewere Jerusalem

Dika ihe kacha enye m anuri! Aziza

MBEKU (Ps. 119:27)

Alleluia, Alleluia:

Mee ka nghota ihe iso uzo gi putara, ka m wee nwee ike ichighari oru itunanya gi n’obi m.

Alleluia.

Ozioma maka June 26, 2020, Fraidee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Matiu 8:1-4

Ihe Ogugu nke a si n’Ozioma di aso nke Matiu dere

Mgbe Jesu siri n’elu ugwu ahu ridata, oke igwe mmadu sooro ya; otu onye ekpenta biakwutere ya, sekpuru ala n’ihu ya rio ya si,

“Dinwenu, o buru na i choro, mee ka m di ocha.” Jesu setiri aka ya, metu ya aka si: “Achoro m; di ocha.” Ozigbo ahu, oria ekpenta ya wee laa.

Ma Jesu siri ya, “Hukwa na i gwaghi onye obula; gaba, gosi onye ukochukwu onwe gi, tuo mmamma dika Mosis nyere n’iwu, iji gosi ndi mmadu na ahu adila gi mma.”

IHE OGUGU UNYAHU: June 25, 2020, Toozdee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU ECHI:     June 27, 2020, Satoodee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Igbo Catholic Readings for June 26, 2020, Fraidee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Sonyere Anyi na Facebook @ Catholic Lectionary

error: Alert: Content is protected !!