Igbo Readings for June 27, 2020, Satoodee

Igbo Mass Readings for June 27, 2020, Satoodee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Nke a bu Igbo Mass Readings maka Satoodee, June 27, 2020, nke ndi Catholic Lectionary wetara unu.

Image of Igbo Mass Readings for June 27, 2020, Satoodee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume
Igbo Mass Readings for June 27, 2020, Satoodee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU NKE MBU      2:2, 10-14, 18-19.

Ihe Ogugu e wetara n’akwukwo Abuakwaariri (Lamentation)

N’emeghi ebere obula, Oseburuwa emebichaala ebe obibi niile nke Jekob. Na nukwu iwe ya o kwadachaala ebe niile e wusiri ike nke ada Juda.

Omenyela alaeze ya na ndi ochichi ya ihere. Ndi okenye ada Zayon no odu n’ala nkiti mechie onu. Ha awuola ntu n’isi ha yinyekwa akwa iru uju.

Umuagbogho Jerusalem ekpudola ihu n’ala. Ebekpochaala m anya n’akwa; Mkpuruobi m no n’ogbaghara. Uru agbawaala m obi n’ihi mkpochapu ndi nke m ya na maka umuntakiri m na maka ndi e ku n’aka na-ada mba n’okporo uzo nke obodo.

Ha na-ebere nne ha akwa nri na-asi: “kedu nri, kedu ihe onunu?” Ka ha na-ada mba n’okporo uzo nke nke obodo ahu dika ndi e meruru ahu, ha na-ekubi ume n’aka nne ha.

Ada Jerusalem kedu ihe m ga-agwa gi? Kedu ihe m ga-eji tunyere gi ada Zayon na-amaghi nwoke? Kedu ihe m ga-asi na i dika ya iji kasie gi obi?

Onya di gi n’ahu miri emi dika oke osimiri, onye ga-agwoli gi, onye nwekwara ike igwo gi? Ohu niile nke ndiamuma gi huuru gi bu ugha na nrafu.

Ha ekpugheghi mmehie gi iji weghachi gi n’onodu oma. Ohu ha huuru unu bu asi na okwu nduhie. Ada Zayon tigara Chineke mkpu akwa.

Ka anyammiri gin a-ezo ka mmiri ehihie na abali. Enyela onwe gi ezumike ekwela ka anya mmiri akwa gi kwusi igba.

Bilie, bee akwa n’uchichi na mbido nche niile nke abali. Mee  ka ihe di gi n’obi soputa n’ihu Oseburuwa dika mmiri si aso.

Chilierenu ya aka unu elu maka ndu umuntakiri unu ndi na-ada n’isi okporo uzo niile maka ihi aguu.

ABUOMA NA AZIZA      Ps. 74:1-2, 3-5, 6-67, 20-21.

Aziza: Onyenweanyi echezokwala ndu ndi nke gi.

  1. Chineke, gini mere I ji gbahapu anyi kpamkpam!

Gini mre iwe gi jiri di oku n’ebe igwe aturu i na-azu no?

Ka ha buru oke nke gi, ndi i zoputara

Ka ha buru oke nke gi n’ugwu Zayon a, ebe i biara ibi. Aziza

2. Bia jegharia n’ebe ihe ndi a e mebiri emebi di

Onyeiro emebiela ihe niile di n’ebe gi di aso,

Ha na-aba mba n’ebe ndi nke gi na-enwe ogbako.

Ha weere okoloto ha debe n’onuuzo ulonso gi,

Okoloto anyi na-ahubeghi mbu,

Ha ji anyike na-egbutusi ihe niile a piri api di n’ulonso,

Dika ndi na-egbutusi osisi n’ohia. Aziza

3. Ha ji anyike na nkupia na-akutusi ha

Ha gbara ulonso gi oku,

Meruokwa ebe obibi nke ahu gi. Aziza

4. Kwanyere ogbugbandu gi ugwu,

Ogba niile di n’ala juputara n’ogbaghara,

Ekwekwala ka ndi a na-emegbu emegbu laa n’ihere,

Kama mee  ka ndi ogbenye na ndi no na mkpa too aha gi. Aziza.

MBEKU (2 Tim 1:10)

Alleluia, Alleluia:

Onyenweanyi Jesu Kristi mebiri onwu, wetara anyi ndu, bia mee ka anwuanwu puta ihe site n’ozioma ahu.

Alleluia

Ozioma maka June 27, 2020, Satoodee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Matiu 8:5-17

Ihe Ogugu nke a si n’Ozioma di aso nke Matiu dere

Ka Jesu batara Kapanaum, otu onye ochiagha biakwutere ya rio ya si, “Onyenwe m, nwodibo m togboro n’ulo n’oke ahu mgbu, akuku ahu ya nwuru anwu.”

Jesu asi ya: “Aga m abia igwo ya”. Ma onye ochiagha ahu zara ya si, “Onyenwe m, etosighi m ka i bata n’ulo m, ma kwuo so okwu gi, nwodibo m ga-adi mma.

N’ihina mu onwe m bu onye no n’okpuru ike ochichi, enwekwara m ndiagha no n’okpuru m, ana m enye otu onye iwu ‘gaa’ o gaa, si onye nke ozo ‘bia’ o bia, m nyekwa nwodibo m iwu ‘mee otu a’ o mee ya.”

Nke a turu Jesu n’anya mgbe o nuru ya. O wee sin di na-eso uzo ya, “Nezie agwa m unu, ahubeghi m udi okwukwe di otu a obuladi n’Izrel.

Agwa m unu, otutu ga-esi n’owuwa anyanwu na n’odida anyanwu bia nonyere Abraham, Aizik na Jekob n’oche n’alaeze eluigwe,

ebe a ga-atunye umu nke alaeze na mbara kwuru itiri, ebe so ibe akwa na ita ikikere eze ga-adi” Jesu gwara ochiagha ahu si, “Laba! Ka e meere gi otu okwukwe gi si di”.

Ozigbo ahu, ahu diiri nwodibo ya mma. Mgbe Jesu batara n’ulo Pita, o huru ogonwaanyi Pita ka o dina n’ahu oku.

O meturu ya aka, ahu oku wee laa, o bilie lee Jesu obia. Na mgbede ahu, ndi mmadu kpotaara ya otutu ndi ajo mmuo ji, o ji okwu onu chupu mmuo ojoo niile ahu ma gwokwaa ndi oria niile.

Nke a bu iji mejuo ihe onye amuma Aizaya kwuru si, “O weghaara nrianria anyi niile burukwa oria anyi niile.”

IHE OGUGU UNYAHU: June 26, 2020, Fraidee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU ECHI:     June 28, 2020, Uka Nke Iri Na Ato N’oge Nkiti

Igbo Catholic Readings for June 27, 2020, Satoodee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Sonyere Anyi na Facebook @ Catholic Lectionary

error: Alert: Content is protected !!