Igbo Readings for June 30, 2020, Tuezdee Izu Nke Iri Na Ato N’oge Nkiti

Igbo Mass Readings for June 30, 2020, Tuezdee, Izu Nke Iri Na Ato N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Nke a bu Igbo Mass Readings maka June 30, 2020, Tuezdee, Izu Nke Iri Na Ato N’oge Na-Adanyeghi N’emume, nke ndi Catholic Lectionary wetara unu.

Image of Tuezdee, Izu Nke Iri Na Ato N’oge Na-Adanyeghi N’emume
Igbo Mass Readings for June 30, 2020, Tuezdee, Izu Nke Iri Na Ato N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU NKE MBU   3:1-8; 4:11-12

Ihe Ogugu e wetara n’akwukwo Onye Amuma Emos

Geenu nti umu Izrel n’okwu nke Chineke na-ekwu megide unu na ezinuulo ahu niile m kpoputara n’ala Ijipt: “Naani unu ka m hooro n’ime ezinuulo niile no n’elu uwa; ya mere m ga-eji taa unu ahuhu maka njo unu niile.

Mmadu abuo, ha nwere ike igako onu ma ha ebughi uzo kwekorita ime otu a? Odum o na-eti mkpu ike n’ime ohia ma o bughi anu oriri?

Nwa odum o na-ebigbo n’efu n’ogba ya ma o nweghi ihe o jidere? Nnunu o na-ama n’onya di n’ala ma o buru na e sighiri ya onya? Onya o na-akuchi ma o buru na o nweghi ihe o matara?

O bu na egwu anaghi atu ndi mmadu ma ha nu uda opiike n’ime obodo? Ihe ojoo o nwere ike mee obodo obula ma o sighi n’aka Chineke bia?

N’ezie, Oseburuwa  Chineke anaghi eme ihe obula ma o bughi uzo kpugheere umuodibo ya, ndiamuma atumatu ya.

Odum ebigboola kedu  onye na-agaghi atu ya egwu? Etikporo m otutu n’ime obodo unu dika m mere na Sodom na Gomora.

Unu dizi ka nku nke a guputara n’oku ma unu aloghachikwuteghi m,” Yahweh na-ekwu. Otu a ka m ga-esi mee gi o Izrel, ebe o bun a m ga-eme gi otu a, jikerekwa izute Chineke gi o Izrel.

ABUOMA NA AZIZA     Ps. 5:3, 4-5, 6-7.

Aziza: Onyenweanyi dube m n’uzo eziokwu gi.

  1. O bu gi ka m na-ario, Oseburuwa,

I bughi Chineke nke ajoomume na-amasi;

I naghi anabata ndi ajo mmadu n’ulo gi,

Ndi na-anya isi anaghi akwudosi ike n’ihu gi. Aziza

2. I na-akpo ndi ajo mmadu niili asi,

Na-ekpochapu ndi ugha,

Onyenweanyi na-akpo ndi na-egbu mmadu,

Na ndi aghugho asi. Aziza

3. Ma site n’ihunanya gi bara uba,

Mee  ka m bata n’ulo gi,

Mee  ka hulata isi m,

N’ime ulonso gi, fee gi ofufe. Aziza

MBEKU (Ps. 147:2, 15)

Alleluia, Alleluia:

Jerusalem, toonu Chineke, okwu ya na-agazu uwa niile.

Alleluia.

Ozioma maka June 30, 2020, Tuezdee, Izu Nke Iri Na Ato N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Matiu 8:23-27

Ihe Ogugu nke a si n’Ozioma di aso nke Matiu dere

Mgbe Jesu banyere n’ugbommiri, ndi na-eso uzo ya sooro ya. Oke ebili mmiri malitere n’osimmiri ahu, nke mere ka ugbo ahu choba imikpu, ma Jesu no n’ura.

Ha wee gaa, kpotee ya si, “Zoputa anyi Onyenweanyi, anyi na-ala n’iyi”. Jesu gwara ha si, “Gini mere unu ji atu egwu, unu ndi obere okwukwe?

Mgbe ahu, Jesu biliri, baara ifufe na osimmiri ahu mba, ebe niile dara juu. Ihe a turu ndi mmadu niile no ebe ahu n’anya ha wee na-asi,

“Kedu udi onye di nke a, obuladi ifufe na oke osimmiri na-erubere ya isi?”

IHE OGUGU UNYAHU: June 29, 2020, Emume Pita na Pol di Aso

IHE OGUGU ECHI:   July 1, 2020, Wednezdee Izu Nke Iri Na Ato N’oge Nkiti

Igbo catholic Readings for June 30, 2020, Tuezdee, Izu Nke Iri Na Ato N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Sonyere Anyi na Facebook @ Catholic Lectionary

error: Alert: Content is protected !!