Igbo Mass Readings October 1, 2020, Marịa Dị Ngọzi Ezenwaanyị Naịjirịa

Igbo Mass Readings for October 1, 2020, Ncheta Mgbe Naịjirịa Nweere Onwe Ya, Marịa Dị Ngọzi Ezenwaanyị Naịjirịa.

Igbo Mass Readings October 1, 2020, Marịa Dị Ngọzi Ezenwaanyị Naịjirịa
Igbo Mass Readings October 1, 2020, Marịa Dị Ngọzi Ezenwaanyị Naịjirịa

Ihe Ọgụgụ nke Mbụ          7:1-5,8-11, 16

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Abụọ Nke Samuel

Isi Okwu: Chineke ga-enye ya ocheeze nke nna nna ya Devid.

Mgbe Devid kwabara n’ụlọ ya, Dinwenụ mere ka ume na obi ruo ya ala. O wee zuoro ndị iro niile gbara ya gburugburu ike.

Mgbe ahụ ka eze gwara onye amụma Netan sị: “Lee, ebi m n’ụlọ sịda! Ma igbe ọgbụgba ndụ  nke Chineke bi n’ime mkpuke!”

Netan gwara eze sị: “Ngwa, gaa mee ihe ị bu n’obi, n’ihi na Onyenweanyị nọnyere Gị.”

Ma, n’abalị ahụ, ka okwu Dinwenụ bịakwutere Netan sị: “Gaa gwa nwodibo M Devid sị: “Lee ihe Dinwenụ kwuru: “Ọ bụ gị ga-ewuru M ụlọ M ga-ebi?

Ọ bụ n’ebe ị na-esogharị atụrụ, n’ebe atụrụ na-ata ahịhịa, ka M si kpọpụta gị, ka ị bụrụ onye ndu ndị nke M bụ Izrel.

Anọnyere M gị na nje m gị niile; Egbupịala M ndị iro gị niile n’ihu gị. Aga M eme ka aha gị daa ụda karịa nke onye ọ bụla dị n’elu ụwa.

Aga  M edoziri ndị nke M, Izrel, ebe ha ga-anọ.

N’ebe ahụ ka M ga-akụnye ha; ha ga-ebiri n’ebe ahụ n’enweghị nsogbu ọ bụla ọzọ. Ndị ajọ mmadụ agaghị akpagbukwa ha ọzọ,

otu e si kpagbuo ha na mbụ, mgbe M họpụtara ndị ikpe na-elekọta ndị nke M, Izrel. Aga m eme ka ha zuoro ndị iro ha niile ike.

Onyenweanyị ga-eme ka ị bụrụ onye a ma ama. Onyenweanyị ga-eji aka Ya e wuru gị obi.

Obi gị na ịbụ eze nke gị ga-akwụrụ chịm n’ihu M mgbe niile. Oche-eze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighi ebi.

Abụọma na Azịza ya:       Ps. I Sam 2:1, 4-8

Azịza: Mkpụrụobi m na-añụrị na Chukwu onye nzọpụta m.

  1. Mkpụrụobi m na-añụrị na Dinwenụ. Ike m lara elu na Chineke m. Ọnụ m achịgbuola ndị iro m n’ọchị, n’ihi na ana m añụrị n’enyemaka nzọpụta Gị. Azịza.

2. Ụta dikeọgụ ka  a ggajiri, mana ndị na-ejighi ume na obi, bụzi ndị ike ha dị egwu. Ọgaranya jizi isi onwe ya na-agbanwota nri ọnụ; ma ogbenye ọnụ ntụ akwụsịla idọlịgbu onwe ya. Nwaanyị aga amụọla ụmụ mmaji asaa; ma nne mụrụ ọtụtụ ụmụ gbazi aka nwa. Azịza.

3. Onyenweanyịna-enye ọnwụ na ndụ. Ọ bụ Ya na-akwada ndị na-ala mmụọ, bụkwa Ya  na-ekulite ndị nkulite. Onyenweanyị na-enye ụbịam na ụba. Ya kwaturu onye nọ n’ala. Ya bugooro onye nọ n’elu. Azịza.

4. Dinwenụ na-esi na ntụ kulite onye ụbịam, bịakwa si n’ọbụ bugoo onye nọ na mkpa; ka O nye ha ọnọdụ n’ebe e nyere ndị eze; bịakwa nye ha oche dị ebube. Azịza.

Ihe Ọgụgụ nke Abụọ        4:25-32

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara Ndị Efesọs

Isi Okwu: Wepụnụ ajọ omume niile dị n’etiti ụnụ

Site ugbu a gawa, hapụnụ okwu ụgha! Na-agwanụ ibe ụnụ naanị eziokwu, n’ihina onye ọ bụla bụ akụkụ ahụ onye nke ọzọ.

Ọ bụrụgodu na a kpasuru gị iwe, a dabakwala na njọ. E kwekwala ka ị bugide iwe n’obi ruo mgbe anyanwụ dara, ka ị ghara inye ekwensu ebe ọ ga-azodo ụkwụ.

Ka onye na-ezubu ohi kwusị izu ohi. Kama ya jisie ike chọta aka ọrụ , ọ ga-eji rụpụta ihe bara uru, iji nyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka.

Onye ekwekwala ka okwu rụrụ arụ si ya n’ọnụ pụta. Ka onye ọ bụla kwube okwu ga-enyere ndị ọzọ aka, mgbe ọ bụla ohere dapụtara; okwu ga-abara ndị nụrụ ya uru.

Ma ọ bụghị otu ahụ, ọ bụ naanị iwe ka ụnụ na-akpasu Mmụọ Nsọ Chineke, Onye jiri ihe ịrịba-ama Ya kaa ụnụ akara, a ga-eji azọpụta ụnụ, mgbe ụbọchị ahụ bịara.

Ụnụ eburula ndị ọzọ iro n’obi, ma ọ bụ wee iwe, ma ọ bụ gbọja onye ọ bụla, ma ọ bụ kọọ onye ọ bụla ọnụ, ma ọ bụ leda onye ọ bụla anya n’ụdị ọ bụla. Hụnụ ibe ụnụ n’anya.

Werenụ amara ghagharanụ ibe ụnụ, otu Chineke si were amara gbaghara ụnụ n’ime Kristi.

Igbo Mass Readings for October 1, 2020, Ncheta Mgbe Naịjirịa Nweere Onwe Ya, Marịa Dị Ngọzi Ezenwaanyị Naịjirịa.

Alleluịa

Alleluịa, Alleluịa:

Ngọzi dịrị gị Marịa dị asọ, nwaanyị na-amaghị nwoke, onye tosiri nsọpụrụ dị elu. N’ihi na gị mụrụ Anyanwụ nke eziomume, Onye bụ Kristi Chineke anyị.

Alleluịa.

Oziọma maka October 1, 2020 – Luk 11:27-28

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Isi Okwu: Ngọzi dịrị ime mụrụ Gị

Mgbe Jesu na-ekwu okwu, otu nwaanyị siri n’igwe mmadụ ahụ welie olu ya sị: “Jesu! Ngọzi dịrị afọ ime nke mụrụ Gị, na onye nyere Gị ara ị ñụrụ!”

Ma Jesu zara sị: “Ma ngọzi ga-adịkwara ndị nụrụ okwu Chineke, bịakwa debe ya.”

Igbo Mass Readings for October 1, 2020, Ncheta Mgbe Naịjirịa Nweere Onwe Ya, Marịa Dị Ngọzi Ezenwaanyị Naịjirịa.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings for September 30, 2020, Wednezdee Izu Nke Iri Abụọ na Isii N’oge Na-Adanyeghị N’emume

IHE ỌGỤGỤ ECHI: Igbo Mass Readings for October 2, 2020, Emume Ncheta Mmụọ Ndịnche.

Sonyere anyị na Facebook na Catholic Igbo Lectionary

error: Alert: Content is protected !!