Igbo Readings for Sacred Heart, June 19, 2020, Obi Di Aso Nke Jesu

Igbo Mass Readings for Sacred Heart, June 19, 2020, Emume Obi Di Aso Nke Jesu

Nke a bu Igbo Mass Readings for Sacred Heart, maka June 19, 2020, Emume Obi Di Aso Nke Jesu, nke ndi Catholic Lectionary wetara unu.

Image of Igbo Readings for  Sacred Heart, June 19, 2020, Obi Di Aso Nke Jesu
Igbo Mass Readings for Sacred Heart, June 19, 2020, Emume Obi Di Aso Nke Jesu

IHE OGUGU NKE MBU                    7:6-11

Ihe Ogugu e wetara n’akwukwo Diuteronomi

Isi Okwu: Onyenweanyi hoputara unu ka unu buru ndi puru iche

Mosis gwara ndi mmadu: unu bi ndi nso, ndi Chineke weere nye onwe ya. O hoputara unu site n’agburu niile di n’uwa a, ka unu buru ndi ya puru iche.

O bughi n’ihi na unu di ukwuu n’onu ogugu karia ndi ozo, ka o ji hoputa unu, hu unu n’anya otu a; o bukwaghi n’ihi na unu dikarisiri nta!

Kama o bu naani n’ihi ihunanya Chineke nwere n’ebe unu no, na n’ihi imezukwa nkwa o kwere nna nna unu ha.

O bu nke a mere o ji naputa unu site n’onodu ibu ohu unu n’ala Ijipt, ebe fero ji aka ike ya na-achi unu.

Matanu nke oma na Chineke unu bu Chineke kwesiri ntukwasi obi onye na-edebezu nkwa ya mgbe niile, ihunanya ya na-adigidekwa nye ndi niile huru ya n’anya, ma na-edebezukwa ihe niile o nyere n’iwu.

Ma ndi niile kporo ya asi ka o ga-ata ahuhu, lakwaa ha n’iyi. O bu ya ga-akwu ha ugwo ha n’onwe ya.

N’ihi ya, hu na unu debezuru iwu na ukpuru iwu na ukpuru ndi a m na-enye unu taa.

ABUOMA NA AZIZA         Ps. 102:1-4, 6-8, 10. Az.17

Aziza: Ihunanya Onyenweanyi na-adigide bido na ndudugandu ruo na ndudugandu n’etiti ndi na-atu egwu ya.

1. Mpuru obi m, too Dinwenu. Ihe niile di n’ime m

Ga-etokwa aha nso ya. Too Dinwenu mkpuru obi m.

Echefukwala ngozi ya niile. Aziza

2. O bu ya na-agbaghara gi mmehie gi niile,

na-agwokwa gi oria gi niile

O na-azoputa ndu gi site n’ili

Na-ewere ihunanya ya na obi ebere ya

Na-ekpube gi dika okpu eze. Aziza

3. Dinwenu na-eme ka ikpe ziri ezi rute ndi a na-emegbu emegbu aka

Na-emekwa ka ndi di otu a nweta ihe ruuru ha.

O mere ka Mosis mata  uzo ya

Meekwa ka umu Izrel niile hu idi ike nke iru oru ebube ya. Aziza.

4. Dinwenu bu onye omiko na onye amara, o dighi ewe iwe osiiso

Obi ebere na ihunanya ya babigara uba oke

O dighi ata anyi ahuhu di ka anyi si kwesi inata ahuhu

O dikwaghi akwughachi anyi ihe ruuru anyi n’ihi mmehie. Aziza

IHE OGUGU NKE ABUO   4:7-16

Ihe Ogugu e wetara n’akwukwo ozi mbu nke Jon dere

Isi Okwu: Ihunanya si n’ebe Chineke no abia

Ndi enyi m, o kwesiri ka  anyi hurita onwe anyi n’anya n’ihi na ihunanya na-esi n’ebe Chineke no abia.

Ndi niile na-ahu ibe ha n’anya na-egosi na ha bu umu Chineke. Ha na-egosikwa na ha na-amata Chineke nke oma nke oma.

O buru na mmadu adighi ahu ibe ya n’anya o na-eziputa na o maghi onya Chineke bu, n’ihina Chineke bu ihunanya.

N’ihi na Chineke gosiri anyi idi ukwuu nke ihunanya ya site n’izite Okpara ya ka o wetara anyi ndu ebighi ebi site n’onwu o nwuru .

Site n’ihe a Chineke meere anyi, anyi na-ahu ihe a na-akpo ihu mmadu n’anya n’ezie.

O bughi na anyi buru uzo hu Chineke n’anya, kama o bu na Chineke n’onwe ya huru anyi n’anya zite Okpara ya ka o buru ihe ijuru ya obi n’ihi mmehie anyi.

Ndi enyi m, ebe o bu na Chineke si otu a hu anyi n’anya. O bu ezie na o nwebeghi mgbe o bula anyi ji anya anyi hu Chineke anya, ma o buru na anyi ahu ibe anyi n’anya,

Chineke na-ebi n’ime anyi. Ihunanya ya kwa na-eto eto n’ime anyi igosi anyi na o bi n’ime anyi. O tinyekwara Mmuo Nso ya n’ime anyi igosi anyi na o bi n’ime anyi, na anyi bikwa n’ime ya.

Karisia, anyi ejirila anya anyi hu Okpara ahu Chineke zitere. Ugbu a anyi na-akoro uwa niile na Chineke zitere Okpara ya ka o buru Onye nzoputa uwa.

Chineke bi n’ime onye obula kweere, na n’ime onye obula meghere onu ya kwuputa na Jesu bu Okpara Chineke. Onye di otu a bikwa n’ime Chineke.

Anyi maara na Chineke huru anyi n’anya n’ihi mmetuta ihunanya ya metutara anyi, na n’ihi na anyi kweere na ya mgbe o gwara anyi na o huru anyi  n’anya.

Chineke bu ihunanya. Onye o bula kwa na-ebi ndu ihunanya na-anogide n’ime Chineke. Chineke n’onwe ya na-ebinyekwara onye di otu a.

ALLELUIA

Alleluia, Alleluia:

Soronu uzo m, mutakwanu ihe site n’aka m. N’ihi na adi m nwayoo, burukwa onye di umeala n’obi.

Alleluia!

Ozioma maka June 19, 2020, Emume Obi Di Aso Nke Jesu – Matiu 11:25-30

Ihe Ogugu nke a si n’Ozioma di aso nke Matiu dere

Isi Okwu: A di m nwayoo na umeala n’obi

Jesu kpere ekpere si: Nna, Onyenwe igwe na ala, ekelee m gi, n’ihi na I zonariri ndi okachamara eziokwu ahu, ma kpughee ya nye umuntakiri.

Ee, Nna, o toro gi uto ime ya n’uzo di otu a.

“Nna m enyefeela m ihe niile n’aka. O dighi onye maara Okpara ahu ma o bughi Nna ya.

O dikwaghi onye maara Nna karia Okpara ahu na ndi Okpara ahu kwadoro igosi Nna ya.

Biakwutenu m unu niile ndi ike gwuru ibu ibu aro e bokwasiri unu. Aga m enyekwa unu izuike.

Soronu uzo m, mutakwanu ihe site n’aka m. N’ihi na adi m nwayoo, burukwa onye di umeala n’obi.

Unu ga-achotakwara obi unu izuike. N’ihi na uzo m di mfe, ibu m ga-ebokwasikwa unu adighi aro.

IHE OGUGU UNYAHU: June 18, 2020, Toozdee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU ECHI:   June 20, 2020, Emume Obi Maria N’Ebughi Njo

  June 20, 2020, Satoodee, Izu Nke Iri Na Otu N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Igbo Catholic Readings for June 19, 2020, Emume Obi Di Aso Nke Jesu

Sonyere Anyi na Facebook @ Catholic Lectionary

error: Alert: Content is protected !!