Igbo Readings for September 22, 2020, Tuezdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise

Igbo Mass Readings for September 22, 2020, Tuezdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise N’oge Nkịtị

Nke a bu Igbo Mass Readings maka September 22, 2020, Tuezdee Izu Nke Iri Abụọ na Anọ N’oge Na-Adanyeghị N’emume nke ndị Catholic Lectionary wetara ụnụ.

Bible Quotations for Igbo readings for September 22, Tuezdee Izu Nke Iri Abụọ na Anọ N’oge Nkịtị
Igbo Readings maka Tuezdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise N’oge Nkịtị

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ          21:1-6, 10-13.

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ilu

Obieze bụ iyi n’aka Chineke, ọ na-achịgharị ya ebe ọ sọrọ ya. Ụzọ ọbụla nke mmadụ dị yam ma, mana Chineke na-eleba anya n’echiche obi onye ọbụla.

Ime eziomume na ikpe ikpe nkwụmọtọ ka mma karịa aja n’ihu Chineke. Anya mpako, obi ngala na ọrụ ọjọọ bu njọ. Izuzu onye ma ihe na-eduba n’inwe ihe n’uju, mana onye ọbụla ọ dị ọsọọsọ na-anọ n’ụkọ ihe.

Isi n’ụzọ asị nweta akụ bụ mmiri na-efesa n’ikuku bụrụkwa ọnya nke ọnwụ. Mkpụrụobi ndị ọjọọ na-achọ ihe ọjọọ; agbataobi ha anaghị ahụ ebere ọbụla n’anya ha.

Mgbe a tara onye na-akparị ibe ya ahụhụ  onye umeala amara ihe, e nye onye ma ihe ndụmọdụ ọ mụta. Onye eziomume na-eji anya ahụ ihe ọjọọ na-emebi ndị ajọomume; a ga-eme ka ndị ajọomume laa n’iyi.

Onye kpọchiri ntị ya jụ ịnụ akwa nwa ogbenye o nweghị onye ga-ege ya ntị ụbọchị ọ ga-ebe nke ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA:              Ps. 119:1, 27, 30, 34, 35, 44.

Azịza: Onyenweanyị dube m n’ụzọ iwu gị.

  1. Ngọzi dịrị ndị omume ha kwụ ọtọ,

Na-eso iwu nke Onyenweanyị. Azịza

2. Mee  ka m ghọta ihe iso ụzọ gị pụtara

Ka m wee nwee ike ịchịgharị ọrụ ịtụnanya gị n’obi m. Azịza.

3. Ahọrọla m ịkwụdosike

atụkwasịrị m obi n’iwu gị. Azịza

https://www.catholiclectionary.com/product/igbo-lectionary-for-sunday-readings/

4. Nye m nghọta ka m wee mata iwu gị

Wee nwee ike iji obi m niile dobe iwu gị. Azịza.

5. Dube m n’ụzọ iwu gị

N’ihina ọ bụ ihe na-atọ obi m ụtọ. Azịza.

Aga m na-edobe iwu gị mgbe niile.

Ebeebe ebeebe. Azịza.

MBEKU       Jemis 1:18

Alleluịa, Alleluịa:

Chineke jiri okwu nke eziokwu ahụ mee  ka anyị pụta iche. Meekwa ka anyị bụrụ ụdị mkpụrụ mbụ nke ihe o kere eke.

Alleluịa.

Oziọma   maka September 22, 2020, Tuezdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise N’oge Nkịtị   – Luk  8:19-21

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Nne Jesu na ụmụnne ya bịakwutere ya, ma ha enweghị ike ịbịarute ya nso n’ihi igwe mmadụ ahụ. Ma a gwara ya sị, ‘Nne gị na ụmụ gị guzo n’ezi na-achọ ịhụ gị.’

Ma Ọ zara ha sị, “Nne m na ụmụnne m bụ ndị na-anụ okwu Chineke na-eme ya eme.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Emume Ncheta Matiu Dị Asọ, Onye Apostụl  

IHE ỌGỤGỤ ECHI:  Wednezdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise N’oge Nkịtị

Igbo Catholic Readings for September 22, 2020, Tuezdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise N’oge Nkịtị

Sonyere anyị na Facebook na Catholic Igbo Lectionary

error: Alert: Content is protected !!