Igbo Readings for September 25, 2020, Fraịdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise

Igbo Mass Readings for September 25, 2020, Fraịdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise N’oge Nkịtị

Nke a bu Igbo Mass Readings maka September 25, 2020, Fraịdee Izu Nke Iri Abụọ na Anọ N’oge Na-Adanyeghị N’emume nke ndị Catholic Lectionary wetara ụnụ.

Bible Quotations for Igbo readings for September 25, Fraịdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise N’oge Nkịtị
Igbo Readings maka Fraịdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise N’oge Nkịtị

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ                         3:1-11  

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ecclesiastes

Ihe ọbụla n’okpuru eluigwe nwere oge, e nwere oge maka ọrụ ọbụla. Oge ọmụmụ nwa na oge onwụ; oge ọkụkụ ihe ubi na oge owuwe ya; Oge igbu egbu na oge ọgwụgwọ, oge ntikpọ na oge mwulite.

Oge ibe akwa na oge ịchị ọchị; oge iru ụjụ na oge ịgba egwu; Oge ịtụfụ okwute ntụtụkọta okwute; mgbe e ji obiọma na mgbe e jịghị obiọma.

Mgbe e ji achọ ihe na e ji atụfụ, oge ndozi na oge ntufu. Oge ndọkwa na oge ndụkọta; oge ịgba nkịtị na oge ikwu okwu.

Oge ịhụnanya na oge ịkpọasị; oge ọgụ na oge udo. Kedụ uru onyeọrụ nwere na ndọlị ya? Ahụla m ọrụ nke Chineke nyere ụmụmmadụ ka ha na-arụ.

O meela ihe ọbụla ka ọ dị mma n’oge ya. Nke ọzọ, o meela ka mmadụ mata ihe bụ ebighịebi ma nke a emeghị ka mmadụ chọpụta ihe Chineke megorori site na mbido ruo na ngwụcha.

ABỤỌMA NA AZỊZA:              Ps. 114:1-2, 3-4.

 Azịza: Ngọzị dịrị Osebụrụwa, nkume m.

  1. Ngọzị dịrị Osebụrụwa nkume m

ọ bụ ya bụ ịhụnanya m na onye nkwado m

ụlọ mgbaba m na onye nzọpụta m

ọ  bụ na ya ka m na-ezo onwe m ekpeke m. Azịza.

https://www.catholiclectionary.com/product/electric-incense-burner-in-nigeria/

2. Osebụrụwa gịnị ka mmadụ bụ I ji na-eleta ya anya?

Nwa nke mmadụ nke I ji na-elekọta ya anya?

Ndụ mmadụ dịka otu nkume

ụbọchị ndụ ya niile dịkwa ka onyinyo. Azịza.

MBEKU I Thess. 2:13

Alleluịa, Alleluịa:

Naranụ ozi nke anyị wetaara ụnụ, ọ bụghị dịka okwu mmadụ kama dịka ihe Ọ bụ n’onwe ya okwu nke Chineke.

Alleluịa.

Oziọma  maka September 25, 2020, Fraịdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise N’oge Nkịtị  – Luk  9:18-22

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

O ruo mgbe Jesu nọ naanị ya na-ekpe ekpere, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya. Jesu jụọ ha sị, “Onye ka ndị mmadụ na-ekwu na m bụ?”

Ha zara ya sị, “Ụfọdụ na-ekwu na ị bụ Jọn onye na-eme mmirichukwu. Ụfọdụ na-asị na ị bụ Elaịja, ụfọdụ ndị ọzọ na-ekwukwa na out n’ime ndị amụma mgbe ochie esila n’ọnwụ bilie.”

O wee jụọ ha sị, “Ma onye ka ụnụ na-asị na m bụ?” Pita zara sị, “Ị bụ Kristi nke Chukwu.”

Ma Jesu dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka na ntị, nyesie ha iwu ike ka ha ghara ịkọrọ onye ọbụla ihe a, sị, “Nwa nke mmadụ ahụ ga-ata ọtụtụ ahụhụ.

Ndị okenye ndị Juu, na ndịisi nchụaja, na ndị odeakwụkwọ ga-ajụ ya. A ga-egbukwa ya, na n’ụbọchị nke atọ a ga-eme ka o si n’ọnwụ bilie.”

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: September 24, 2020, Tọọzdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise N’oge Nkịtị   

IHE ỌGỤGỤ ECHI:    September 26, 2020, Satọdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise N’oge Nkịtị

Igbo Catholic Readings for September 25, 2020, Fraịdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise N’oge Nkịtị

Sonyere anyị na Facebook na Catholic Igbo Lectionary

error: Alert: Content is protected !!