Igbo Readings Maka Omumu John, June 24, 2020, Omumu Jon

Igbo Readings Maka Omumu John, June 24, 2020, Emume Omumu Jon Omemmirichukwu

Nke a bu Igbo Mass Readings Maka Omumu John Vigil, June 24, 2020, Omumu Jon Omemmirichukwu, nke ndi Catholic Lectionary wetara unu.

Emume Omumu Jon Omemmirichukwu
Igbo Readings Maka Omumu John, June 24, 2020, Emume Omumu Jon Omemmirichukwu

IHE OGUGU NKE MBU         49:1-6

Ihe Ogugu e wetara n’akwukwo onye Amuma Aizaya

Geenu m nti. O, ala ndi di n’akuku mmiri, unu ndi bi ebe tereaka, geen u nti. Chineke hooro m site n’afo nne m, o kporo m aha tupu a muo m. O meela onu m o di nko ka mmagha.

O zoro m n’okpuru aka ya, o mere m ka m buru aku a piri nke oma; o na-echekwa m n’ime obo ya. O siri m, “I bu nwaodibo m, Izrel, onye m ga-esi na ya nweta otito.

Maka ekwuru m si, ataala m ahuhu lara n’iyi, emefuola m ike m n’ihe na-abaghi uru; mana ihe nketa m di na Oseburuwa. Ugwo oru m di na Chineke.

Ma ugbu a, Yahweh onye kpuru m n’ime afo nne m, ka m buru nwodibo ya, ka m kpoghachiri ya Jekob azu, ka m chikotara ya Izrel,

maka na enwere m nsopuru n’ihi ya, onye bu ike m, kwuru si, “O bughi naani na I bu nwodibo m ka I were kpolite agburu Jekob, kpoghachi umu Izrel ndi fodurunu;

Aga m eme gi ihe nke mba niile ka nzoputa were ruo na nsotu nke uwa.”

ABUOMA NA AZIZA        Ps. 139:1-3, 13-14, 14-15.

Aziza: Ana m  ekele gi maka ihe itunanya di n’okike I kere m

  1. Onyenweanyi I nyochaala m, marakwa m!

I ma mgbe m noduru ala na mgbe m kwu oto,

I na-ano ebe di anya mara ihe m bu n’uche,

I mazuru omume m niile,

Mgbe m na-aru oru mobu mgbe m na-ezu ike. Aziza

2. O bu gi kere mmuo m,

O bukwa gi kpuru m n’afo nne m,

Ana m ekele gi maka ihe omimi ndi a,

Makai he itunanya di n’okike I kere m,

Nakwa ihe ebube di n’aka oru gi niile. Aziza

3. I maara m nke oma!

I maara out okpukpu m niile siri di oge a na-akpu m na nzuzo,

Oge a na-ejikota m onu n’afo nne m. Aziza

IHE OGUGU NKE ABUO    13:22-26

Ihe Ogugu e wetara n’Oru Ndiozi

Pol kwuru si, mgbe  Chineke wepuru Sol na ochichi, O kpolitere Devid ka o buru eze ha, onye o gbaara akaebe si, ”Ahula m Devid nwa Jese dika udi mmadu m choro, onye ga-eme ihe niile bu uche m.

O bu site  n’umuumu nwoke a ka Chineke si wetara umu Izrel onye nzoputa dika o si kwee na nkwa. Tupu obibia ya, Jon ekwusaarala  ndi Izrel banyere mmirichukwu nke ncheghari.

Na ngwucha oru Jon, o kwuru si, “Onye ka unu chere na abu m? Abughi m onye ahu unu na-atu anya ya. Kama leenu! Out onye na esochi m n’azu, onye mu etorughi itopu eriri akpukpoukwu ya.

Umunne m ndi si na agburu Abraham, na  ndi niile na-atu egwu Chineke no n’etiti unu, O bu anyi niile ka Chineke ziteere ozi nzoputa nke a.

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Ma gi bu nwa, ka m ga-akpo onye amuma nke onye kacha elu; N’ihina I ga-aga n’ihu  Dinwenu idoziri ya uzo ya niile.

Alleluia.

Ozioma maka Omumu Jon Omemmirichukwu, June 24, 2020 – Luk 1:57-66, 80.

Ihe Ogugu nke si n”ozioma di aso nke Luk dere

Ugbu a, oge ruru mgbe Elizabet ga-eji muo nwa, o wee muo nwa nwoke. Mgbe ndi agbataobi na  ndi ikwu na ibe ya nuru na Dinwenu egosila ebere ya n’ebe o no, ha sooro ya nuria onu.

N’ubochi nke asato ha zukoro ibi nwata ahu ugwu, ha gaara akpo ya Zakaria, aha nna ya. Ma Elizabet zara si, “Mba; a ga-akpo ya Jon.”

Ha azaa ya si, “Onweghi onye obula n’ime ndi ikwu na ibe gin a-aza aha di otu a.” Ha meere nna ya akara ka ha mara aha o choro ka a kpoo nwa ya.

O wee rio ka enye ya ihe eji ede ede akwukwo. O dere, “Aha ya bu Jon.” Nke a turu ha niile n’anya . Ozigbo ahu onu ya meghere, ire ya toghepu, o bia kwube okwu, na-agozi Chineke.

Ujo turu ndi agbataobi ha niile. Ndi mmadu kwusara ihe ndi a n’obodo niile nke Judia; Ndi niile nuru ihe merenu chebaara ihe ndi a echiche, na-aji si, “Gini ka nwatakiri a ga-abu?”

N’ihina ike nke Dinwenu nonyere ya. Nwata ahu toro, bia dikwa ike na mmuo. O noro n’ime ozara ruo ubochi o putara ihe n’ihu umu Izrel.

IHE OGUGU UNYAHU: June 23, 2020, Tuezdee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Birth of John Vigil, June 23, 2020, Omumu Jon Omemmirichukwu

IHE OGUGU ECHI:     June 25, 2020, Toozdee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Igbo Readings Maka Omumu John, June 24, 2020, Emume Omumu Jon Omemmirichukwu

Sonyere Anyi na Facebook @ Catholic Lectionary

error: Alert: Content is protected !!