Igbo Readings for Ncheta Pita na Pol Di Aso, Vigil, June 28, 2020

Igbo Readings for Ncheta Pita na Pol Di Aso, Vigil, June 28, 2020, Emume Pita na Pol Di Aso

Nke a bu Igbo Mass Readings maka Pita na Pol, Ncheta Pita na Pol Vigil, June 28, 2020, Emume Ndinso Pita na Pol, nke ndi Catholic Lectionary wetara unu.

Image of Igbo Readings for Ncheta Pita na Pol Di Aso, Vigil, June 28, 2020
Igbo Readings for Ncheta Pita na Pol Di Aso, Vigil, June 28, 2020, Emume Pita na Pol Di Aso

IHE OGUGU NKE MBU          3:1-10

Ihe Ogugu e wetara n’Oru Ndiozi

Otu ubochi, Pita na Jon na-aga n’ulonso ikpe ekpere n’elekere nke ato n’ehihie bu oge ekpere. Ha huru otu nwoke dara ngworo site na nwata.

Ndi nwe nwoke a na-atogbochi ya kwa ubochi n’onuuzo ulo nso Chineke nke a na-akpo “Onuuzo mma” irio onyinye ebere n’aka ndi na-aba n’ime ulonso Chineke.

Mgbe o huru Pita na Jon ka ha na-acho ibanye n’ulonso Chineke o rioro ha ego. Ma Pita na Jon legidere ya anya, si ya, “Lee anyi anya!” O lee ha anya na-atu anya inata ihe n’aka ha.

Ma Pita siri ya, “Enweghi m olaocha na olaedo kama ihe m nwere ka m ga-enye gi; n’aha Jesu Kristi onye Nazaret, bilie gaa ije!”

O jidere ya n’aka nri kpulie ya elu, ozigbo ukwu ya abuo na ikpere ya sikwaa ike ozo. O wuliri elu, kwuru n’ukwu abuo, jegharia ije n’ebe ahu.

O sooro Pita na Jon na-aga ije na-awuli elu na-etokwa Chineke. Igwe mmadu ahu niile huru ya ka o na-aga ije, na-eto Chineke.

Mgbe ha matara na o bu onye ahu na anodu n’onuuzo mma, nke ulonso Chineke na-ario aririo, otu ihe a si mee gbara ha gharii jukwa ha anyanke ukwuu.

ABUOMA NA AZIZA       Ps. 19:2-3, 4-5.

Aziza: Mana olu ha na-agazu uwa niile.

  1. Eluigwe na-ekwuputa ebube Chineke,

Ihe niile di na mbara Eluigwe na-ekwuputa oru aka ya,

Ubochi niile na-ekwuputa ya

Abali obula na-egosiputa amamihe nke Chineke. Aziza

2. Ha anaghi ekwu okwu,

Nke ha na-eme uzu nke mmadu ga anu,

Mana olu ha na-agazu uwa niile,

Ozi ha na-eru nsotu uwa niile. Aziza

IHE OGUGU NKE ABUO         1:11-20

Ihe Ogugu e wetara n’akwukwoozi Pol degaara Ndi Galeshia

O ga-amasi m ime ka unu mata umunna m na ozioma nke m wetara unu abughi ozioma nke mmadu. Anataghi m ya site n’aka mmadu.

O dighikwa onye obula kuziri m ya, kama o ruru m aka site na mkpughe nke Jesu Kristi. Unu anula maka ndu ochie m n’usoro okpukpe ndi Juu na otu m si sogbuo nzuko nke Chineke, ma gbakwaa mbi imebi ya.

Agara m n’ihu na usoro okpukpe ndi Juu karia otutu ndi ogbo m n’etiti ndi nke m, omenaala nna anyi ha nukwara m oku n’obi karia.

Ma mgbe o masiri onye ahu hoputara m iche tupu a muo m, o kpokwara m site n’amara ya. O masiri ya ikpughere m Nwa ya, ka m wee kwusaa maka ya n’etiti ndi mba ozo.

O nweghi onye obula m jekwuuru maka ndumodu, nke m na-aga Jerusalem igakwuru ndi buru m uzo buru umuazu, kama agara m Arabia, e mechaa m laghachi Damaskos.

Ka afo ato gachara agara m Jerusalem ihu Pita (nke putara Sefas ma a sughria ya) ijuta ya ihe ufodu. Anonyekwaara m ya ubochi iri na ise.

O dighi onye ozo n’ime ndi umuazu m huru, ma obughi naani Jemis nwanne Dinwenu. (Ihe m na-edere unu bu eziokwu n’ihu Chineke, anaghi m atu asi).

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Onyenwe m, I mazuru ihe niile, I makwara na m huru gi n’anya.

Alleluia.

Ozioma maka June 28 , 2020, Ncheabali nke Ncheta Pita na Pol Di Aso – Jon   21:15-19

Ihe Ogugu nke si n’Ozioma di aso nke Jon dere

Mgbe ha richara nri ututu nke a, Jesu ajuo Saimon Pita si, “Saimon nwa Jon, I huru m n’anya karia ndi a niile?” Pita azaa Jesu si, “Ee, Onyenwe m, I mana ahuru m gi n’anya.”

Jesu asi ya, “Zuba aturu m nri.” Jesu juru ya nke ugboro abuosi, “Saimon nwa Jon, I huru m n’anya?” Pita azaa ya si, “Ee Onyenwe m, I ma na-ahuru m gi n’anya”.

Jesu agwa ya si, “Chekwaba aturu m” Jesu jukwara ya nke ugboro ato si, “Saimon nwa Jon, I huru m n’anya?” O wutere Pita na o juru ya nke ugboro ato si, “I huru m n’anya.”

Pita asi ya, “Onyenwe m. I mazuru ihe niile, I makwa na m huru gi n’anya.” Jesu  asi ya, “Zuba aturu m nri. Ka m gwa gi eziokwu;

Mgbe i bu nwata, I na-eke aji n’ukwu, na-ejeghari ebe obula I choro. Ma mgbe I ghoro agadi, I ga-amati aka gi, onye ozo amanye gi udo kpuru gi gaa ebe i na-achoghi iga.

(Jesu kwuru nke a iji gosi udi onwu Pita ga-anwu, iji nye Chukwu otito). Mgbe o kwuchara nke a O siri Pita, “Sobe m.”

IHE OGUGU UNYAHU: June 27, 2020, Satoodee Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU ECHI:     June 29, 2020, Emume Pita na Pol di Aso

Igbo Readings for Ncheta Ndinso Pita na Pol Vigil, June 28, 2020, Emume Ncheta Pita na Pol Di Aso

Sonyere Anyi na Facebook @ Catholic Lectionary

error: Alert: Content is protected !!