Igbo Mass Readings October 5 2020 Mọnde Izu Iri Abụọ na Asaa Oge Nkiti

Igbo Mass Readings October 5 2020 Mọnde Izu Nke Iri Abụọ na Asaa n’oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 5 2020 Mọnde Izu Nke Iri Abụọ na Asaa n'oge Adanyeghị n'Emume
Igbo Mass Readings October 5 2020 Mọnde Izu Nke Iri Abụọ na Asaa n’oge Adanyeghị n’Emume

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ              1:6-12

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Pọl degaara ndị Galeshịa

Ọ gbagwojuru m anya na ụnụ ji ọsọọsọ na-ahapụ onye kpọrọ ụnụ site n’amara nke Kristi na-agbaso oziọma ọzọ.

Ọ bụghị na oziọma ọzọ dị, kama o nwere ụfọdụ ndị mmadụ na-enye ụnụ nsogbu na-achọkwa ịgbanwe oziọma nke Kristi.

Ma ọ bụrụgodu na anyị onwe anyị mọbụ mmụọọma si n’eluigwe bịa, zie ụnụ oziọma ọzọ dị iche na nke anyị kuziere ụnụ, ya bụrụ onye a bụrụ ọnụ.

Dịka anyị kwuru na mbụ, ana m ekwukwa ya ọzọ, ọ bụrụ na onye ọbụla na-akụziri ụnụ oziọma ọzọ nke abụghị oziọma ahụ ụnụ natara na mbụ, ya bụrụ onye abụrụ ọnụ.

Ihe m na-achọ ugbu a ọ bụ nkwado mmadụ ka ọ bụ nke Chineke? Ka ana m achọ ime ihe na-amasị ndị mmadụ?  

Ọ bụrụ na m ka na-eme ihe na-amasị ndị mmadụ agaghị m abụ nwodibo Kristi. Ọ ga-amasị m ime ka ụnụ mata, ụmụnna m, na oziọma nke m wetaara ụnụ abụghị oziọma nke mmadụ.

Anataghị m ya site n’aka mmadụ. Ọ dịghịkwa onye ọbụla kuziiri m ya, kama o ruru m aka site na mkpughe nke Jesu Kristi.

ABỤỌMA NA AZỊZA:  Ps. 111:1-2, 7-8, 9, 10

Azịza:  Onyenweanyị ga-echeta ọgbụgbandụ ya ebeebe ebeebe.

  1. Eji m obi m niile enye Onyenwenayị ekele

n’ọgbakọ ndị eziomume

Ọrụ Onyenweanyị niile dị ịtụnanya.

ndị niile ọ na-amasị kwesịrị ilekwasa ya anya. Azịza.

2. Ihe niile ọ na-eme bụ n’ịkwụdosiike na n’ikpe nkwụmọtọ,

Iwu ya dị ntụkwasịobi n’ụzọ niile

Nke a mere ka ọ dị ebeebe ebeebe

Nke dị n’ụdị ịkwụdosiike na ugwu. Azịza.

3. Ọ na-abịa ịgbapụta ndị nke ya ọsọọsọ

Na-enye ọgbụgbandụ ya otu mgbe

Aha ya dị nsọ kwesị na anyị ga-atụrụ ya egwu.

A ga-ekwe ukwe otito ya ebeebe. Azịza.

MBEKU      –   Jọn 14:23

Alleluịa, Alleluịa:

Ọ bụrụ na mmadụ ahụ m n’anya, Ọ ga-edobe okwu m Nna m ga-ahụ ya n’anya. Anyị ga-abịakwute ya, biri n’ime ya.

Alleluịa.

Oziọma maka October 5, 2020 – Luk 10:25-37

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Otu onye ọkaiwu biliri ịnwale Jesu wee jụọ ya sị, “Onyenkuzi, gịnị ka m ga-eme wee keta ndụ ebighịebi?”

Jesu jụghachiri ya, “Gịnị ka e dere n’iwu? Ọ bụ gịnị ka ị gụtara nay a?” O wee zaa sị, “Ị ga-eji obi gị niile, na mmụọ gị niile, na ike gị niile, na uche gị niile hụ Dinwenụ Chineke gị n’anya, hụkwa onye agbataobi gị n’anya ka ị siri hụ onwe gị n’anya.”

Jesu sịrị, “Ị zara nke ọma. Mee nke a, ị ga-adị ndụ.” Ka ọ na-achọsi ike ịgụnye onwe ya dịka onye eziomume, ọ jụrụ Jesu sị, “Onye bụkwanụ onye agbataobi m?”

Jesu zaghachiri ya sị, “Otu nwoke si na Jerusalem na-aga Jeriko. Ọ dabara n’aka ndị ohi, ndị gbara ya ọtọ, tikwaa ya ihe, wee hapụ ya ọ dị ndụ ọnwụ ka mma, gbalaga.

E mechaa, otu onye ụkọchukwu si n’otu ụzọ ahụ na-agafe. Mgbe ọ hụrụ nwoke ahụ, o siri n’akụkụ nke ọzọ gafee.

Otu aka ahụ, mgbe otu onye agbụrụ Levaị bịaruru ebe ahụ, ọ hụkwara nwoke ahụ, si n’akụkụ nke ọzọ gafere.

Ma otu onye Sameria, ka ọ na-aga njem, bịaruru n’ebe nwoke ahụ tọgbọrọ. Mgbe ọ hụrụ ya, o meere ya ebere.

O wee jekwuru ya, kechie ọnya ya, bịa wụkwasakwa ya mmanụ na mmanya. O kukwasara ya n’ịnyịnyaibu ya, kpọba ya n’ụlọ ndị ọbịa, wee leta ya anya nke ọma.”

N’echi ya, onye Sameria ọma ahụ nyere onye na-elekọta ụlọ ndị ọbịa ahụ ego ọlaọcha abụọ sị, “Biko lezie nwoke a anya nke ọma.

Ihe ọ bụla I mefuru n’elu nke a m nyere gị, mgbe m lọghachiri aga m akwụghachi gị.” Jesu wee jụọ onye ọkaiwu ahụ sị, “onye n’ime mmadụ atọ ndị a ka I chere gosiri onwe ya onye agbataobi nwoke ahụ nke dabara n’aka ndị ohi?”

Ọ zara sị “Onye ahụ nke meere ya ebere.” Jesu agwa ya sị, :Gaa ka I mee otu ahụ.”

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings October 4, 2020, Ụka nke Iri Abụọ na Asaa n’oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ ECHI: Igbo Mass Readings October 6 2020 Tuezde Izu Nke Iri Abụọ na Asaa n’oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings October 5 2020 Mọnde Izu Iri Abụọ na Asaa n’oge Adanyeghị n’Emume.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings

error: Alert: Content is protected !!