Igbo Readings for September 26, 2020, Satọdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise

Igbo Mass Readings for September 26, 2020, Satọdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise N’oge Nkịtị

Nke a bu Igbo Mass Readings maka September 26, 2020, Satọdee Izu Nke Iri Abụọ na Anọ N’oge Na-Adanyeghị N’emume nke ndị Catholic Lectionary wetara ụnụ.

Bible Quotations for Igbo readings for September 25, Satọdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise N’oge Nkịtị
Igbo Readings maka Satọdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise N’oge Nkịtị

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ                         11:9-12:8  

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ecclesiastes

Nwaokorobịa nwee ọñụ mgbe ị ka nọ n’okorobịa, ka obi gị nye gị ọñụ n’ụbọchị niile nke okorobịa gị, soo ụzọ na-amasị gị n’anya gị, ma matakwa na ihe niile ndị a ka Chineke ga-eji kpee gị ikpe.

Wepụ iwe n’obi gị, wepụkwa ihe mgbu n’ahụ gị, n’ihina okorobịa na chi ọbụbọ nke ndụ bụ ihe efu. Chetakwa onyeokike gị mgbe ịdị n’okorobịa tupu ụbọchị ọjọọ ahụ na afọ ndị ahụ abịa, mgbe ị ga-ekwu sị,

“Ihe ndị a anaghịkwa atọ m ụtọ,” tupu anyanwụ, ihe, ọnwa na kpakpando agbaa ọchịchịrị, urukpu alọghachi mgbe mmiri zochara.

N’ụbọchị ahụ mgbe ndịnche ụlọ ga-ama jijiji, mgbe ndị bụ dimkpa ga-ehulata onwe ha, mgbe ndị na-egwu ihe ga-akwụsị n’ihina ha dịzi olemaole.

Ndị si na mpịoikuku elepụ anya agaghịzikwa ahụ ụzọ, mgbe ụzọ niile e si abanye n’ogologo ọnụụzọ ama ga-emechi, mgbe ụzụ igwe e ji akwọ ihe ga-adalata.

Mgbe olu nnụnụ ga-akpọlite ndị mmadụ, ma ụmụada na-ekwe ukwe ga-ada mba. Ihe dị elu ga na-atụzi ndị mmadụ egwu, ihe egwu ga-adịkwa n’ụzọ; osisi almọnd ga-ama ifuru, ike ga agwụ ụkpana, agụụ ihe ọbụla ga-akwụsịkwa n’ihina mmadụ agawala n’ụlọ ebeebe ya.

Ndị na-eru uru na-agagharịzi n’ụlọ; cheta ya mgbe e gbubibeghị ụdọ ọlaọcha ahụ mọbụ tiwaa ọkụ ọlaedo, mgbe a kwụwabeghị ite n’isi iyi mọbụ mgbe a dọbibeghị ụdọ e ji ese mmiri n’ụmị.

Ntụ alaghachi n’ala otu ọ dị mbụ, mmụọ alaghachikwuru Chineke onye nyere ya. Ihe efu ka ihe efu, onyenkuzi okwu Chineke kwuru nke a, ihe niile bụ ihe efu.

ABỤỌMA NA AZỊZA:              Ps. 90:3-4, 5- 12-13, 14,17.

 Azịza:  Onyenweanyị bido ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ ị bụ ebe nchedo m.

1. Ị  na-akpọghachi mmadụ na ntụ site n’ịgwa ya sị

laghachinụ ebe ụnụ si, ụmụ mmadụ

n’anya gị puku afọ dịka otu ụbọchị

Dịka ụnyahụ nke gaferelanụ

mọbụ otu nche abalị. Azịza.

https://www.catholiclectionary.com/product/electric-incense-burner-in-nigeria/

2. Ị  zachapụla mmadụ site na nrọ;

Ha dịka ahịhịa na epulite n’ụtụtụ

mịa ifuru ma kpọnwụọ n’oge mgbede. Azịza.

3.Kuziere anyị ịmata ka ndụ anyị siri dị nkenke

Ka anyị were si otu a bụrụ ndị maara ihe.

Onyenweanyị medoo obi, iwe gị ọ ga-adị ọkpụ?

Meere ụmụodibo gị ebere. Azịza.

4.Ka ịhụnanya gị jupụta n’ime anyị ụtụtụ ọbụla,

Ka anyị were nwee ike ikwe ukwe

Ma nweekwa añụrị ụbọchị niile nke ndụ anyị.

Mee ka ịdịụtọ gị nọnyere anyị O Onyenweanyị

Iji were kwado ọrụ nke anyị rụrụ.

Ma meekwa ka anyị nwee ọhaniihu n’ihe niile anyị na-eme. Azịza.

MBEKU          Eph 1:17-18

Alleluịa, Alleluịa:

Ka Chineke nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi meghee anya nke obi ụnụ ka ụnụ wee mata ihe bụ nchekwube nke ọkpụkpọ ọ kpọrọ ụnụ.

Alleluịa.

Oziọma  maka September 26, 2020, Satọdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise N’oge Nkịtị – Luk  9:43-45   

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Ma ka ndị na-eso ụzọ ya nọ na-eche gbasara ọrụ ịtụnanya Ọ rụrụ, Jesu gwara ha sị, “Ka okwu ndị a baa ụnụ n’ime ntị: N’ihina a ga-arara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmadụ.”

Ma ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị okwu a, e zonarịrị ha ya, ka ha ghara ịghọta ya, egwu jikwa ha ịjụ ya maka okwu a.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: September 25, 2020, Fraịdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise N’oge Nkịtị

IHE ỌGỤGỤ ECHI:     

Igbo Lectionary Readings for September 26, 2020, Satọdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise N’oge Nkịtị

Sonyere anyị na Facebook na Catholic Igbo Lectionary

error: Alert: Content is protected !!