Igbo Readings for September 30, 2020, Wednezdee Izu Nke Iri Abụọ na Isii

Igbo Mass Readings for September 30, 2020, Wednezdee Izu Nke Iri Abụọ na Isii N’oge Na-Adanyeghị N’emume – Afọ nke Mbụ

Igbo Readings for  September 30, 2020, Wednezdee Izu Nke Iri Abụọ na Isii
Igbo Mass Readings for Wednezdee Izu Nke Iri Abụọ na Isii

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ              9:1-12, 14-16

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ nke Job

Job zara sị: “N’eziokwu ama m na ọ dị otu a, ma olee otu mmadụ ga-esi dịzu mma n’ihu Chineke?

Ọ bụrụ na mmadụ achọọ ka ya na ya gbaghaa okwu, onye ahụ apụghị ịza ya otu ugboro n’ime otu puku.

Ọ maara ihe, ike ya dị ebube, olee onye kpọchiri obi n’ebe ọ nọ ma nwee mmeri? Onye nke na-akwagharị ụwa n’ọnọdụ ya, ma mee  ka ide ya niile ma jijiji.

Onye na-etiri anyanwụ iwu, ọ hapụ ịwa, onye nke kpuchiri kpakpando ga. Onye ọ bụ naanị ya setịpụrụ eluigwe ma zọgidekwa ebilimmiri ụkwụ.

Onye nke mebere Bea na Ọrion, Plaịdes na ụlọ ọgbakọ nke ndịda. Onye na-eme nnukwu ihe nke karịrị nghọta na ihe dị ịtụnanya enweghị ịgụta ọnụ.

Lee, ọ na-esi n’ebe m nọ agafe, ma anaghị m ahụ ya. Ọ narịị agakwa ma amataghị m ya. Lee ọ na-apụnarị ihe n’ike, onye pụrụ igbochi ya?

Onye ga-ajụ ya: “Gịnị ka ị na-eme ihe a?” Kedụ ka m ga-esi zaghachi ya, ma kpachapụkwa anya n’okwu m?

Ọ bụ ezie na aka m dị ọcha ma apụghị m ịza ya okwu.S Aga m arịọ ebere n’aka onye na-ebo m ebubo. Ọ bụrụ na m kpọkuo ya, ọ zam, agaghị m ekwere na ọ na-ege m ntị n’olu.

ABỤỌMA NA AZỊZA: Ps. 88:10-11, 12-13, 14-15

Azịza: Onyenweanyị mee  ka ekpere m ruo gị ntị

  1. Ana m akpọku gị ụbọchị niile O Onyenweanyị

agbasapụrụla m gị aka m.

Ọrụ ebube gị niile ọ bụ maka ndị nwụrụ anwụ?

Mmụọ ha ọ ga-esi n’ili kulie too gị? Azịza.

2. Onye na-ekwupụta ịhụnanya gị n’ime ili

Mọbụ ntụkwasịobi gị n’ala mmụọ?

Ndị nọ n’ime ili ha na-anụ maka ọrụ ebube gị niile

ndị e chezọrọ echezọ ha na-anụ maka eziomume? Azịza.

3. Mana anọ m ebe a na-arịọ enyemaka gị

O Onyenweanyị na-ekpere m ụtụtụ niile!

Gịnị mere I jiri jụ m O Onyenweanyị?

Gịnị mere I jiri zonahụ m ihu gị? Azịza.

MBEKU  I Sam 3;9; Jọn 6:69

Alleluịa, Alleluịa:

Kwuwe Onyenwe m, nwodibo gị na-ege ntị. Ọ bụ gị jị okwu nke ndụ ebeebe.

Alleluịa.

Oziọma maka September 30, 2020 – Luk 9:57-62

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Mgbe Jesu na ndị na-eso ụzọ ya na-aga n’ụzọ, otu nwoke sịrị Jesu, “Aga m eso gị ebe ọbụla ị na-eje.”

Jesu asị ya, “Nkịta ọhịa nwere ọnụ ebe ha na-edina, ụmụnnụnụ nke igwe nwekwara akwu, ma Nwa nke mmadụ enweghị ebe ọ ga-edobe isi.” 

Ọ gwara onyeọzọ sị, “So m.”  Ma onye ahụ sịrị, “Dinwenụ m, kwee ka m buru ụzọ gaa lie nna m.”

Jesu sịrị ya, “Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie onwe ha. Ma gị onwe gị, gaa ka Ị kwusaa Alaeze Chineke.”

Onyeọzọ gwakwara ya sị, “Aga m eso gị Dinwenụ m, ma kwee ka m buru ụzọ gaa sị ndị nọ n’ụlọ m nọdụ mma.”

Jesu sịrị ya, “Onye ọbụla nke jidere ọgụ eji akọ ubi, ma anya atọ ya n’azụ, ekwesịghị alaeze nke Chineke.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Emume Ncheta Maịkel, Gebrel na Rafel, Ndịisi Ndị Mmụọoma.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:  Igbo Mass Readings for October 1, 2020, Ncheta Mgbe Naịjirịa Nweere Onwe Ya, Marịa Dị Ngọzi Ezenwaanyị Naịjirịa.

Igbo Catholic Readings for September 30, 2020, Wednezdee Izu Nke Iri Abụọ na Isii N’oge Na-Adanyeghị N’emume – Afọ nke Mbụ

Sonyere anyị na Facebook na Catholic Igbo Lectionary

error: Alert: Content is protected !!