Igbo Mass Readings for January 4 2022

Ihe Ogugu nke mbu: 3:7-10

Ihe ogugu ewetara n’Akwukwoozi Jon nke mbu
Umuntakiri, unu ekwela ka onye obula duhie unu. Onye obula na-eme ihe ziri ezi bu onye ezi omume dika ya onwe ya si buru onye eziomume. Onye obula na-eme njo bu nwa nke Ekwensu. N’ihina Ekwensu emehiela site na mbido. Ihe mere Nwa nke Chukwu ji puta ihe bu ka o laa oru niile nke Ekwensu n’iyi. Onye obula bu nwa nke Chukwu anaghi eme njo, n’ihi na odidi nke Chineke di n’ime ya. O nweghi ike ime njo n’ihina o bu nwa nke Chukwu. N’uzo di otu a ka a ga-esi choputa ndi bu umu Chineke na ndi bu umu Ekwensu. Onye obula na anaghi eme ihe oma ma o bu hu nwa nne ya n’anya, abughi onye nke Chukwu.
ABUOMA NA AZIZA: Ps: 98: 1, 7-8, 9.
Aziza: Akuku uwa niile ahula nzoputa nke Chineke anyi.

  1. Kweerenu Onyenweanyi ukwe ohuru,
    n’ihi na o ruru oru ebube,
    aka nri ya na aka ya di nso
    eweterela ya mmeri. Az./
  2. Tienu mkpu, osimiri na ihe niile di n’ime ya,
    uwa na ndi niile bi n’ime ya!
    Ka iyi niile kuo aka ha,
    ka ugwu niile kwee ukwe añuri n’ihu Dinwenu. Az./
  3. Onyenweanyi na-abia,
    O na-abia ikpe uwa ikpe,
    o ga-eji ikpe ziri ezi were kpee uwa ikpe.
    O ga-eji ikpe nkwumoto were kpee ndi mmadų ikpe. Az.!

ALLELUIA ALLELUIA:
Ubochi di aso adakwasala anyi. sekpuoro Onyenweanyi. Taa achakwasala anyi.
ALLELUIA.
OZIOMA: 1:35-42.

Ihe ogugu ewetara n’Ozioma di aso nke Jon dere:

N’ubochi nke ozo, Jon na mmadu abuo n’ime ndi na-eso uzo ya kwu. Mgbe o huru Jesu ka o na aga, O siri, “Leenu nwaturu nke Chukwu!” Ka mmadu abuo ahu ndi na-eso uzo ya nuru ihe o kwuru, ha sobere Jesu. Jesu tughariri hu ka ha na-eso ya, si ha, “Gini ka unu na-acho?” Ha zara ya si, “Rabai” (nke putara onye nkuzi) “Olee ebe i bi?” O siri ha, “Bianu ka unu hu.” Ha biara ma hu ebe o bi. Ha nonyeere ya ubochi ahu, n’ihina o bu ihe dika elekere nke ano. Andru nwanne Saimon Pita bu otu onye n’ime mmadu abuo ahu, nuru ihe Jon kwuru, wee sobe Jesu. Ihe mbu o mere bu na o chotara nwanne ya bu Saimon si ya, “Anyi achotala Mezaya ahu,” nke putara ma a sugharia ya “Kristi.” O kpotaara ya Jesu. Jesu elee ya anya si, “Ya bu, I bu Saimon nwa Jon? A ga-akpozi gi Kefas,” nke putara “Okwute”.

error: Alert: Content is protected !!