Igbo Mass Readings for January 5 2022

Ihe Ogugu nke mbu: 3:11-21
Ihe ogugu ewetara n’Akwukwo ozi Jon nke mbu:

Nke a bu ozi nke unu nuru site na mbido, na anyi ga-ahurita onwe anyi n’anya. Anyi agaghi adi ka Ken, onye buuru onye nke ajo onye ahu, ma gbuo nwanne ya. Gini mere o ji gbuo ya? O bu n’ihina omume ya ruru aru, ma nke nwanne ya ziri ezi. Ya agbala unu gharii na uwa kporo unu asi. Anyi maara na anyi esila n’onwu banye na ndu n’ihina anyi huru umunna anyi n’anya. Onye obula na anaghi ahu madu ibe ya n’anya, ka nokwa n’ime onwu. Onye obula kporo nwanne ya asi, bu onye ogbu ochu. Unu makwaara nke oma na onye ogbu ochu enweghi ndu ebighiebi n’ime ya. Na nke a ka anyi ji mara ihe ihunaanya bu: na o togboro ndu ya n’ihi anyi. Anyi kwesikwara itogbo ndu anyi maka umunna anyi. O buru na mmadu nwere aku nke uwa, ma hu nwanne ya ka o no na mkpa, mechie obi ya, olee otu ihunaanaya Chukwu si biri n’ime ya? Umuntakiri, ka anyi ghara idi na-ahu n’anya naani n’egbugbereonu ma o bu n’okwu. Kama ka anyi na-ahu n’anya site n’omume na n’eziokwu. N’uzo di otu a, anyi ga-ama na anyi bu ndi nke eziokwu, ma mekwaa ka obi anyi sie ike n’ihu ya, mgbe obula mmuo anyi na-ama anyi ikpe, anyi ga-amata na Chineke kariri mmuo anyi; o mazukwara ihe niile. Ndi m huru n’anya, o buru na mmuo anyi anaghi ama anyi ikpe, anyi ga-enwe obi siri ike iguzo n’ihu Chukwu.

ABUOMA NA AZIZA: Ps:100:1-2, 3, 4, 5.

Aziza: Ka uwa niile tijere Onyenweanyi mkpu onu.

  1. Uwa niile tijerenu Onyenweanyi mkpu onu,
    Werenu onu fee Onyenweanyi ofufe
    Werenu iti mkpu onu bia n’ihu ya. Az./
  2. Maranu na Onyenweanyi bu Chineke,
    ya kere anyi, O bukwa ya nwe anyi,
    anyi bu ndi nke ya, anyi bukwa igwe aturu ya. Az./
  3. Werenu ekele baa n’onuuzoama ya niile,
    werenu otito baa n’ogige ya niile;
    kelenu ya, goziekwanu aha ya. Az./
  4. N’ihi na Onyenweanyi di mma,
    Ihunaanya ya na-adi ebeebe,
    ntukwasiobi ya na-adigide
    bido na ndudugandu ruo na ndudugandu. Az./

ALLELUIA ALLELUIA:
Okwu ahu buuru mmadu, wee binyere anyi. Ma ndi nabatara ya, ka o nyere ike ibu umu nke Chineke.
ALLELUIA.

OZIOMA: 1:43-51.
Ihe ogugu ewetara n’Ozioma di aso nke Jon dere:

N’ubochi nke ozo, Jesu choro I ga Galili, O huru Filip, si ya, “Sobe m.” Filip bu onye Betsaida nke bu obodo Andru na Pita. Filip chotara Nataniel si ya, “Anyi achotala onye ahu Mosis dere n’akwukwo iwu, na onye ndi amuma dere banyere, ya bu Jesu onye Nazaret, nwa Josef.”
Nataniel juru ya si “O nwere ihe oma obula nwere ike isi na Nazaret puta?” Filip zara ya si “Bia ka i huru.” Mgbe Jesu huru Nataniel ka o na abiakwute ya, o kwuru maka ya si, “Lee ezigbo onye Izrel onye aghugho obula na-adighi n’ime ya!” Nataniel juru ya si, “Olee ebe i no mara m?” Jesu azaa ya si, “Tupu Filip akpoo gi mgbe i no n’okpuru osisi Fiig, ahuru m gi.” Nataniel zara ya si “Rabai (Onye nkuzi), i bu nwa Chineke! I bukwa eze nke Izrel!” Jesu zara ya si, “O bu n’ihina m gwara gi na m huru gi n’okpuru osisi Fiig ka i ji kwere? I ga-ahu ihe itunaanya kariri ndi a.” O siri ya, “N’ezie, n’ezie, agwa m gi, i ga-ahu eluigwe ka o meghere, hukwa ndi Mmuoo ma nke Chineke ka ha na-arigo na aridatakwa n’ahu nwa nke mmadu.”

error: Alert: Content is protected !!