Igbo Mass Readings for January 6 2022

Ihe Ogugu nke mbu: 5:5-13
Ihe ogugu ewetara n’Akwukwoozi Jon nke mbu

Onye bu onye na-emeri uwa ma o bughi onye kwere na Jesu Kristi bu Nwa nke Chukwu? Nke a bu onye sitere na mmiri na obara bia. O bughi naani mmiri ka o ji bia, kama, o ji mmiri na obara. Mmuo ahu bu onye akaebe, n’ihina o bu eziokwu. E nwere ndi akaebe ato. Mmuo, mmiri na Obara; ha ato kwekoritakwara n’otu. O buru na anyi na-anabata akaebe nke mmadu, akaebe nke Chineke bu ezi akaebe karia. Akaebe nke Chineke bukwa nke o gbara banyere Nwa ya. Onye kwere na Nwa nke Chineke, nwere akaebe ahu n’ime ya. Ma onye na ekwenyeghi n’akaebe ahu, emeela Chineke onye ugha, n’ihina o kwenyeghi n’akaebe Chineke gbara gbasara Nwa ya. Akaebe ahu bu nke a, na Chineke enyela anyi ndu ebighiebi. Ndu a di na Nwa ya. Onye nwere Nwa ahu nwere ndu. Onye na enweghi Nwa nke Chukwu, enweghi ndu.
Ana m edere unu ihe ndi a, unu ndi kwere n’aha nwa nke Chukwu; ka unu mara na unu nwere ndu ebighiebi.
ABUOMA NA AZIZA: Ps: 147:12-13, 14-15, 19-20.
Aziza: Jerusalem too Onyenweanyi

  1. Jerusalem too Onyenweanyi,
    Zayon too Chineke gi,
    n’ihi na o bu ya mere onu uzo ama gi niile ka ha sie ike,
    o na agozi umu gi niile. Az./
  2. O na enye gi udo n’oke ala gi niile,
    o na eji oka nke kacha mma azu gi nri.
    O na-etiri uwa iwu,
    okwu ya agazuo uwa niile osooso. Az./
  3. O na-ekpughere umu Jekob okwu ya,
    egosikwa umu Izrel iwu ya na ikpe ya.
    O naghi emere mba ndi ozo otu a,
    o naghi akuziri ha iwu ya. Alleluia. Az./
    ALLELUIA ALLELUIA:

N’oge ochie, Chineke sitere n’uzo di iche-iche gwa nna anyi ha okwu site n’onu ndi amuma, n’ogwugwu oge ndi a, o gwala anyi okwu site na Nwa ya. ALLELUIA.

OZIOMA: 1: 7-11.
Ihe ogugu ewetara n’Ozioma di aso nke Mak dere:

Jon kwusara si, “Onye ka m ike na-abia na azu m, onye m na etosighi ihulata ala topu eriri akpukpu ukwu ya. Eji m mmiri mee unu mmirichukwu, ma o ga eji mmuo Nso mee unu mmirichukwu.” N’oge ahu Jesu siri n’obodo Nazaret nke Galili bia. Jon mere ya mmirichukwu na osimiri nke Jodan. Ma mgbe Jesu si na mmiri puta, ozigbo ahu o huru eluigwe ka o meghere. O hukwara Mmuo Nso ka o na-efedakwasi ya dika nduru. Otu olu si n’eluigwe bia si, “I bu Nwa m, m huru n’anya ihe gi di m ezi mma.”

error: Alert: Content is protected !!