Igbo Mass Readings for January 2 2022

Ihe Ogugu nke mbu: 2:22-28

Ihe ogugu ewetara n’Akwukwoozi mbu nke Jon
Onye bu onye ugha? O bu onye na ekwu na Jesu abughi Kristi. Onye di otu a bu onye na – emegide Kristi. O na agonari Nna na Nwa. Onye obula na-agonari Nwa, enweghikwa Nna n’ime ya. Onye ahu nke na-ekwuputa Nwa, na ekwuputakwa Nna. Meenu ka ihe unu nuru na mbido biri n’ime unu. O buru na ihe unu nuru site na mbido ebiri n’ime unu, mgbe ahu, unu ga ebi n’ime Nwa na n’ime Nna. Nke a bu nkwa o kwere anyi, ndu ebighiebi. Ana m edere unu nke a maka ndi ga-eduhie unu. Otite mmanu nke unu siri n’aka ya nweta na-adi n’ime unu, o dighikwa mkpa ozo na onye obula ga-akuziri unu. Ebe o bu na otite mmanu ya kuziiri unu banyere ihe niile, o bu ezie, o bughi ugha. Ebe o bu eziokwu, nogidekwanu n’ime ya. Ugbu a umu ntakiri, nogidenu n’ime ya, ka o ga-abu mgbe o putara ihè, anyi enwee ntukwasiobi, ghara iji ihere puo n’ihu ya mgbe o ga-abia.
ABUOMA NA AZIZA: Ps: 98: 1, 2-3, 3-4.

Aziza: Akuku uwa niile ahula nzoputa nke Chineke anyi.

  1. Kweere Onyenweanyi ukwe ohuru,
    n’ihi na o ruru oru ebube,
    aka nri ya na aka ya di nso eweterela ya mmeri. Az./
  2. Onyenweanyi egosila ike nzoputa ya,
    o meela ka mba niile mata eziomume ya.
    O chetala ihunaanya ya na ikwudosiike ya
    n’ebe ezinuulo Izrel no. Az/
  3. Akuku uwa niile ahula
    nzoputa nke Chineke anyi.
    Uwa niile tierenu Onyenweanyi mkpu onu.
    Were ukwe na mkpu onu too ya. Az./

ALLELUIA ALLELUIA:
Okwu ahu buuru mmadu wee binyere anyi. Ma ndi niile nabatara ya, ka o nyere ike ibu umu nke Chineke. ALLELUIA.

ΟΖΙΟΜΑ: 1: 19-28.
Ihe ogugu ewetara n’Ozioma di aso nke Jon dere:

Nke a bu akaebe nke Jon gbara; mgbe ndi Juu siri na Jerusalem zigaara ya ndi nchu aja na ndi Levai, ka ha juo ya si, “Onye ka i bu? Jon kwuru eziokwu, O goghi ago, kama o kwuputara si, “Abughi m Kristi ahu.” Ha juru ya si, “Onyezi ka i bu? I bu Elaija?” Jon zara si, “Abughi m ya.” Ha jukwara ya si, “I bu onye amuma ahu?” O zara si “Mba.” Ha siri ya, “Onye ka i bu?” Gwa anyi ka anyi nwee ihe anyi ga-agwa ndi zitere anyi. Gini ka I nwere ikwu banyere onwe gi?” O siri, “Abu m olu nke ahu na-eti mkpu n’ime ozara Meenu uzo nke Oseburuwa ka o kwuru oto,” si, ‘ dika onye amuma Aizaya siri kwuo.” Ha bu ndi, ndi Farisii zitere. Ha juru ya si, “Gini mere I ji eme ndi mmadu mmirichukwu ma o buru na i bughi Kristi ahu ma o bu Elaija, I bughikwa onye amuma ahu?” Jon zara ha si, ‘Eji m mmiri eme mmirichukwu ma otu onye no n’etiti unu, onye unu na-amaghi.
O na-esochi m n’azu, onye mu na-etosighi ike itoghe eriri akpukpoukwu ya.” lhe a mere na Betani n’ofe Jodan, ebe Jon no na-eme mmirichukwu.

error: Alert: Content is protected !!