Igbo Mass Readings for January 3 2022

Ihe ogugu nke mbu: 2:29, 3:1-6.
Ihe ogugu ewetara n’Akwukwo ozi mbu Jon:

O buru na unu ma na o bu onye eziomume, unu aghaghikwa ima na onye obula na-eme eziomume bu nwa ya. Lee udi ihunaanya Nna gosiri anyi, na a ga-akpo anyi umu nke Chukwu. O bu ihe anyi bu. The mere na uwa amaghi anyi, bu n’ihina omaghi Nna ahu. Ma ugbu a, ndi m huru n’anya, anyi bu umu Chineke. Ihe anyi ga-abu n’odiniihu aputabeghi ihè. Kama, anyi maara na mgbe o ga-aputa ihè, anyi ga-adi ka ya, n’ihi na anyi ga ahu ya otu o di. Onye obula nwere nchekwube di otu a ga-edobe ndu ya ocha dika Kristi si di ocha.
Onye obula nke na-eme njo, ikpe omuma mmebi iwu ji ya. Njo bu mmebi iwu. Unu maara na Kristi biara ikpochapu njo, o nweghikwa njo di n’ime ya. O nweghi onye obula bi n’ime ya na eme njo. O nweghikwa onye obula na-eme njo hurula ya anya ma o bu mara onye o bu.
ABUOMA NA AZIZA: Ps: 98: 1, 3-4, 5-6.

Aziza: Akuku uwa niile ahula nzoputa nke Chineke anyi.

  1. Kweere Onyenweanyi ukwe ohuru,
    n’ihi na o ruru oru ebube,
    aka nri ya na aka ya di nso
    eweterela ya mmeri. Az./
  2. Akuku uwa niile ahula nzoputa nke Chineke anyi.
    Uwa niile tijerenu Onyenweanyi mkpu onu,
    werenu ukwe na mkpu onu too ya. Az./
  3. Kweerenu Onyenweanyi ukwe
    werenu ubo akwara na ihe egwu di iche iche
    tiere Onyenweanyi egwu!
    Weerenu opi igwe na mpi
    kwuputa na Onyenweanyi bu eze. Az./

ALLELUIA ALLELUIA:
N’oge ochie Chineke sitere n’uzo di iche-iche gwa nna anyi ha okwu site n’onu ndi amuma,n’o gwugwu oge ndi a, o gwala anyi okwu site na nwa ya. ALLELUIA.

ΟΖΙΟΜΑ: 1:29-34.

Ihe ogugu ewetara n’Ozioma di aso nke Jon dere:
N’ubochi nke ozo Jon huru Jesu ka o na-abia n’ebe o no, o si, “Lee nwaaturu nke Chukwu onye na ekpochapu njo nke uwa! O bu ya bu onye m kwuru maka ya si, ‘Onye na-esote m kariri m, n’ihi na o bu m uzo diri. Mu onwe amabughi ya, mana o bu n’ihi nke a ka m ji bia na-eme mmirichukwu iji kpugheere ya umu Izrel.” Jon gbara aka ebe si, “Ahuru m mmuo nso ka o si n’eluigwe fedata n’udi nduru nogide n’ahu ya. Mu onwe m amabughi ya, ma onye ahu zitere m iji mmiri na-eme mmirichukwu gwara m si, ‘Onye obula i huru Mmuo Nso ka o fekwasiri nogidekwa n’ahu ya bu onye ahu nke m ga eji Mmuo Nso na-ememmirichukwu’. Ugbu a, ahula m ya ma gbaa akaebe na o bu nwa nke Chineke.”

error: Alert: Content is protected !!