Igbo Mass Readings October 2, 2020, Emume Ncheta Mmụọ Ndịnche

Igbo Mass Readings for October 2, 2020, Emume Ncheta Mmụọ Ndịnche.

Igbo Mass Readings October 2, 2020, Emume Ncheta Mmụọ Ndịnche
Igbo Mass Readings October 2, 2020, Emume Ncheta Mmụọ Ndịnche

Ihe Ọgụgụ nke Mbụ       23:20-23

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọpụpụ

“Lee ana m ezite Mmụọọma nke ga-edu ụnụ ruo n’ala ahụ m kwadooro ụnụ. Geenụ ya ntị n’olu, ụnụ enụpụkwarala ya isi n’ihina ọ gaghịkwa agbaghara mmehie ụnụ ọbụla, aha m nọkwa ya n’ime.

Ma ọbụrụ na ụnụ egee ya ntị n’olu, ma meekwa ihe niile m kwuru, aga m abụ onye iro nke ndịiro ụnụ ma megidekwa ndị niile na emegide ụnụ.

Mgbe Mmụọọma m ahụ ga-edurute ụnụ n’etiti ndị Amọ, na ndị Hit, ndị Periz, ndị Kenaan, ndị Hiv na ndị Jebus, aga m ekpochapụ obodo ha niile.

Abụọma na Azịza ya: Ps. 91:1-3, 3-4, 5-6, 10-11

Azịza: Ọ ga-enye  ndị mmụọọma ya iwu ka ha nọnyere gị, ka ha na-echekwa gị ebe niile  Ị na-aga.

  1. Onye bi na ndo nke onye kasị elu,

Onye nọgidesiri ike na nchedo nke onye ji ike niile,

ga-asị Onyenweanyị, “Ị bụ onye nchedo m na ike m,

Chineke m, onye m tụkwasara obi!” Azịza

2. Ọ ga-azọpụta gị na ọnya niile nke ndịiro,

na-ajọ ọrịa niile,

Ọ ga-eji nku ya kpuchie gị

Ọ bụ na okpuru nku ya ka Ị ga-enweta nchedo. Azịza

3. Ị gaghị atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla nke abalị

mọbụ akụ ndị na-efe n’ehihie,

mọbụ ajọ ọrịa ndị na-ezo n’ọchịchịrị,

mọbụ ihe mberede na-egbu n’ehihie. Azịza

4. Ma onweghị ajọ ihe ọbụla ga-adakwasị gị,

O nweghị ihe ọjọọ ọbụla ga-abịaru  ụlọ gị nso.

N’ihina ọ ga-enye ndị mmụọọma ya iwu ka ha nọnyere gị,

Ka ha na-echekwa gị ebe niile Ị  na-aga. Azịza.

Mbeku

Alleluịa, Alleluịa:

Gọzienụ Onyenwenayị, ndị agha ya niile, ụnụ ndị odibo ya, ndị na-eme uche ya.

Alleluịa.

Oziọma maka October 2, 2020  – Matiu 18:1-5,10

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

N’oge ahụ ndị na-eso ụzọ Jesu bịakwutere ya jụọ ya sị: “Olee onye kachasị ibe ya ukwuu n’alaeze eluigwe?”

O wee kpọrọ otu nwatakịrị kwụba ya ọtọ n’etiti ha sị, “N’ezie agwa m ụnụ, ọ bụrụ na ụnụ agbanweghị dịka ụmụntakịrị, ụnụ agaghị aba n’alaeze eluigwe.

Onye ọbụla nke wedara onwe ya ala dịka nwatakịrị a, ọ bụ ya kachasị ukwuu n’alaeze eluigwe.

“Onye ọbụla nke ga-anabata nwatakịrị dị otu a nke ọma n’aha m, anabatala m.” Lezienụanya ka ụnụ ghara ilelị otu n’ime ụmụaka ndị a.

N’ihina ana m agwa ụnụ na ndị mmụọọma ha nọ n’eluigwe na-ahụ ihu Nna m nke bi n’eluigwe oge niile.”

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings for October 1, 2020, Ncheta Mgbe Naịjirịa Nweere Onwe Ya, Marịa Dị Ngọzi Ezenwaanyị Naịjirịa.

IHE ỌGỤGỤ ECHI: Igbo Mass Readings for October 3, 2020, Ncheta Teresa Obere Nwa Jesu Dị Asọ.

Igbo Mass Readings for October 2, 2020, Emume Ncheta Mmụọ Ndịnche.

Sonyere anyị na Facebook na Catholic Igbo Lectionary    

error: Alert: Content is protected !!