Igbo Mass Readings October 3, 2020, Ncheta Teresa Obere Nwa Jesu

Igbo Mass Readings for October 3, 2020, Ncheta Teresa Obere Nwa Jesu Dị Asọ.

Igbo Mass Readings for October 3, 2020, Ncheta Teresa Obere Nwa Jesu Dị Asọ.
Igbo Mass Readings for October 3, 2020, Ncheta Teresa Obere Nwa Jesu Dị Asọ.

Ihe Ọgụgụ nke Mbụ            42:1-3, 5-6, 12-16

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ nke Job

Job zara Yahweh sị: “Amara m na ị pụrụ ime ihe niile, na o nweghịkwa nzube gị ọ bụla nke ihe ọ bụla pụrụ igbochi.

Ọ bụ m bụ onye iberibe nke tụrụ okwu gị n’aja? N’ezie ekwuola m okwu banyere ihe ndị mụ amaghị, ndị nke karịrị m nghọta.

Anụla m banyere gị ma ugbu a, ejirila m anya m hụ gị; n’ihi ya, ekwughasịala m ihe m kwuburu, ma wụkwasa onwe m aja na ntụ iji gosi nchegharị m.”

Yahweh gozikwara ụbọchị ndụ Job ndị fọdụrụ karịa otu ọ dị na mbido; nke mere na o nwere atụrụ dị puku iri na anọ, kamel dị puku isii, ehi dị puku abụọ na otu puku nne ịnyịnyaibu.

Ọ mụtakwara ụmụnwoke asaa na ụmụnwaanyị atọ. Aha ọ gụrụ nke ada bụ Jemaịma, nke abụọ bụ Kezaya, ebe nke atọ bụ Kerenhapuk.

N’obodo ahụ niile, o nweghị ụmụnwaanyị mara mm aka ụmụ Job; nna ha nyere ha ihe nketa n’etiti ụmụnna ha ndị nwoke.

Ka nke a gasịrị, Job biri otu narị afọ na iri anọ wee hụ ụmụ ya na ụmụụmụ ya ruo n’agbụrụ nke anọ.

Abụọma na Azịza :  Ps. 119:66, 71, 75, 91, 125, 130

Azịza: Onyenweanyị mee  ka ihu gị chakwasị m.

  1. Kuziere m ikpe ziri ezina amamiihe

maka na m kwere n’iwu gị. Azịza.

2. Ọ dị mma na atara m ahụhụ

Ka m wee nwee ike ịmata ụzọ gị. Azịza.

3.Amaara m na ikpe gị kwụ ọtọ O Onyenweanyị

na ị tara m ahụhụ n’ihi ịkwụdosiike gị. Azịza.

4.Iwu gị na-achị ihe niile ị kere eke

ebe ihe niile na-efe gị. Azịza.

5.Abụ m nwodibo gị, nye m nghọta

Ka m wee nwee ike mara nkuzi gị. Azịza.

6.Okwu gị na-enye ihe

ọ na-enye ndị umeala nghọta. Azịza.

Mbeku

Alleluịa, Alleluịa:

Ana m ekele gị nna Dinwenụ nke eluigwe na ụwa, n’ihina I kpugheere ụmụntakịrị ihe omimi nke alaeze.

Alleluịa.

Oziọma maka October 3, 2020 – Luk 10:13-16

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Ndịozi iri asaa ahụ jiri ọñụ lọta sị, “Onyenweanyị ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ rubeere anyị isi mgbe anyị nyere ha iwu n’aha gị. O wee sị ha,

“Ahụrụ m Ekwensu ka o siri n’eluigwe daa dịka amụma. Lee, enyela m ụnụ ike ịzọkwasa agwọ na akpị ụkwụ na imegide ike onye iro ahụ, o nweghịkwa ihe ga-emerụ ụnụ ahụ.

N’agbanyeghị nke a, ụnụ añụrịla na ndị mmụọ ọjọọ na-ehubere ụnụ isi, kama nweenụ ọñụ na e deela aha ụnụ n’eluigwe.

N’otu oge ahụ, obi tọrọ Jesu ụtọ site na Mmụọ Nsọ, o wee sị, “Ekelee m gị Nna Dinwenụ nke eluigwe na ụwa, n’ihina I zobere ihe ndị a n’ebe ndị amamiihe na oke mmụta nọ, ma kpugheere ha ụmụntakịrị.

Ee Nna, otu a ka o si masị uche gị dị asọ. Nna m enyefeela m ihe niile n’aka. Ọ dịghị onye ọ bụla maara onye Nwa ahụ bụ ma ọ bụghị Nna, mọbụ onye Nna ahụ bụ ma ọ bụghị Nwa ahụ, na onye ọ bụla nke Nwa ahụ chọrọ ikpughere ya.”

Jesu tụgharịrị gwa ndị na-eso ụzọ ya na nzuzo sị, ‘Ngọzị dịịrị anya hụrụ ihe ụnụ hụrụ!

Ana m agwa ụnụ na ọtụtụ ndị amụma na ndịeze mgbe ochie chọsiri ike ịhụ ihe ụnụ na-ahụ, ma ha ahụghị ha, na ịnụ ihe ụnụ na-anụ ma ha anụghị ha.”

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings for October 2, 2020, Emume Ncheta Mmụọ Ndịnche.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:     Igbo Mass Readings October 4, 2020, Ụka nke Iri Abụọ na Asaa n’oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for October 3, 2020, Ncheta Teresa Obere Nwa Jesu Dị Asọ.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings

error: Alert: Content is protected !!