Igbo Readings for Ncheta Thomas di Aso, Onye Apostul, July 3, 2020

Igbo Readings for Ncheta Thomas di Aso, Onye Apostul, July 3, 2020,

Nke a bu Igbo Mass Readings for Ncheta Thomas di Aso, Onye Apostul, July 3, 2020, nke ndi Catholic Lectionary wetara unu.

Image of Igbo Readings for Ncheta Thomas di Aso, Onye Apostul, July 3, 2020,
Igbo Readings for Ncheta Thomas di Aso, Onye Apostul, July 3, 2020,

IHE OGUGU NKE MBU        2:19-22

Ihe Ogugu e wetara n’akwukwoozi Pol degaara Ndi Efesus

Ya bu unu esorola ndi nso buru ndi amuru n’ala , ezinuulo Chineke; nke a rukwasara n’elu ntoala nke umuazu na  ndi amuma,

nke Jesu Kristi na onwe ya bu okwute ntoala ya. O bu n’ime ya ka ihe ndi a niile jikotara onu, too, wee buru ulonso n’ime Dinwenu.

N’ime ya ka a runyekwara unu dika ebe obibi nke Chineke n’ime mmuo.

ABUOMA NA AZIZA      Ps. 117:1, 2.

Aziza: Gaanu n’uwa niile kwusaaranu ihe niile e kere eke ozioma.

  1. Toonu Onyenweanyi, mba niile,

Toonu ya, ndi mmadu niile. Aziza.

2. N’ihina ihunanya ya siri ike,

Nkwudoziike ya na-adi okpu. Aziza.

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

I kwerela Thomos n’ihina I huru m? Ngozi ga-adiri ndi na-ahughi ma kwere”.

Alleluia.

Ozioma maka Ncheta Thomas di Aso, Onye Apostul, July 3, 2020 – Jon 20:24-29

Ihe Ogugu nke a si n’Ozioma di aso nke Jon dere

Otu onye n’ime ndi umuazu Jesu iri na abuo ahu bu Tomos, nke a na-akpo Ejima, esoghi ha noro mgbe Jesu biara.

Ndi na-eso uzo Jesu ndi ozo gwara ya si, “Anyi ahula Onyenweanyi.” Ma o zara ha si, “O buru na m ahughi n’aka ya apa ntu, tinyekwa mkpisiaka m n’apa ntu ahu, tinyekwa mkpisiaka m n’akuku ya, agaghi m ekwe.”

Mgbe mkpuru ubochi asato gachara, ndi na-eso uzo ya nokwa n’ime ulo ozo. Tomos sokwa ha noro.

N’agbanyeghi na agbachichara uzo niile agbachi, Jesu bia kwuru n’etiti ha si ha, “Udo diri unu,” O siri Tomos, “Tinye mkpisiaka gi ebe a, lekwaa aka m abuo.

Weputa aka gi tinyen’akuku m. Arula uka kama kwere.” Tomos etie si, “Onyenwe m na Chineke m!” Jesu asi ya, “I kwerela n’ihina I hurum? Ngozi ga-adiri ndi na-ahughi ma kwere.”

IHE OGUGU UNYAHU: July 2, 2020, Toozdee, Izu Nke Iri Na Abuo N’oge Na-Adanyeghi N’emume

IHE OGUGU ECHI:   July 4, 2020, Satoodee, Izu Nke Iri Na Ato N’oge Na-Adanyeghi N’emume

Igbo Readings for Ncheta Thomas di Aso, Onye Apostul, July 3, 2020,

Sonyere Anyi na Facebook @ Catholic Lectionary

error: Alert: Content is protected !!