Igbo Mass Readings November 21 2020, Nkubata Nke Marịa Dị Ngọzi

Igbo Mass Readings November 21 2020, Ncheta Nkubata Nke Vegin Marịa Dị Ngọzi – Satọdee Izu Iri Atọ na Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings November 21 2020, Ncheta Nkubata Nke Vegin Marịa Dị Ngọzi - Satọdee Izu Iri Atọ na Atọ n'Oge Adanyeghị n'Emume.
Igbo Mass Readings November 21 2020, Ncheta Nkubata Nke Vegin Marịa Dị Ngọzi – Satọdee Izu Iri Atọ na Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ      2:10-13.

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Zekaraya

Kwee ukwe ọñụ nwaada Zayọn n’ihina ugbu a ana m abịa ibinyere ụnụ. Ọ bụ Yahweh na-ekwu. N’ụbọchị ahụ ọtụtụ mba ga-echegharị, bịakwute Yahweh. Ee, ha ga-abụ ndị nke ya.

Aga m ebikwa n’etiti ụnụ, oge ahụ, ụnụ ga-amata na ọ bụ Osebụrụwa Chineke nke igwe ndịagha zitere m. Yahweh ga-ewerekwa Juda dịka oke nke ya n’ala nsọ ahụ. Ọ ga-ahọrọkwa Jerusalem.” Ka mmadụ niile dere jụụ n’ihu Chineke ugbu a o si n’ebe obibi ya dị nsọ na-ekulite.

ABỤỌMA NA AZỊZA:    Luk 1:46-47, 48-49, 50-51, 52-53, 54-55.

Azịza:  Onye dị ike emeerela m nnukwu ihe, aha ya dị nsọ.

1.Mkpụrụobi m na-eto Dinwenụ

Mmụọ m na-añụrị na Chukwu onye nzọpụta m. Azịza.

2. Maka na o leele anya n’umeala odibo nwaanyị ya,

site taata ndụdụgandụ niile ga na-akpọ m onye dị ngọzi;

Maka na onye dị ike emeerela m nnukwu ihe,

Aha ya dị nsọ. Azịza.

3. Obi ebere ya si na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ

maka ndị na-atụrụ ya egwu,

O gosila ike aka ya,

Ọ chụsachaala ndị nganga dị n’obi. Azịza.

4. O sila n’ocheeze budaa ndị ukwu,

bulie ndụ umeala,

O nyejuola ndị agụụ na-agụ afọ

hapụ ndị ọgaranya ka ha gbara aka laa. Azịza.

5. O nyerela Izrel nwodibo ya aka

na ncheta ebere ya,

Dịka o si gwa nna anyị Abraham

Na mkpụrụ ya ebeebe. Azịza.

MBEKU       

Alleluịa, Alleluịa:

Ọ bụrụ na mmadụ ahụ m n’anya, ọ ga edobe okwu m. Nna ga-ahụkwa ya n’anya. Anyị ga-abịakwute ya, biri n’ime ya.

Alleluịa.

Oziọma maka November 21 2020 – Matiu 12:46-50

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

Mgbe Jesu ka nọ na-agwa ndị mmadụ okwu, nne ya na ụmụnne ya bịara kwụrụ n’ezi na-achọ ka ha gwa ya okwu. Otu onye gwara ya sị, “Lee nne gị na ụmụnne gị kwụ n’ezi na-achọ ịgwa gị okwu.”

Ọ zara ya sị, “Onye bụ nne m, olee ndị bụ ụmụnne m?” Ọ tụrụ ndị na-eso ụzọ ya aka sị, “Ndị a bụ nne m na ụmụnne m! N’ihina onye ọbụla nke na eme uche Nna m nke bi n’eluigwe bụ nwanne m nwoke, nwann m nwaanyị na nne m.”

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings November 20 2020, Fraịdee Izu Iri Atọ na Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:    Igbo Mass Readings November 22 2020, Ụka Nke Ikpeazụ n’oge Adanyeghị n’Emume – Ụka Onyenweanyị Jesu Kristi, Eze Ụwa Niile.

Igbo Mass Readings November 21 2020, Ncheta Nkubata Nke Vegin Marịa Dị Ngọzi – Satọdee Izu Iri Atọ na Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Alert: Content is protected !!