Igbo Mass Readings for Saturday after Epiphany (Satode na-eso Epifani)

EKPERE MMEGHE
Chineke nna anyį, site na Nwa Gi I meela anyi ndi amughariri ohuru. Nwa Gį ketara oke n’ahu anyi biakwa buru otuonye n’ime anyi. Site n’enyemaka Ya, mee ka anyį na-adiwanye ka Ya. Site na Dinwenu anyi Jesu Kristi …

Ihe Ogugu nke mbu: 5:14-21
Ihe ogugu ewetara n’Akwukwoozi Jon nke mbu

Nke a bu ntukwasiobi anyi nwere na ya, na o bu ru na anyi ario ihe obula dika uche ya si di, O na ege anyi nti. O buru na anyi ma na O na ege anyi nti n’ihe obula anyi rioro, anyi amara na anyi enwetala ihe niile anyi rioro ya. O buru na onye obula ahu nwanne ya ka o na eme obere njo, o ga arioro ya aririo, Chineke ga-enye nwanne ya ahu ndu maka na njo ahu abughi njo ogbugbu. E nwere njo nke bu nnukwu njo. Anaghi m ekwu ka mmadu kpee ekpere maka nke ahu.
Omume niile na-ezighi ezi bu njo. Mana e nwere nke na abughi nnukwu njo. Anyi ma na onye obula a muru na Chineke anaghi eme njo, n’ihi na Kristi Nwa nke Chukwu na-echekwa ya. Onye iro ahu anaghi emetu ya aka. Anyi ma na anyi bu ndi nke Chineke, mana uwa niile no n’ike nke ajo onye ahu. Anyi makwa na Nwa nke Chukwu abiala, o nyekwara anyi nghota imata onye ahu bu Eziokwu. Anyi nokwa n’ime onye ahu bu Eziokwu, n’ime Nwa ya bu Jesu Kristi. Nke a bu ezi Chineke ahu na ndu ebighiebi. Umuntakiri, zerenu ikpere arusi.

ABUOMA NA AZIZA: Ps: 149:1-2, 3-4,5-6, 9.
Aziza: Onyenweanyi nwere ihunaanya n’ebe ndi nke ya no.

  1. Kwerenu Onyenweanyi ukwe ohuru,
    ka ogbako ndi kwere na ya kweere ya ukwe otito.
    Ka Izrel nuria onu n’ihi onye kere ya,
    ka umu Zayon nuriba n’ihi onye eze ha. Az./
  2. Ka ha were igba egwu too aha ya,
    ka ha were igba na ubo akwara gbaara ya egwu.
    N’ihi na Onyenweanyi nwere ihunaanya n’ebe ndi nke ya no,
    O kpubela ndi umeala okpu nke mmeri. Az./
  3. Ka ndi nke ya nuria na mmeri ha.
    Ka ha daa n’ala n’ihu Chineke, na eto ya oge niile.
    Ka nnukwu ukwe otito Chineke juputa n’onu ha,
    nke a bu otito nke ndi nke ya kwere ekwe.
    Alleluia. Az./

ALLELUIA, ALLELUIA:
E kwusara ya na mba niile, onye uwa niile kwere na ya, E buliri ya elu n’otito.
ALLELUIA.

OZIOMA: 3: 22-30.
Ihe ogugu ewetara n’Ozioma di aso nke Jon dere:

Mgbe nke a gachara Jesu na ndi na-eso uzo ya gara n’ala Judia, ya na ha no ebe ahu na-eme ndi mmadu mmirichukwu. Jon na-emekwa mmirichukwu n’Enon nke di Salim nso, n’ihi na nukwu mmiri di ebe ahu. Ndi mmadu na abjakwa. Jon na-eme ha mmirichukwu. Mgbe ahu a tubabeghi Jon n’ulo mkporo. Nrurita uka daputara n’etiti ndi na-eso uzo Jon na otu onye Juu banyere ime ka ha di ocha. Ha biakwutere Jon si ya, “Rabai (onye nkuzi) onye ahu gi na ya norola n’ofe Jodan, nke ahu I gbara akaebe maka ya, na-eme mmirichukwu ugbu a, mmadu niile na-abjakwutekwa ya!” Jon zara si: “Odighi onye nwere ike inata ihe obula ma o buru na Chineke enyeghi ya. Unu onwe unu ga-agbara m akaebe na m kwuru si, “abughi m Kristi ahu, kama e zitere m ka m buru ya uzo bia.”
Nwoke luru nwaanyi bu ya nwe nwaanyi o luru. The enyi ya na-eme bu inonyere ya na-ege nti n’ihe o na ekwu. O na enwekwa anuri n’ihina o na-anu olu enyi ya nwoke luru nwaanyi. Añuri mu ezuola oke ugbu a. O ga na-abawanye, mu onwe m ana-alo ala.

EKPERE NHUNYE
Nna nke udo, nabata nnyefe anyi nyefere onwe anyi n’idinso yana n’obiocha anyi; site na nketa oke anyį na-eketa n’ihe omimi nke a, mee ka anyi na-abia mmadu ibe anyi nakwa Gi onwe Gi nso. Anyi na-ario ihe ndia site na Kristi Dinwenu anyį. Amen.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSO
Dinwenų, ka Sacramenti nke a buru ike anyi. Kuziere anyį ka anyi na-aghota uru iheoma niile I nyere anyi, bia nyere anyi aka įdi na-agba mbo maka ndu ebighi ebi. Anyi na-ario Gi ihe ndi a site na Kristi Dinwenu anyį. Amen.

error: Alert: Content is protected !!