Igbo Mass Readings for Saturday after Ash Wednesday (Wednezde Ntu)

EKPERE MMEGHE
Nna, lekwasi anya n’adighi ike anyi ma were ike nke jhunaanyi Gi gbatara anyi oso enyemaka. Site na Dinwenu anyi Jesu Kristi …

Ihe Ogugu nke mbu: 58:9-14
Ihe ogugu ewetara n’Akwukwo onye Amuma Aizaya

Oseburuwa na-ekwu: O buru na unu ewepu n’etiti unu mmegbu, itu aka ma o bu ikwu okwu na agbawa obi; O burukwa na unu enye ndi aguu na agu ihe oriri, mee ka ndi no na mkpagbu nweta afo ojuju, mgbe ahu ka ihè unu ga-achawaputa n’ochichiri, abali unu ewee dika ehihie. Yahweh ga edu unu oge niile. O ga-eji ihe oma nyejuo unu afo, o ga-emekwa ka okpukpu unu sie ike, unu ga-adi ka ala ubi a an-agba mmiri, dika isiiyi nke mmiri ya na-adighi ata ata. A ga-arughari obodo unu a kuturu akutu na mbu; unu ga-ewulite ntoala nke otutu agburu, a ga-akpo unu “Ndimmezi ihe nke gbajiri agbaji,” “Ndi odozi uzo ebe obibi.” O buru na unu akwusi imeto ubochi Sabat m, kwusikwa icho ihe uto nke unu n’ubochi m di nso, o burukwa na unu ewere ubochi Sabat kporo ihe, doo ubochi nso Chineke dika ubochi kwesiri nsopuru; o buru na unu asopuru ya na emeghi uche nke unu, ma o bu icho ochicho nke unu, ma o bu ikwu okwu na-abaghi uru, mgbe ahu, unu ga-enwe mmasi n’ebe Yahweh no; aga m eme unu adi elu n’ime uwa; Aga m azu unu site n’ihe nketa nnanna unu bu Jekob, n’ihi na onu nke Oseburuwa ekwuola ya.

ABUOMA NA AZIZA: Ps 86: 1-2, 3-4, 5-6.
Aziza: Kuziere m uzo gi O Onyenweanyi, ka m were okwukwe na eso gi.

  1. Gee m nti Onyenweanyi, zaa m,
    n’ihina abu m ogbenye na-enweghi enyemaka.
    Chekwaba ndu m, n’ihi na enwere m okwukwe na gi,
    zoputa nwodibo gi onye tukwasara obi na gi. Az./
  2. I bu Chineke m, meere m ebere O Onyenweanyi,
    o bu gi ka m na-akpoku ubochi niile
    Mee ka mkpuruobi nwodibo gi juputa n’onu,
    Onyenwanyi, n’ihi na o bu gi ka m n akpoku n’ekpere m. Az.
  3. Onyenweanyi, i di ebere di mgbaghara,
    i nwere nnukwu ihuhadnya n’ebe ndi nille na-akpoku gi no.
    Onyenweanyi, nuru ekpere m,
    Gee m nti nuru aririo m. Az./

MBEKU: Ez; 18:31.
R/
Tufuonu mmehie unu niile nke uhu mere megi m; nwetaranu onwe unu obi ohutu na timup ohuru. R/

ΟΖΙΟΜΑ: 5:27-32
Ihe ogugu ewetara n’ Ozioma di aso nke Luk dere.

Mgbe nke a gachara, Jesu puru hu otu onye onautu a na-akpo Levai ka o noduru n’ulo utu; wee si ya, “Sobe m.” Ma Levai biliri, hapu ihe niile sobe ya. Levai kporo oriri ukwu n’ulo ya. Otutu ndi onautu na ndi ozo sokwa ha noro n’oche nri. Ndi Farisii na ndi odeakwukwo ha tamuru ntamu megide ndi na-eso uzo Jesu si, “Gi ni mere unu na ndi onautu na ndi omenjo ji eriko nri na-añukokwa ihe onunu?” Jesu zara ha si, “Mkpa dibia anaghi akpa onye ahu siri ike, kama o na-akpa onye ahu na-esighi ike. Abiaghi m ikpo ndi eziomume kama ikpo ndi njo ka ha cheghari a.

EKPERE NHUNYE
Dinwenu, nara otito na oriko anyį. Biko mee ka o tohapu anyi na njo ma kwalitekwa anyi iji ezi obi ejere Gi ozi. Anyi na-ario Gi ihe ndia site na Kristi Dinwenu anyį. Amen.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSQ
Dinwenu, anyi enwetala ndu ohuru site n’achicha ndu nke a I nyere anyi. Biko mee ka ihe omimi nke a anyį na-eme ugbu a nyere anyį aka isonye Gi na ndu ebighi ebi. Mezuoro anyi ihe ndi a site na Kristi Dinwenu anyį. Amen.

error: Alert: Content is protected !!