Igbo Mass Readings for Thursday after Ash Wednesday

EKPERE MMEGHE
Dinwenu, nyere anyi aka ka ihe niile anyį na-eme malite site na nkwalite Gi, na-aga n’ihu site n’enyemaka Gi, rukwaa izu oke site na ntuziaka Gi. Site na Dinwenu anyį Jesu Kristi .

Ihe Ogugu nke mbu: 30:15-20

Ihe ogugu ewetara n’Akwukwo Diuteronomi

Mosis were gwa oha mmadu ahu si “Taa, ana m eche n’ihu unu onwu na ndu, ihe oma na ihe ojoo ka unu horo nke ka unu mma. O buru na unu edobe iwu niile nke Yahweh bu Chineke unu, nke m na-enye unu taa, o burukwa na unu ahu ya n’anya, rubere ya isi, dobekwa iwu ya niile, unu ga-aga n’ihu, burukwa mba bara uba mmadu. Yahweh bu Chineke unu ga-agozi unu, mee ka unu biri n’ala ahu nke unu na-abia inweta. Ma o buru na unu enupuisi n’iwu ya jukwa ige ya nti, o buru na unu agahie uzo febe ma sekpuwere chi ndi ozo, aga-ekpochapuriri unu.
Unu agaghikwa ebi ogologo ndu n’ala ahu, n’ofe Jodan, ebe unu na-aga, ka unu biri n’ime ya. Ugbu a, ana m eche n’ihu unu onwu na ndu, ngozi na abumonu Chineke, ka unu horo nke ka unu mma. Ana m akpokwa eluigwe na uwa ka ha gbaa akaebe banyere nke obula unu ga-ahoro. Ya mere, horonu ndų, ka unu na umu-umu unu wee di ndu. Hunu Yahweh bu Chineke unu n’anya. Ruberenu ya isi. Werekwanu ikwudosiike fee ya, ka unu na ndi umu unu di ogologo ndu n’ala ahu nke O kwere nkwa inye nnanna unu ha bu Abraham, na Aizik na Jekob.”

ABUOMA NA AZIZA: Ps 1:1-2, 3,4,6

Aziza: Añuri ga-adiri ndi tukwasara obi ha na Dinwenu.

1.Añuri ga-adiri nwoke ahu nke anaghi eso ndumodu onye ajoomume,
ma o bu na akwughari n’uzo ndi ome njo ma o bu nodu n’otu ndi na-ekwuto Chineke;
Kama na-enwe anuri n’ebe iwu Onyenweanyi di;
ma na-achighari iwu ya n’obi ya ehihie na abali. Az/

  1. O dika osisi akuru na akuku iyi,
    nke na-amiputa mkpuru ya n’oge ya,
    nke akwukwo ya anaghi akponwu akponwu,
    ihe niile o na-eme na-agara ya nke oma. Az.
  2. O dighi otu a n’ebe ndi ajo mmadu no;
    Mba, n’ihi na ha dika afuru oka nke ikuku na-ebughari.
    N’ihi na Onyenweanyi na-echekwaba uzo ndi eziomume,
    mana uzo ndi ajo mmadu na-eduba n’ila n’iyi. Az./

MBEKU: Amos 5: 14.
Choba ezi ihe kama ajo ihe, ka unu wee di ndu, ka Yahweh nke igwe ndi agha wee nonyere unu. R/

ΟΖΙΟΜΑ: 9:22-25.
Ihe ogugu ewetara n’ ozioma di aso nke Luk dere.

Ma Jesu doro ndi na-eso uzo ya aka na nti, nyesie ha iwu ike, ka ha ghara ikoro onye obula ihe a, si, “Nwa nke mmadu ahu ga-ata otutu ahuhu. Ndi okenye ndi Juu, na ndiisi nchuaja, na ndi odeakwukwo ga-aju ya. A ga-egbukwa ya, ma n’ubochi nke ato, a ga-eme ka o si n’onwu bilie,”
O wee gwa ndi niile no ebe ahu si, “O buru na onye obula achoo iso m, ya ju onwe ya, buru obe ya ubochi niile sobe m. N’ihi na onye obula nke na-acho izoputa ndu ya ga-atufu ya. Ma onye obu la nke ga atufu ndu ya n’ihi m, ga-azoputa ya. Kedu uru o ga-abara mmadu ma o ritechaa uwa niile n’uru ma tufuo mkpuruobi ya ma o bu onwe ya efulahu ya.

EKPERE NHUNYE
Dinwenų, biko nara onyinye ndį a. Mee ka ha ritere anyi ebere Gi ma nyekwa Gi otito na mbulielu. Anyi na-ario Gi ihe ndja site na Kristi Dinwenu anyį. Amen.

EKPERE ANATACHA ORIRI NSO
Nna Onye ebere, biko mee ka onyinye na ngozi ndi a anyi natara, ritere anyi mgbaghara na nzoputa. Anyj na-ario Gi ihe ndja site na Kristi Dinwenu anyi. Amen.

error: Alert: Content is protected !!