Igbo Mass Readings for Tuesday after Epiphany (Tuezde na-eso Epifani)

EKPERE MMEGHE
Nna, Nwa Gi biara dika dika anyį mgbe O gosiputara onwe Ya n’udi anyį. Nyere anyį aka ka anyį na-adiwanye ka Ya. Site na Dinwenu anyi Jesu Kristi …

Ihe Ogugu nke mbu: 4:7-10
Ihe ogugu ewetara n’Akwukwoozi mbu nke Jon

Ndi m huru n’anya, ka anyi huritanu onwe anyi n’anya, n’ihina ihunaanya si na Chineke puta. Onye obula nwere ihunaanya bu nwa nke Chukwu. O makwaara Chukwu. Onye na enweghi ihunaanya amaghi Chukwu, n’ihina Chukwu bu įhunaanya. Otu a ka ihunaanya Chineke si puta ihè n’ebe anyi no, na o zitere naani otu Nwa ya n’uwa ka anyi nwee ndu site na ya. N’udi a ka ihunaanya di: O bughi na anyi ahula Chineke n’anya, kama, o huru anyi n’anya ma zite Nwa ya, ka o buru onye aga esi n’aka ya gbaghara njo anyi.
ABUOMA NA AZIZA: Ps:72:1-2,3-4,7-8.
Aziza: Onyenweanyi mba niile di n’uwa ga esekpuru gi.

  1. Nye eze ikpe nkwumoto gi, O Chineke,
    nyekwa nwa eze ezi omume gi,
    Ka o were nwee ike ichi ndi nke gi n’uzo ziri ezi,
    nyekwa ndi ogbenye ikpe ziri ezi. Az./
  2. Ka ugwu ukwu na ugwu nta niile
    wetara ndi nke gi ozi udo
    N’uzo ziri ezi, o ga-azoputa umu ndi ogbenye,
    zookwa umu ndi no na mkpa. Az./
  3. N’oge ya eziomume ga-achawaputa,
    udo ga-adikwa ruo na njedebe uwa,
    alaeze ya ga esi n’osimiri ruo n’osimiri,
    bido na mmiri ruo n’isi ngwucha nke uwa. Az./

ALLELUIA ALLELUIA:
Nnukwu onye amuma ebilitela n’etiti anyi” “Chineke abiala ileta ndi nke ya.
ALLELUIA.

OZIOMA: 6:34-44. 4.8A
Ihe ogugu ewetara n’Ozioma di aso nke Mak dere:

Ka Jesu ridatara n’ugbo, o huru otutu igwe mmadu ka ha gbakoro. O nwere obi ebere n’ebe ha no n’ihina ha dika aturu na-enweghi onye nche. O wee malite ikuziri ha otutu ihe. Mgbe chi na eji, ndi na-eso uzo ya biakwutere ya si, “Ebe a bu ozara, chi na ejikwa ugbu a, Zilaga ha ka ha gaa chooro onwe ha ebe ha ga-azuta nri n’obodo ndi a di anyi gburugburu.” Ma Jesu zara ha si, ‘Nyenu ha ihe ha ga-eri.’ Ha wee juo ya si, “Anyi ga-eje izuta ogbe achicha nke nari dinari abuo iji nyejuo ha afo? O juru ha si, “Ogbe achicha ole ka unu nwere? Gaanu choputa.” Mgbe ha choputara, ha zara ya si, “Ogbe achicha ise, na azu abuo.” O wee nye iwu ka ha niile nodu ala n’òtù, n’òtù, n’elu ahihia ndu. Ha noduru ala n’igwè n’igwe, ufodu di nari mmadu, ufodu di iri ise. O naara ogbe achicha ise na azu abuo ahu, lelie anya n’eluigwe, gozie ha, nyawaa ogbe achicha ndi ahu, nye ndi na-eso uzo ya ka ha keere ndi mmadu. O keere ha niile azu abuo ahu. Ha niile rijukwara afo.
Ha tutujuru nkata iri na abuo site n’iberibe achicha na azu foro afo. Ndi riri ogbe achicha ise ahu di puku mmadu ise.

EKPERE NHUNYE
Nna were ebere nabata onyinye anyi. Site n’isonye na Eucharistia nke a, ka anyi bia na ebiputa ndu zuru oke nke Ihunaanya anyi na ekwuputa. Anyi na-ario ihe ndia site na Kristi Dinwenu anyį. Amen.

EKPERE ANATACHA ORIRI NSO
Chineke Nna anyi, site na Eucharistia nke a, I metula ndu anyį aka. Mee ka įhunaanya Gi di ndu n’ime obi anyi, ka anyi were buru ndį tozuru oke na Gį. Anyi na-ario ihe ndia site na Kristi Dinwenu anyi. Amen.

error: Alert: Content is protected !!