Igbo Mass Readings for Ubochi nke Asaa n’ime Izuukwu Krismas

EKPERE MMEGHE
Chineke di ebighi ebi, okpukperechi anyi nwere isi mbido ya na izu oke ya n’omumu nke Nwa Gj. Nyere anyi aka iketa oke na ndu nke Dinwenų anyi Jesu Kristi n’ihina Ya bu nzoputa nke uwa niile. Site na Dinwenu anyj Jesu Kristi …

Ihe Ogugu nke mbu: 2:18-21
Ihe ogugu ewetara n’ Akwukwo Jon nke mbu

Umuntakiri nke a bu oge ikpe azu. Otu unu nuru la na onye iro Kristi na-abia, ugbu a, otutu n’ime ha abiala. N’ihi ya, anyi ma na nke a bu oge ikpe azu. Ha siri n’ogbako anyi puo, mana ha abughi ndi nke anyi. A si na ha bu ndi otu anyi, ha gaara esonyere anyi. Kama ha puru ka o wee puta ihe na o dighi onye obula n’ime ha bu onye otu anyi. Ma otu o di, onye nso ahu eteela unu ude, dika unu niile si mara.
Ana m edere unu akwukwo a, o bughi na unu amaghi eziokwu, kama o bu maka na unu maara ya, marakwa na o nweghi ugha si n’eziokwu aputa.

ABUOMA NA AZIZA: Ps: 96: 1-2, 11-12, 13.

Aziza: Ka eluigwe na uwa kwebe ukwe anuri.

  1. Kweerenu Onyenweanyi ukwe ohuru;
    uwa niile kweere Onyenweanyi.
    Kweerenu Onyenweanyi ukwe, too aha ya;
    Kwuputa nzoputa ya ubochi niile. Az/
  2. Eluigwe nuriba, uwa goribe,
    oke osimiri na ihe niile di n’ime ya, tienu mkpu.
    Ala ubi niile na ihe niile di n’ime ya nuribanu,
    ka osisi niile di n’oke ohia kwebe ukwe anuri n’ihu nke Onyenweanyi. Az./
  3. N’ihi Onyenweanyi na-abia,
    o na-abia ikpe uwa ikpe,
    o ga-eji ikpe nkwumoto were kpee uwa ikpe.
    o ga-eji eziokwu were kpee ndi mmadu ikpe. Az./

ALLELUIA ALLELUIA:
Ubochi di nso adakwasala anyi, bianu mba niile kporo Dinwenu isi ala, taa nnukwu ihe achakwasala anyi. ALLELUIA.

OZIOMA: 1: 1-18.

Ihe ogugu ewetara n’Ozioma di aso nke Jon dere:
Na mbu tupu e kee uwa, okwu ahu dirii. Okwu ahu na Chineke dirii. Okwu ahu bukwa Chineke. Ya na Chineke dirii site na mbu. Site na ya ka Chineke siri kee ihe niile. E wezuga ya o dighi ihe obula e kere eke nke gaara adinu. N’ime ya ka ndu di. Ndu ahu bukwa ihè nke ndi mmadu. Ihè ahu na-enwu n’ochichiri, ma ochichiri apughi imenyu ya. O di otu nwoke Chineke zitere, aha ya bu Jon.
Q biara igba ama, igbara ihè ahu akaebe, ka mmadu niile site n’ihè ahu kwere. Ya onwe ya abughi ihè ahu, kama o biara igbara ihe ahu akaebe. Ezi ihè ahu nke na-enye mmadu niile thè na-abia n’elu uwa. O norii n’uwa, site na ya ka e si kee uwa; ma uwa amataghi ya. O biakwutere ndi nke ya, ma ha anatabeghi ya. Ma ndi niile nabatara ya, kwerekwa n’aha ya, ka o nyere ike i bu umu nke Chineke; Ha bu ndi amuru, o bughi site n’obara nke o na-abu site n’echiche nke anuahu ma o bu echiche nke mmadu kama site na Chineke. Okwu ahu buuru mmadu, wee binyere anyi. O juputara n’amara na eziokwu. Anyi ahula ebube ya, ebube nke o nwere dika sooso otu Nwa nke Nna. Jon gbara akaebe maka ya si, “Onye na-esote m kariri m, n’ihina o bu m uzo diri.” Site n’uju nke ya, anyi niile nwetara amara kwuru amara. Site n’aka Mosis ka e si nye iwu, ma amara na eziokwu si na Jesu Kristi bia. O dighi onye obula hurula Chineke, o bu sooso otu nwa ahu, onye bu Chineke, onye nke ya na Nna no, mere ka a mara ya.
EKPERE NHUNYE
Nna nke udo, nara onyinye anyį, nkwudosiike na eziokwu, ma site n’iketa oke n’ihe omimi nke a, mee ka anyį na-ahurita onwe anyi n’anya, iji were na-abjakwu Gi nso. Anyi na-ario ihe ndia site na Kristi Dinwenu anyį. Amen.

EKPERE ANATACHA ORIRI NSO
Dinwenu, biko mee ka sacramenti nke a buru ike anyi, kuziere anyi idi na-egosi mmasi maka iheoma niile nke I na-emere anyi, ma nyere anyi aka įdi na-agbasi mbo ike maka ndu ebighi ebi. Anyi na-ario ihe ndia site na Kristi Dinwenų anyi. Amen.

error: Alert: Content is protected !!