Igbo Mass Readings for December 29 2021, Ubochi nke Ise Izuuka Krismas

UBOCHI NKE ISE N’IME IZUUKWU NKE CHRISTMAS

EKPERE MMEGHE
Chineke Nna ji ike niile, Onye ana-anaghi ahu anya, objbja nke ihè Gi n’ime uwa anyj emeela ka ochichiri gbasasia. Kuziere anyi idi na-ekwuputa omumu nke Nwa Gi Jesu Kristi Onye Gi na Ya di ndu, na-achieze n’idiko n’otu nke Mmuo Nso, otu Chukwu site n’uwatuwa niile. Amen.

Ihe Ogugu nke mbu: 2:3-11
Ihe ogugu ewetara n’Akwukwo ozi Jon nke mbu
N’uzo di otu a, o ga-edo anyi anya na anyi maara ya, ma o buru na anyi edobe iwu ya niile. Onye na-asi, “Amaara m ya” ma na-enupuru iwu ya isi, bu onye ugha. Eziokwu ahu adighi n’ime ya. Onye obula nke na-edobe okwu ya, n’ezie, įhunaanya maka Chineke zuru oke n’ime ya.
Onye na-ekwu na ya bi n’ime Kristi kwesiri ibi ndu dika ya. Ndi m huru n’anya, o bughi iwu ohuru ka m na-edere unu, kama o bu iwu ochie nke e nyere unu site na mbu. Iwu ochie a bu okwu ahu nke unu nurula. Ma otu o di, ana m edere unu iwu ohuru, nke bu eziokwu n’ime ya na n’ime unu. N’ihi na ochichiri na-agafe, ezi ihè ebidola jchawaputa. Onye na-asi na ya no n’ihe ahu ma na-akpo nwanne ya asi, ka nokwa n’ochichiri. Onye na-ahu nwanne ya n’any na anogide n’ihè. O dighikwa ihe iso ngongo di n’ime ya; Onye obula na-akpo nwanne ya asi, bi n’ime ochichichiri, na-agagharikwa n’ime ochichiri. O maghikwa ebe o na-aga, n’ihi na ochichiri mere ka o kpuo isi.

ABUOMA NA AZIZA: Ps: 96:1-2, 2-3, 5-6.

Aziza: Ka Eluigwe na uwa kwebe ukwe anuri.

  1. Kweerenu Onyenweanyi ukwe ohuru;
    uwa niile kweere Onyenweanyi ukwe.
    Kweerenu Onyenweanyu ukwe, toonu aha ya. Az./
  2. Kwuputa nzoputa ya ubochi niile.
    Mee ka uwa niile mara maka otito ya,
    Kwuputakwa oru itunaanya ya n’ebe ndi mmadu no. Az
  3. Onyenweanyi kere eluigwe.
    Otito na ebube gbara ya gburugburu,
    Ike na mma juputara ulo nso ya. Az!

ALLELUIA ALLELUIA: Jn: 1: 14, 12.

Okwu ahu buuru mmadu, wee binyere anyi. Ma ndi niile nabatara ya, kwerekwa n’aba ya, ka o nyere ike ibu umu nke Chineke. ALLELUIA.

ΟΖΙΟΜΑ: 2:22-35.

Ihe ogugu nke a si n’Ozioma di aso nke Luk dere:

Mgbe oge biara maka emume nke idiocha dika iwu Mosis siri di, Josef na Maria kutere Jesu na Jerusalem n’ihu nke Dinwenu. Dika e dere n’iwu nke Yahweh si. “Nwa mbu obula nke bu oke ga abu ihe di nso n’ihu Yahweh. Ha biara ichu aja dika e nyere n’iwu nke Dinwenu, Nduru abuo ma o bu umu kparakwukwu abuo.

N’oge a, e nwere otu nwoke bi na Jerusalem, aha ya bu Simion, o bu onye eziomume burukwa onye na-atu egwu Chineke. O no na-elekwa anya maka nkasiobi nke Izrel, Mmuo Nso no nyekwaara ya. Mmuo Nso emeelarii ka o mata na o gaghi ahu onwu tupu o hu Kristi nke Onyenweanyi. Site n’odudu nke Mmuo Nso, nwoke a batara n’Ulonso. Ma mgbe nne na nna Jesu kubatara ya n’ulonso ka e meere ya dika omenaala nke iwu si di. Simion kuuru ya n’aka ya abuo, kelee Chineke si: “Ugbu a, Onyenwe m, ka nwodibo gi laa n’udo, dika nkwa gi siri di. N’ihi na anya m ahula nzoputa gi, nke i kwadobere n’ihu mmadu niile. O bu ihè nke ga ekpughe uzo nye ndi mba ozo, na, otito nke ndi gi bu Izrel.” The niile Simion kwuru gbasara nwatakiri ahu bu Jesu turu nne na nna ya n’anya. Simion wee gozie ha, gwa Maria nne Jesu si:”Lee e dobere nwatakiri a maka odida na mbili otutu mmadu n’Izrel, na maka ihe omumaatu a ga ekwuto-ekwuto, (ma mmaagha ga-amawa gi obi) ka e were kpughee ihe di otutu mmadu n’obi.”

EKPERE NHUNYE
Dinwenu, nara onyinye anyi n’emume igba-onwo nke a di įtunaanya; anyį na-ebutere Gi onyinye ndi site n’ihe niile I nyere anyį ma n’ikwughachi ugwo, I na-enye anyi onwe Gį. Site na Dinwenu anyi Jesu Kristi …

EKPERE ANATACHA ORIRI NSQ
Nna Onye jhunaanya na ebere, biko mee ka ndu anyi buru ihe atoro ntoala ya mgbe niile n’elu ike si n’ihe omimi nso ndi a. Anyi na-ario ihe ndia site na Kristi Dinwenu anyį. Amen.

error: Alert: Content is protected !!