Igbo Mass Readings for December 30 2021, Ubochi nor Isii Izuuka Krismas

UBOCHI NKE ISII N’IME IZUUKWU NKE CHRISTIMAS

EKPERE MMEGHE
Chineke ji ike niile, mee ka omumu nke Nwa Gi n’udi mmadu zoputa anyi n’onodu ochie anyi, įbu ohu nke njo, ma duruokwa anyi na ndu ohuru. Site na Dinwenu anyj Jesu Kristi …

Ihe Ogugu nke mbu: 2:12-17
Ihe ogugu ewetara n’Akwukwo ozi Jon nke mbu
Umuntakiri, ana m edere unu akwukwoozi a, n’ihina a gbagharala unu njo unu maka ihi Kristi. Ndi nna, ana m edere unu akwukwoozi a, n’ihina unu maara onye ahu nke dirii site na mbido. Umuokorobia, ana m edere unu nke a, maka na unu emeriela ajo onye ahu. Umuntakiri ana m edekwara unu, n’ihi na unu maara Nna. Ndi nna, ana m edere unu akwukwoozi a, n’ihi na unu maara onye nke dirii site na mbido.
Umuokorobia, ana m edekwara unu, maka na unu di ike. Okwu Chineke na-anogide n’ime unu. unu emerikwaala ajo onye ahu. Unu ahula uwa n’anya ma o bu ihe di ya n’ime. O buru na onye obula ahu uwa n’anya ihunaanya nke Nna anoghi n’ime ya. N’ihina ihe niile di n’uwa dika ochicho nke anu ahu, nke anya na mpako nke ndu, esighi n’aka Nna bia, kama ha bu nke uwa. Uwa na ochicho ojoo ya niile na-agafe-agafe, ma onye ahu na-eme uche Chukwu ga-anogide ebighiebi.

ABUOMA NA AZIZA: Ps:96: 7-8, 8-9, 10.

Aziza: Ka eluigwe na uwa kwebe ukwe añuri.

  1. Toonu Onyenweanyi, ezinuulo niile di n’uwa,
    toonu ebube ya na ike ya.
    Nye Onyenweanyi otito kwesiri aha ya. Az./
  2. Wetaranu ya onyinye n’ulo nso ya,
    Sekpuoronu Onyenweanyi n’ebe ya di nso,
    uwa niile maanu jijiji n’ihu ya. Az./
  3. Kwusachaanu n’uwa niile na Onyenweanyibu eze,
    o kwuwasiri uwa ike, e nweghi ike ibughari ya.
    O ga-eji ikpe nkwumoto kpee mba niile ikpe. Az./

ALLELUIA ALLELUIA: Heb: 1:1-2.

N’oge ochie Chineke sitere n’uzo di iche-iche gwa nna anyi ha okwu site n’onu ndi amuma; n’ogwugwu oge ndi a, o gwala anyi okwu site na nwa ya. ALLELUIA.

OZIOMA: 2:36-40
Ihe ogugu ewetara n’Ozioma di aso nke Luk dere:

O nwere otu onye amuma nwaanyi aha ya bu Ana, nwa Fanuel, onye si n’agburu Asha. O meela ezi agadi, onye ya na di ya biri naani afo asaa site n’agbogho ya tupu di ya anwuo. O noro onodu nwaanyi isimkpe ruo iri afo asato na ano. O pughi n’ulo nso Chineke, ebe o ji ibu onu na ekpere na-efe Chineke, abali na ehihie. O putara n’oge ahu, kelee Chineke, kwuputakwa maka onye ahu n’ihu ndi niile na-atu anya maka nzoputa nke Jerualem. Mgbe ha mezuru ihe niile dika iwu nke Dinwenu si di, ha laghachiri na Galili, ruo obodo nke ha bu Nazret. Nwata ahu toro, siekwa ike, juputa n’amamihe, grasia nke Chineke nonyekwaara ya.

EKPERE NHUNYE
Nna n’obi ebere Gi nara onyinye anyį. Site n’iketa oke na Eucharistia nke a mee ka anyį na ebiputa na ndu anyi Ihunaanya nke anyį na ekwuputa n’emume nke a. Mezuoro anyį ihe ndi a site na Kristi Dinwenu anyį. Amen.

EKPERE ANATACHA ORIRI NSO
Chineke Nna anyi, site na Eucharistia nke a I na ebitu ndu anyį aka. Mee ka jhunaanya Gį na-adi ndu n’ime obi anyi ka anyi were tozuo oke n’ihu Gi. Anyi na-ario ihe ndia site na Kristi Dinwenų anyi. Amen.

error: Alert: Content is protected !!