Igbo Mass Readings October 6 2020 Tuezde Izu Iri Abụọ na Asaa Oge Nkit

Igbo Mass Readings October 6 2020 Tuezde Izu Nke Iri Abụọ na Asaa n’oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings October 6 2020 Tuezde Izu Nke Iri Abụọ na Asaa n'oge Adanyeghị n'Emume.
Igbo Mass Readings October 6 2020 Tuezde Izu Nke Iri Abụọ na Asaa n’oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ              1:13-24

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl degaara ndị Galeshịa

Ụnụ anụla maka ndụ ochie m n’usoro okpukpe ndị Juu na otu m si sogbuo Nzukọ Chineke, ma gbakwaa mbọ imebi ya.

Agara m n’ihu n’usoro okpukpe ndị Juu karịa ọtụtụ ndị ọgbọ m n’etiti ndị nke m, omenaala nna anyị ha nụkwara m ọkụ n’obi karịa.

Ma mgbe ọ masịrị onye ahụ họpụtara m iche tupu a mụọ m, ọ kpọkwara m site n’amara ya.

Ọ masịrị ya ikpughere m Nwa ya, ka m wee kwusaa maka ya n’etiti ndị mba ọzọ. O nweghị onye ọbụla m jekwuuru maka ndụmọdụ, nke m na-aga Jerusalem ịgakwuru ndị buru m ụzọ bụrụ ụmụazụ kama agara m Arabịa, e mechaa m laghachi Damaskọs.

Ka afọ atọ gachara agara m Jerusalem ịhụ Pịta (nke pụtara Sefas ma a sụgharịa ya) ịjụta ya ihe ụfọdụ.

Anọnyekwaara m ya ụbọchị iri na ise. Ọ dịghị onyeọzọ n’ime ndị ụmụazụ m hụrụ ma ọ bụghị naanị Jemis nwanne Dinwenụ.

(Ihe m na-edere ụnụ bụ eziokwu n’ihu Chineke anaghị m atụ asị) Ka nke a gachara, agara m n’ọtụtụ akụkụ Siria na Silisia.

N’oge ahụ nzukọ Kristi niile dị na Judịa amatabeghị onye m bụ. Naanị ihe ha nụrụ a na-ekwu bụ, “Onye ahụ kapgburu anyị na mbụ na-ekwusazi ugbu a okwukwe ahụ ọ chọrọ imebi na mbụ.” Ha wee too Chineke n’ihi m.

ABỤỌMA NA AZỊZA: Ps. 139:1-3, 13-14, 14-15.

Azịza:  Onyenweanyị dube m n’ụzọ nke ndụ ebighịebi.

  1. Onyenweanyị ị nyochaala m marakwa m!

Ị ma mgbe m nọdụrụ ala ma mgbe m kwụ ọtọ

Ị na-anọ ebe dị anya mara ihe m bu n’uche

Ị mazuru omume m niile mgbe m

Na-arụ ọrụ mọbụ mgbe m na-ezu ike. Azịza.

2. Ọ bụ gị kere mmụọ m

Ọ bụkwa gị kpụrụ m n’afọ nne m

Ana m ekele gị maka ihe omimi ndị a

maka ihe ịtụnanya dị n’okike I kere m

nakwa ihe ebube dị n’aka ọrụ gị niile. Aziza.

3. Ị maara m nke ọma!

Ị maara otu ọkpụkpụ niile siri dị

oge a na-akpụ m na nzuzo

oge a na-ejikọta m ọnụ n’afọ nne m. Azịza.

Mbeku  Ps. 119: 105

Alleluịa, Alleluịa:

Okwu gị bụ mpanaka na-edu m, bụrụkwa ihe n’ụzọ m.

Alleluịa.

Oziọma maka October 6, 2020 – Luk 10:38-42

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Jesu banyere n’otu ọnụmara, ebe otu nwaanyị a na-akpọ Mata nabatara ya n’ụlọ ya. Mata nwere nwanne nwaanyị a na-akpọ Meri onye nọdụrụ ala n’ụkwụ Onyenweanyị na-anụrụ nkụzi ya.

Ma uche Mata gbasachara agbasa ebe ọ na-agba mbọ maka ile ọbịa. Mata bịakwutere Jesu sị, “Onyenweanyị, ọ bụ na o metụghị gi n’obi na nwanne m nwaanyị hapụụrụ naanị m ije ozi niile?

Gwanụ ya ka ọ bịa nyere m aka.” Ma Onyenweanyị zara ya sị, Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị, na-esogbukwa onwe gị n’ihi ọtụtụ ihe; ma otu ihe bụ ihe dị mkpa. Meri ahọrọla oke ka mma nke a na-agaghị anapụya.”

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings October 5 2020 Mọnde Izu Nke Iri Abụọ na Asaa n’oge Adanyeghị n’Emume

IHE ỌGỤGỤ ECHI: Igbo Mass Readings October 7 2020, Nne Anyị Dị Asọ, Ezenwanyị Nke Rosarị.

Igbo Mass Readings October 6 2020 Tuezde Izu Nke Iri Abụọ na Asaa n’oge Adanyeghị n’Emume.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings

Catholic Lector
Catholic Lector is the founder of Catholic Lectionary. He is a passionate Writer, a Web Developer, a Computer expert and a part-time Blogger who loves to write a lot of contents on Catholicism in his free time. He is also the co-founder of the price review website: https://jumiaprice.com; where he shares a lot of product price contents.
error: Alert: Content is protected !!

Receive Daily Mass Readings and Reflections via Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.