Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) | Nkwụsị Nke Iri na Abụọ

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Iri na Abụọ.

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Iri na Abụọ.

NKWỤSỊ NKE IRI NA ABỤỌ

Jesu Anwụọ n’elu obe

Uzo Nke Obe - Igbo Stations of the Cross - Nkwusi nke iri na abuo
Nkwụsị Nke Iri na Abụọ

Onye-ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele

Gbuọnụ Otu ikpere n’ala za.

Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa

Kulitenụ

Jesu nọ n’ụdị Chukwu, mana o jighị aka abụọ ghado ụdị Chukwu ya; kama ọ bịara hụchaa onwe ya were ụdị nwaodibo, a mụọ ya ka mmadụ. Mgbe a hụrụ ya n’ụdị mmadụ. O budara onwe ya ala huwe isi ruo n’ọnwụ, bụrụgodu ọnwụ n’elu obe. Ya mere Chukwu bulie ya elu, nye ya aha ka aha niile, nke na-akpọọ aha Jesu, onye ọ bụla nọ n’eligwe ma ọ bụ uwa ma ọ bụ n’okpuru ụwa ga-egbu ikpere n’ala kwupụta na Jesu bụ Dinwenụ. (Filipaị 2:6-11)

Sekpurunụ Ala

Onye ga-ekewapụ anyị n’ịhụnanya Kristi? Ọ bụ mkpagbu ka ọ bụ ahụhụ, ka ọ bụ mmegbu, ka ọ bụ oke agụụ, ka ọ bụ ịgba ọtọ ka ọ bụ ize ndọ ka ọ bụ mmagha? Oolo! N’ihe niile ndị a, anyị karịrị dikeọgụ n’ime onye ahụ hụrụ anyị n’anya.

Electric Incense Burner

Electric Incense Burner with Arabian Fragrance

Now Available in Nigeria!

Onyenwe m, nyenụ m amara gị ka m were ike m niile na-arụ ọrụ ọma gị mgbe niile n’atụghị egwu ọ bụla.

Ọha:    Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile;

              E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.

              Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;

              Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;

              Bịa were m mee ihe ọbụla masịrị Gị.

Nna anyị nọ n’eluigwe… Ekele Marịa … Otito dịrị Nna…

Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.

Ọha: Mere anyị ebere

Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;

Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen.

Kulitenụ: kwere ukwe a gaa na nkwụsị nke iri na ato.

Ukwe: Ọ gịnị gbapụtara ụnụ?

            ọ bụghị ọla ọcha na ọla edo

            Ma ọ bụ ọbara Kristi (1 Pịta 1:17-19).

Subscribe to Receive Igbo Daily Mass Readings via Email

Follow us on Social Media:

Nkwụsị nke Iri na Otu: A Kpodo Jesu n’obe

Nkwụsị nke Iri na Atọ: E butuo Ahu Jesu n’obe

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Iri na Abụọ.

error: Alert: Content is protected !!